1 Crónicas 17
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Nkwa Onyenwe anyị kwere Devid
1Mgbe Devid nọsara ahụ nʼụlọeze ya, ọ sịrị Netan onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị dị nʼokpuru ụlọ ikwu.”
2Netan zaghachiri Devid, “Ihe ọbụla dị gị nʼobi, mee ya, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.”
3Ma nʼabalị ahụ, okwu Chineke rutere Netan ntị, na-asị,
4“Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: Gị onwe gị agaghị ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi, 5nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta Izrel ruo taa. Kama e sitela m nʼotu ọmụma ụlọ ikwu baa na nke ọzọ, sitekwa nʼotu ebe obibi gaa ebe nke ọzọ. 6Nʼebe ọbụla m na-ejegharị nʼetiti ndị Izrel niile, ọ dị mgbe m sịrị onye ọbụla nʼime ndị ndu ha, ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m, sị, “Gịnị mere unu ewubereghị m ụlọ sida?” ’
7“Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị, mee gị onye na-achị ndị m Izrel. 8Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa. 9Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha, ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ, 10dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m eme ka ndị iro gị niile nọrọ nʼokpuru gị.
“ ‘Ana m ekwupụtara gị na Onyenwe anyị ga-ewuru gị ụlọ. 11Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe ị gakwuru ndị nna nna gị ha, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, ọ ga-abụ otu nʼime ụmụ ndị ị mụrụ. Aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike. 12Ọ bụ ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ, aga m emekwa ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. 13Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna, ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Agaghị m ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m mere onye bu gị ụzọ chịa. 14Aga m eme ka ọ chịa ụlọ m na nʼalaeze m ruo mgbe ebighị ebi. A ga-emekwa ka ocheeze ya bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’ ”
15Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị.
Ekpere Devid
16Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu Onyenwe anyị, sị:
“Onye ka m bụ, Onyenwe anyị Chineke, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a? 17O Chineke m, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị, ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị. Ma gị onwe gị Onyenwe anyị Chineke na-ele m anya dịka a ga-asị na m bụ onye ọnọdụ ya dị elu karịchasịa nke ụmụ mmadụ niile.
18“Gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị, nʼihi nsọpụrụ i nyere ohu gị? Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma, 19O Onyenwe anyị, nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ọ mata nkwa ndị a niile dị ukwuu.
20“ Onyenwe anyị, ọ dịghị onye dịka gị, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị. 21Olee ndị dịka ndị gị, bụ Izrel, bụ otu mba nʼelu ụwa ndị Chineke ha gara ịgbapụtara onwe ya ka ọ bụrụ otu ndị, na iji mere onwe gị aha, rụọkwa ọrụ ịtụnanya dị egwu dịkwa ukwuu nʼihi ha, site nʼịchụpụ mba dị iche iche na chi niile ha site nʼihu ndị gị, bụ ndị ị gbapụtara site nʼIjipt? 22I mere ka ndị gị Izrel bụrụ ndị nke gị ruo mgbe ebighị ebi. Gị onwe gị kwa, Onyenwe anyị, abụrụla Chineke ha.
23“Ma ugbu a, Onyenwe anyị, mee ka nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya bụrụ nke ga-eguzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị, 24ka o nwee ike guzosie ike. Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-asị, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke na-achị Izrel, bụ Chineke Izrel.’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị Devid guzosie ike nʼihu gị.
25“Gị onwe gị, Chineke m, e kpugheerela ohu gị na ị ga-ewuru ya ụlọ. Ya mere, ohu gị ji nwee obi ike ikpere gị ekpere. 26Gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Chineke. I kweekwala ohu gị nkwa ihe ọma ndị a. 27Ugbu a, ọ masịrị gị ịgọzi ụlọ ohu gị, ime ka ọ dịrị na-aga nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi, nʼihi na gị Onyenwe anyị, agọziela ya. Ọ ga-abụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.”

¿Sabías que…?
La promesa de Dios a David
- Al considerar que vivía en un palacio de cedro mientras el arca del pacto permanecía bajo una tienda, David quiso edificar un templo para Dios. En respuesta, Dios le prometió que, en lugar de que David le construyera una casa, Él establecería una dinastía real duradera para David.Fuentes: el propio texto bíblico
- Natán fue un profeta influyente durante los reinados de David y Salomón, y aparece aquí para transmitir el pacto de Dios sobre la futura dinastía y el templo. Los registros bíblicos señalan que Natán también participó en la coronación de Salomón y escribió crónicas históricas sobre los reinados de ambos monarcas.Fuentes: Nathan · el propio texto bíblico
- En el mensaje divino transmitido por Natán, el Señor recordó haber tomado a David del pastoreo de ovejas para gobernar a Israel. Este humilde origen como joven pastor en las tierras altas de Judá resaltó la notable elevación de su familia al trono real.Fuentes: David · el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org