Nations Bible

1 Reyes 17

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Ịlaịja ekwuo maka oke ụnwụ nke ga-ada

1Ugbu a, Ịlaịja onye Tishbe, onye si obodo Tishbe, nke dị nʼala Gilead, sịrị Ehab, “Eji m aha Onyenwe anyị Chineke Izrel dị ndụ, onye m na-efe na onye m na-ejere ozi na-agwa gị na igirigi agaghị ada, mmiri agaghị ezo ọzọ nʼafọ ndị a na-abịa karịa ma ọ bụghị naanị site nʼokwu ọnụ m!”

Ugolọma ebutere Ịlaịja nri

2Okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja ntị, sị ya, 3“Si nʼebe a pụọ. Soro ụzọ ọwụwa anyanwụ, gaa zoo onwe gị nʼakụkụ iyi Kerit, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ya, nke bụ nʼihu Jọdan. 4Nọdụ nʼebe ahụ ṅụọ mmiri si nʼiyi ahụ, riekwa nri ọbụla ụmụ ugolọma ga-ebutere gị, nʼihi na enyela m ha iwu ka ha nye gị nri.”

5O mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọ gara nʼakụkụ iyi nta Kerit nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan nọrọ nʼebe ahụ. 6Ugolọma na-ebutere ya achịcha na anụ, ụtụtụ na anyasị niile. Ọ na-aṅụkwa mmiri site nʼiyi ahụ.

Ịlaịja na Nwanyị Zarefat

7Ma mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, mmiri ahụ tara, nʼihi na mmiri adịghị ezokwa nʼala ahụ. 8Okwu Onyenwe anyị bịakwutere ya, 9“Bilie, jee Zarefat, obodo dị Saịdọn nso, biri nʼebe ahụ. O nwere otu nwanyị di ya nwụrụ, onye m nyere iwu ka o nye gị nri.” 10Ịlaịja biliri jee Zarefat. Mgbe o ruru ọnụ ụzọ ama e si abanye obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ nọ na-achịkọta nkụ. Ịlaịja kpọrọ ya oku sị ya, “Biko, kutere m ntakịrị mmiri nʼiko ka m ṅụọ.” 11Mgbe nwanyị ahụ na-aga ikute mmiri ahụ, Ịlaịja kpọrọ ya oku ọzọ sị ya, “Biko, wetara m otu iberibe achịcha ka m taa.”

12Ma nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke na-adị ndụ, enweghị m achịcha ọbụla nʼụlọ m. Naanị ihe m nwere bụ otu njuaka ụtụ ọka dị nʼite, na mmanụ ntakịrị dị na karama. Ugbu a, ana m achịkọta nkụ ka m baa ga siere onwe m siekwara nwa m nri, ka anyị rie, chere ọnwụ ga-abịa egburu anyị.”

13Ịlaịja sịrị ya, “Atụla egwu! Gaa mee dịka i kwuru. Ma naanị buru ụzọ meere m ogbe achịcha ntakịrị site nʼihe i nwere, wetara m ya. Emesịa, mee nke gị na nwa gị ga-eri. 14Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Ụtụ ọka dị nʼite ahụ agaghị agwụ, mmanụ ahụ dị nʼite ahụ agakwaghị akọ tutu ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị ga-ezite mmiri ozuzo nʼala a.’ ”

15Nwanyị ahụ mere dịka Ịlaịja kwuru. Sitekwa nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ihe oriri akọkwaghị Ịlaịja na nwanyị ahụ, na ezinaụlọ ya. 16Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma.

17Mgbe ihe ndị a gasịrị, nwa nwanyị ahụ nwe ụlọ rịara ọrịa. Ọrịa a bịara sie ike nke ukwuu na ume afọdụghị nʼime ya. 18Mgbe ahụ, nwanyị ahụ kwaara akwa bịakwute Ịlaịja sị ya, “Ewoo, onye nke Chineke, gịnị ka i nwere megide m? Ị bịara ka i chetara m mmehie m, na igbu nwa m nwoke?”

19Ịlaịja zara sị ya, “Kunye m nwa gị nwoke.” Ịlaịja kuuru ya site nʼaka nne ya rigoo nʼụlọ elu ebe ya onwe ya na-edina, nibe ya nʼelu ihe ndina ya. 20Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “ Onyenwe anyị Chineke m, gịnị mere i ji wetara nwanyị a m bi nʼụlọ ya ihe mgbu site nʼikwe ka nwa nwoke ya nwụọ?” 21Ịlaịja gbatịrị onwe ya nʼahụ nwantakịrị ahụ ugboro atọ, kpọkuo Onyenwe anyị, sị, “Biko, Onyenwe anyị Chineke m, kwere ka mkpụrụobi nwantakịrị a laghachikwute ya.”

22Onyenwe anyị nụrụ ekpere Ịlaịja, ndụ nwantakịrị ahụ laghachikwutere ya, ọ dịkwara ndụ ọzọ. 23Mgbe ahụ, Ịlaịja kuuru ya si nʼụlọ elu ahụ rịdata, kunye ya nne ya, gwa ya okwu sị, “Lee, nwa gị dị ndụ!”

24Nwanyị ahụ sịrị Ịlaịja, “Ugbu a, amatala m na ị bụ onye nke chineke, na okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ gị apụta bụ eziokwu.”

¿Sabías que…?

Elías y la sequía

  • El nombre Querit hace referencia a un desfiladero o lecho de torrente invernal. Este barranco, situado al este del río Jordán, sirvió de refugio apartado para Elías tras comunicar su anuncio de sequía al rey Acab.Fuentes: el propio texto bíblico · Cherith · Elijah
  • Sarepta, cuyo nombre se asocia a un taller de fundición o refinación de metales, era una localidad fenicia ubicada entre Tiro y Sidón. Allí, fuera del territorio de Israel, Elías fue sustentado por una viuda pobre durante la gran hambruna.Fuentes: el propio texto bíblico · Zarephath · Sidon
  • Elías es presentado como el tisbita, de los moradores de Galaad, una región montañosa al este del río Jordán. Esta designación puede indicar que procedía de un pueblo llamado Tisbe, o bien traducirse como un forastero o residente establecido allí.Fuentes: el propio texto bíblico · Tishbe · Gilead

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Gilead · Hoy: Gilead 1 · 32.187, 35.692 · versículo 1
  • Jordan · Hoy: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículos 3, 5
  • Sidon · Hoy: Sandikli archaeological site in Sidon · 33.561, 35.372 · versículo 9
  • Zarephath · Hoy: Sarepta · 33.464, 35.295 · versículos 9, 10

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.