1 Crónicas 7
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Ụmụ ụmụ Isaka
1Isaka mụrụ ụmụ anọ:
Tola, na Pua, na Jashub, na Shịmrọn.
2Ụmụ Tola ndị ghọrọ ndịisi ezi bụ ndị a:
Uzi, na Refaya, na Jeriel, na Jamai, na Ibsam, na Samuel. Nʼoge Devid bụ eze, ọnụọgụgụ ndị agha sitere nʼetiti ha dị iri puku abụọ na abụọ, na narị isii. (22,600).
3Uzi mụrụ
Izrahaya.
Izrahaya amụta ndị a:
Maikel, Ọbadaya, Juel na Ishaya. Ha niile bụkwa ndịisi ikwu ha. 4Ndị bụ ndị agha nʼetiti ụmụ ụmụ ha nʼoge Devid bụ eze ruru iri puku atọ na isii (36,000), nʼihi na ha niile lụrụ ọtụtụ ndị inyom, mụọ ọtụtụ ụmụ. 5Ụmụnne ha bụ ndị na-alụ agha bụ ndị agbụrụ Isaka dị iri puku asatọ na asaa (87,000) nʼọnụọgụgụ, dịka e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
Ụmụ ụmụ Benjamin
6Benjamin mụrụ ndị ikom atọ:
Bela, Beka na Jediael,
7Bela mụrụ ụmụ ise:
Ezbon, Uzi, Uziel, Jerimot na Iri. Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị agha ha dị iri puku abụọ na abụọ na iri atọ na anọ (22,034). E dekwara aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
8Ụmụ ndị ikom Beka mụrụ bụ
Zemira, Joash, Elieza, Elioenai, Omri, Jeremot, Abija, Anatot na Alemet. 9Akwụkwọ ebe e dere usoro ọmụmụ ha depụtara aha ndịisi ezinaụlọ, na iri puku ndị agha abụọ na narị abụọ (20,200).
10Jediael mụrụ otu nwa nwoke:
aha ya bụ Bilhan.
Ụmụ Bilhan bụ
Jeush, Benjamin, Ehud, Kenaana, Zetan, Tashish na Ahishaha. 11Ụmụ ndị ikom Jediael ndị a bụ ndịisi ezinaụlọ. E nwere nʼetiti ha ndị agha ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asaa na narị abụọ (17,200), ndị nọ na njikere ibu agha.
12Ndị Shupim na ndị Hupim bụ ụmụ ụmụ Er ebe ndị Hushim bụ ụmụ ụmụ Aha.
Ụmụ ụmụ Naftalị
13Ụmụ Naftalị mụtara bụ
Jaziel, Guni, Jeza na Shalum bụ ụmụ Bilha.
Ụmụ ụmụ Manase
14Ụmụ Manase:
Asriel, onye iko ya nwanyị bụ onye Aram mụtara, na Makia. Makia bụ nna Gilead. 15Makia sitere nʼetiti ndị Hupim na Shupim lụọ nwunye. Aha nwanne ya nwanyị bụ Maaka. Otu onye ọzọ si nʼagbụrụ Manase bụ Zelofehad, onye mụtara naanị ụmụ ndị inyom. 16Maaka nwunye Makia mụtara otu nwa nwoke ọ gụrụ Peresh. Aha nwanne ya bụ Sheresh, onye mụtara Ụlam na Rakem.
17Nwa nwoke Ụlam mụtara
bụ Bedan.
Ndị a bụ ụmụ Gilead, nwa nwa Makia, nwa Manase.
18Hamoleket, nwanne nwanyị Makia mụrụ Ishod, Abieza na Mahla.
19Shemida mụrụ ụmụ ikom ndị a:
Ahian, Shekem, Liiki na Aniam.
Ụmụ ụmụ Ifrem
20Ụmụ Ifrem bụ
Shutela, Bered,
Tahat, Eleada,
Tahat 21na Zabad nwa ya,
na Shutela nwa ya.
Eza na Elead bụ ndị gara ịchịkọrọ anụ ụlọ ndị Gat, ndị ikom nwe obodo ahụ jidere ha gbuo ha nʼebe ahụ. 22Ifrem nna ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ọnwụ ha, ma ụmụnna ya kasịrị ya obi. 23Mgbe nwunye ya mụrụ nwa nwoke ọzọ, ọ kpọrọ aha ya Beriya, nke pụtara, Ihe ndaba ọjọọ, nʼihi ọnwụ Elead na Eza. 24Aha nwa Ifrem nke nwanyị bụ Sheera. Sheera bụ onye wuru akụkụ ugwu na ndịda Bet-Horon, wuokwa Uzen-Sheera.
25Ndị a bụkwa ụmụ Ifrem: Refa, nna Reshef,
onye bụ nna Tela. Tela bụ nna Tahan,
26onye bụ nna Ladan, Ladan bụ nna Amihud,
onye bụ nna Elishama. 27Elishama bụ nna Nun,
onye bụ nna Joshua. 28Betel na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ya bụ Naaran, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na Gaza na obodo nta ya, ndị dị nʼọdịda anyanwụ, na Shekem, na obodo ndị ọzọ, tutu ruo Aya, na obodo nta ya niile, so nʼala ha. 29Ụmụ Manase, nwa Josef, nwa nwa Izrel, bikwa nʼobodo ndị a dị nʼoke ala ha: Bet-Shan, na Teanak, na Megido, na Doa, tinyere obodo nta ha niile.
Ụmụ ụmụ Asha
30Asha mụrụ ndị a:
Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwa ya nwanyị bụ Sera.
31Beriya amụta ndị a:
Heba na Malkiel, onye bụ nna Biazait.
32Heba bụ onye mụrụ Jaflet, Shoma na Hotam. Nwanne ha nwanyị bụ Shua.
33Ụmụ Jaflet mụrụ bụ
Pasak, Bimhal na Ashvat.
34Shoma amụọ
Ahi, Roga, Huba na Aram.
35Nwanne ya nwoke Helem mụrụ
Zofa, Imana, Shelesh na Amal.
36Zofa amụta ndị a:
Sua, Hanefa, Shual, Beri, Imra, 37Beza, Hod, Shama, Shilsha, Itran na Beera.
38Jeta mụtara
Jefune, Pispa na Ara.
39Ụla amụta
Ara, Haniel na Rizia. 40Ụmụ ụmụ Asha ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị a sara anya na mmiri họpụta, ndị bụ dimkpa nʼagha, ndị ndu a ma ama. Ọnụọgụgụ ndị ha tozuru ije agha dị puku iri abụọ na isii (26,000), ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.

¿Sabías que…?
Genealogías de las tribus del norte
- La genealogía de Efraín destaca a una mujer llamada Seera, a quien se atribuye la edificación de Bet-horón la de arriba y la de abajo, así como de Uzén-seera. Estos asentamientos estratégicos se ubicaban a lo largo del paso montañoso que descendía hacia la llanura costera.Fuentes: Beth-horon · Uzzen-sheerah · el propio texto bíblico
- Una breve narración relata que los hijos de Efraín, Ézer y Elead, fueron asesinados por los habitantes de Gat durante un intento de apoderarse de ganado. Efraín guardó luto por muchos días antes de que sus parientes fueran a consolarlo, y a su siguiente hijo le puso por nombre Bería a causa de la tragedia.Fuentes: Gath · el propio texto bíblico
- El capítulo rastrea la línea de descendencia de Efraín hasta Josué, hijo de Nun, ubicando al destacado líder de la conquista dentro de su ascendencia tribal junto a figuras como Elisama y Amiud.Fuentes: el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Lower Beth-horon · Hoy: Beit Ur al Tahta · 31.895, 35.084 · versículo 24
- Upper Beth-horon · Hoy: Beit Ur al Fauqa · 31.886, 35.114 · versículo 24
- Gezer · Hoy: Tel Gezer · 31.859, 34.919 · versículo 28
- Shechem · Hoy: Tell Balatah · 32.214, 35.282 · versículo 28
- Megiddo · Hoy: Tel Megiddo · 32.585, 35.184 · versículo 29
- Taanach · Hoy: Tell Ta’anakh · 32.522, 35.219 · versículo 29
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org