1 Reyes 19
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Ịlaịja agbaga nʼugwu Horeb
1Ehab kọọrọ Jezebel ihe niile Ịlaịja mere, na otu o si jiri mma agha gbuo ndị amụma Baal niile. 2Nʼihi nke a, Jezebel zigara onyeozi ka ọ ga zie Ịlaịja sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso, nʼagbanyeghị otu mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na oge dịka oge a echi, egbughị gị dịka i si gbuo ndị amụma Baal.”
3Ịlaịja tụrụ egwu, gbapụ ọsọ, nʼihi ichebe ndụ ya. Mgbe ọ bịaruru Bịasheba, dị na Juda, ọ hapụrụ nwokorobịa na-ejere ya ozi nʼebe ahụ. 4Ma ya onwe ya pụkwara jee ije otu ụbọchị nʼọzara naanị ya. Nʼikpeazụ, ọ kwụsịrị nọdụ ala nʼokpuru otu osisi brum, kpee ekpere rịọọ ka a napụ ya ndụ ya. Ekpere o kpere nʼoge a bụ, “O zuorela m Onyenwe anyị, biko napụ ndụ m. O nweghị ụzọ m si dị mma karịa nna nna m ha.” 5O dinara nʼokpuru osisi brum rahụ ụra.
Ma lee, otu oge ahụ, mmụọ ozi metụrụ ya aka, sị ya, “Bilie, rie nri.” 6Ịlaịja biliri legharịa anya, hụ ogbe achịcha na ite mmiri nta nke dị nʼakụkụ ebe ọ tụkwasịrị isi ya. O riri ogbe achịcha ahụ a hụrụ nʼicheku ọkụ, ṅụọkwa mmiri ahụ. Emesịa, o dinakwara ọzọ.
7Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị bịaghachikwara nke ugboro abụọ, sị ya, “Bilie rie ihe, nʼihi na ije dị gị nʼihu dị ukwuu.” 8Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb nke bụ ugwu Chineke. 9Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼotu ọgba nkume rahụ ụra abalị nʼime ya.
Onyenwe anyị apụta ìhè nye Ịlaịja
Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”
10Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a, ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.”
11Onyenwe anyị sịrị ya, “Pụọ gaa guzo nʼelu ugwu, nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị na-aga isite nʼebe ahụ gafee.”
Mgbe ahụ, oke ifufe dị ike gbawara ugwu ahụ, tipịasịa nkume ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ifufe ahụ. Mgbe ifufe ahụ gasịrị, e nwere oke ala ọma jijiji nʼugwu ahụ, ma Onyenwe anyị anọkwaghị nʼala ọma jijiji ahụ. 12Mgbe ala ọma jijiji ahụ gasịrị, ọkụ nwuuru, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ọkụ ahụ. Ma mgbe ọkụ ahụ gasịrị, nwa olu nta dị nwayọọ dara. 13Mgbe Ịlaịja nụrụ ya, o ji uwe mwụda ya kpuchie ihu ya, pụọ gaa guzo nʼọnụ ụzọ ọgba nkume ahụ.
Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu jụrụ ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?”
14Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.”
15Onyenwe anyị sịrị ya, “Sikwa ụzọ i si bịa laghachi, gaa nʼọzara Damaskọs. Mgbe i ruru ebe ahụ, tee Hazael mmanụ ịbụ eze Aram. 16Teekwa Jehu, nwa Nimshi mmanụ ịbụ eze Izrel. Ị ga-etekwa Ịlaisha nwa Shafat, onye Ebel-Mehola mmanụ ịbụ onye amụma nʼọnọdụ gị. 17Onye ọbụla gbanarịrị Hazael ga-anwụ nʼaka Jehu. Otu a kwa, ndị niile gbanarịrị mma agha Jehu ka Ịlaisha ga-egbu. 18Ma ghọta na ọ dị puku mmadụ asaa nọ nʼIzrel, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal, maọbụ sutu ya ọnụ, ife ya ofufe.”
Ọkpụkpọ Ịlaisha
19Ịlaịja sitere nʼebe ahụ pụọ gaa chọta Ịlaisha nwa Shafat ebe ọ nọ na-akọ ala ubi. Iri ehi abụọ na anọ e jikọtara abụọ abụọ dị ya nʼihu, ma ya onwe ya ji ehi abụọ e jikọtara ọnụ, nke iri na abụọ ya na-akọ ala ubi. Ịlaịja jekwuru Ịlaisha wụkwasị ya uwe mwụda ya nʼubu ya. 20Mgbe ahụ, Ịlaisha hapụrụ ehi ndị ahụ ebe ha guzoro nʼubi ahụ gbara ọsọ gbakwuru Ịlaịja sị ya, “Biko, kwere ka m gaa sutu nna m na nne m ọnụ, sị ha nọdụ nke ọma. Emesịa, aga m esokwa gị.”
Ịlaịja zara sị ya, “Laghachi azụ, ọ bụ gịnị ka m mere gị?”
21Ịlaisha laghachiri azụ, gbuo ehi abụọ ahụ e jikọtara nʼotu, kpọọ ihe ahụ e ji arụ ọrụ nʼubi ọkụ, were ha sie anụ ahụ nye ndị mmadụ, ha rie. Mgbe ahụ, o biliri ije pụọ ga soro Ịlaịja, bụrụ nwaodibo ya.

¿Sabías que…?
Elías en el monte Horeb y el llamamiento de Eliseo
- El monte Horeb, identificado también en la tradición bíblica con el monte Sinaí, fue la cordillera donde Israel recibió el pacto y la ley. El viaje de cuarenta días de Elías hacia el sur hasta Horeb sitúa su encuentro con Dios en el mismo escenario de las revelaciones concedidas a Moisés.Fuentes: el propio texto bíblico · Horeb
- Al ordenar a Elías que unja a Hazael como rey de Siria y a Jehú como rey de Israel, la narración vincula la autoridad profética con la sucesión geopolítica de ambas naciones, asegurando a Elías que aún quedaban siete mil israelitas fieles.Fuentes: el propio texto bíblico · Hazael · Jehu
- Echar el manto sobre los hombros de Eliseo mientras este araba con doce yuntas de bueyes en Abel-mehola fue un acto simbólico que lo designó como discípulo, heredero adoptivo y sucesor profético de Elías.Fuentes: el propio texto bíblico · Elisha · Abel-meholah
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Mount Horeb · Hoy: Jebel Musa · 28.540, 33.973 · versículo 8
- Damascus · 33.511, 36.306 · versículo 15
- Syria · Hoy: Aram · 33.511, 36.306 · versículo 15
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org