1 Crónicas 11
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Devid aghọọ eze Izrel
1Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute Devid na Hebrọn sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ. 2Nʼoge gara aga, ọ bụladị mgbe Sọl bụ eze, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. Onyenwe anyị bụ Chineke gị, sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’ ”
3Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere eze Devid na Hebrọn, ya na ha gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere ya mmanụ ịbụ eze Izrel, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa site nʼọnụ Samuel.
Devid emerie Jerusalem
4Devid na ndị Izrel zọọrọ ije garuo Jerusalem nke bụ Jebus. Ma ndị Jebus bi nʼebe ahụ, 5gwara Devid sị, “Ị gaghị abata nʼebe a.” Nʼagbanyeghị okwu ndị a, Devid dọtara ebe ahụ e wusiri ike nke Zayọn nʼagha, ya bụ obodo Devid.
6Devid ekwuolarị sị, “Onye ọbụla buru ụzọ buo agha megide ndị Jebus ga-abụ onyeisi ọchịagha ndị agha.” Joab nwa Zeruaya bụ onye mbụ gara, nʼihi ya, o nwetara ike ịbụ ọchịagha.
7Devid biiri nʼebe ahụ e wusiri ike. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ya obodo Devid. 8O wuru obodo gburugburu ya, site na Milo ruo na mgbidi gbara ya gburugburu. Ma Joab wuzikwara akụkụ obodo ahụ nke fọdụrụ. 9Ma Devid gara nʼihu na-adị ukwuu karịa, nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nọnyeere ya.
Ndị ọka agha Devid
10Ndị a bụ ndịisi ndị dike nʼetiti ndị agha Devid. Ha na ndị Izrel niile nyere ịchị eze Devid ezi nkwado ime ka ọchịchị ya ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. 11Nke a bụ ndekọ ọnụọgụgụ ndị dike nʼagha Devid nwere:
Jashobeam, onye Hakmon, bụ onyeisi nʼetiti ndịisi ndị ọzọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha.
12Onye nke na-eso ya bụ Elieza nwa Dodayi, onye Ahohi, onye bụ otu nʼime ndị dike atọ ndị ahụ. 13Ya na Devid nọ na Pas Damin mgbe ndị Filistia zukọrọ nʼebe ahụ ibu agha. Nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara nʼọka balị, ma ndị agha Izrel si nʼọgbọ agha gbapụ ọsọ nʼihi ndị Filistia. 14Ma ha were ọnọdụ ha nʼetiti ubi ahụ, ha napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. Onyenwe anyị nyere mmeri dị ukwuu.
15Mmadụ atọ nʼime iri ndịisi agha atọ ahụ jekwuru Devid na nkume dị nʼọgba Adulam, na mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim. 16Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha ndị Filistia dị na Betlehem. 17Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu, ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!” 18Ya mere, ha atọ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala dịka onyinye nye Onyenwe anyị, kwuo sị, 19“Chineke ekwela ka m mee nke a. M ga-aṅụ ọbara ndị ikom a, bụ ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Nʼihi na ha ji ndụ ha chụọ aja ịga kute ya, Devid ekweghị aṅụ ya.
Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara.
20Abishai, nwanne Joab bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a, ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a. 21Nʼetiti mmadụ atọ ahụ, a na-asọpụrụ ya karịa, ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha.
22Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha, kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya. 23O tigburu otu nwoke onye Ijipt, nke ogologo ya dị mita abụọ na ọkara. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe buru ezigbo ibu nʼaka, nke okporo ya dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya, pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị ya nʼaka, jiri ya magbuo ya. 24Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ ahụ. 25A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche.
26Ndị bụ dike nʼagha bụ ndị a:
Asahel nwanne Joab,
Elhanan nwa Dodo onye Betlehem,
27Shamot onye Haroa,
Helez onye Pelon,
28Ira nwa Ikesh, onye Tekoa,
Abieza onye Anatot,
29Sibekai onye Husha,
Ilai onye Ahohi,
30Maharai onye Netofa,
Heled nwa Baana, onye Netofa,
31Itai nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin,
Benaya onye Piraton,
32Hurai onye si nʼakụkụ iyi dị na Gaash,
Abiel onye Arba,
33Azmavet onye Baharum,
Eliaba onye Shaalbon,
34Ụmụ Hashem onye Gizon,
Jonatan nwa Shagee, onye Hara,
35Ahiam nwa Saka, onye Hara,
Elifal nwa Ụọ,
36Hefa onye Mekerat,
Ahija onye Pelon,
37Hezro onye Kamel,
Naarai nwa Ezbai,
38Juel nwanne Netan,
Miba nwa Hagri,
39Zelek onye Amọn,
Naharai onye Beerọt, onye na-ebu ngwa agha Joab, nwa Zeruaya,
40Ira onye Itra,
Gareb onye Itra,
41Ụraya onye Het,
Zabad nwa Alai,
42Adina nwa Shiza, onye Ruben, onye bụ onyeisi ebo Ruben na iri mmadụ atọ ahụ na-eso ya.
43Hanan nwa Maaka,
Joshafat onye Mitna,
44Ụzia onye Ashterat,
Shama na Jeiel ụmụ Hotam, onye Aroea,
45Jediael nwa Shimri,
Joha nwanne ya, onye Tiza,
46Eliel onye Mahavi,
Jeribai na Joshavia ụmụ Elnaam,
Itma onye Moab,
47Eliel, Obed, na Jaasiel onye Mezoba.
¿Sabías que…?
La Coronación de David y Sus Valientes
- Antes de que David la conquistara, Jerusalén era conocida como Jebús, una plaza fuerte cananea en el monte Sion que sus habitantes consideraban inexpugnable. David prometió el mando militar a quien encabezara el asalto, distinción que obtuvo su sobrino Joab.Fuentes: Jebus · Joab · el propio texto bíblico
- Cuando David expresó su anhelo de beber agua del pozo junto a la puerta de Belén, tres de sus principales guerreros atravesaron el campamento filisteo para conseguirla. Negándose a beber un agua obtenida a riesgo de sus vidas, David la derramó en tierra como ofrenda al Señor.Fuentes: Bethlehem · Jashobeam · Eleazar · el propio texto bíblico
- Benaías, hijo de Joiada, fue famoso por singulares hazañas bélicas, entre ellas matar a un león dentro de un foso en un día nevado y vencer a un imponente guerrero egipcio solo con una vara. David lo puso al mando de su guardia real.Fuentes: Benaiah · el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Hebron · Hoy: Tel Rumeida · 31.525, 35.102 · versículos 1, 3
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 4, 8
- City of David · 31.774, 35.236 · versículos 5, 7
- Zion · Hoy: Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 5
- Valley of Rephaim · 31.763, 35.219 · versículo 15
- Bethlehem · 31.704, 35.208 · versículos 16, 17, 18, 26
- Moab · Hoy: Moab 1 · 31.181, 35.701 · versículos 22, 46
- Tekoa · Hoy: Khirbet Teku’a · 31.632, 35.210 · versículo 28
- Arabah · 30.417, 35.151 · versículo 32
- Ammon · 31.955, 35.934 · versículo 39
- Jattir · Hoy: Khirbet Attir · 31.352, 35.016 · versículo 40
- Zobah · 33.935, 36.151 · versículo 47
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org