Nations Bible

Romans 6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Ịnwụ ọnwụ nye mmehie na Ịdị ndụ nʼime Kraịst

1Gịnị ọzọkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-anọgide nʼime mmehie ka amara na-aba ụba? 2E e! O kwesighị! Olee otu anyị ga-esi na-adị ndụ nʼime mmehie, mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị? 3Ọ bụ na unu amataghị na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtakwara anyị na ya nʼọnwụ. 4Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ.

5Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ. 6Nʼihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ nke ochie anyị na Kraịst nʼelu obe, iji mee ka anụ ahụ nke mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nʼiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nʼịbụ ohu nke mmehie. 7Nʼihi na onye nwụrụ anwụ agụọla ya dịka onye nwere onwe ya site nʼebe mmehie dị.

8Ọ bụrụkwa nʼeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ. 9Nʼihi na anyị maara na ebe e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọbụla nʼebe ọ nọ ọzọ. 10Ọ nwụrụ naanị otu mgbe nʼihi mmehie. Ma ndụ ọ na-adị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke.

11Ya mere, gụọ onwe unu ugbu a dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dịka ndị dị ndụ nʼebe Chineke nọ nʼime Kraịst, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị. 12Unu ekwela ka mmehie na-achị eze nʼahụ unu ọzọ, nke ga-eme ka unu na-erubere agụụ nke anụ ahụ isi. 13Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume. 14Nʼihi na unu ekwesighị ị bụ ohu mmehie, ebe ọ bụ na unu anọkwaghị nʼokpuru iwu ọzọ, kama unu nọ nʼokpuru amara.

Ịbụ ohu nke ezi omume

15Gịnịkwa? Anyị ga-eme mmehie nʼihi na anyị anọghị nʼokpuru iwu kama nʼokpuru amara? Mba! O kwesighị. 16Ọ bụ na unu amataghị na mgbe unu weere onwe unu nye mmadụ irubere ya isi dịka ohu, unu bụ ohu nye onye ahụ unu na-erubere isi, maọbụ ohu nye mmehie nke na-eduba nʼọnwụ, ma ọ bụkwanụ irube isi nke na-eduba nʼezi omume? 17Ma ekele dịrị Chineke nʼihi na ọ bụ ezie na unu bụrịị ohu nye mmehie, ma ugbu a, unu ejirila obi unu niile kpebie ịnabatara onwe unu ozizi ahụ e nyefere nʼaka unu. 18Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie, unu abụrụla ndị ohu ezi omume.

19Ana m eji ihe ịmaatụ site na ndụ a na-ebi kwa ụbọchị, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ mmadụ. Ya mere, dịka unu si were ahụ unu dị iche iche nye ịbụ ohu adịghị ọcha na ajọ omume nke na-abawanye ụba, sitekwanụ otu a were ha nye ugbu a ka ha bụrụ ohu ezi omume nke na-eduba nʼịdị nsọ. 20Mgbe unu bụ ohu mmehie, o nweghị ihe megidere unu ime ezi omume. 21Ma gịnị bụ uru unu nwetara nʼoge ahụ site nʼọrụ ahụ niile unu rụrụ, bụ ihe ndị ahụ na-eme ka ihere mee unu? Ihe ndị ahụ na-eduba nʼọnwụ. 22Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi. 23Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.

Did you know?

Dead to Sin, Alive to God

  • Romans 6 begins by asking whether people should continue in sin so that grace may increase, and answers, “Certainly not!” Those who have died to sin, the chapter argues, cannot go on living in it.Sources: the Bible text itself
  • Baptism is pictured as being baptized into Christ Jesus and into his death, and as burial with him, so that, just as Christ was raised from the dead through the glory of the Father, those united with him may walk in newness of life.Sources: the Bible text itself
  • Because of the weakness of the flesh, the chapter says it is speaking in human terms and compares life to slavery: a person becomes a slave of whatever they obey, whether sin leading to death or obedience leading to righteousness. It closes by contrasting the wages of sin, which is death, with the gift of God, which is eternal life in Christ Jesus our Lord.Sources: the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.