Romans 4
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Chineke nabatara Ebraham site nʼokwukwe ya
1Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere Ebraham, nna nna anyị na o nwetara ihe niile site nʼanụ ahụ? 2A sị na a gụrụ Ebraham dịka onye ezi omume site nʼọrụ aka ya, ọ gaara enwe ihe ọ ga-eji anya isi, ma na ọ bụghị nʼihu Chineke. 3Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.”
4Mgbe mmadụ rụrụ ọrụ, ụgwọ ọrụ a kwụrụ ya abụghị onyinye, kama ọ bụ ihe ruru ya nʼihi ọrụ ọ rụrụ. 5Ma nye onye na-enweghị ọrụ ma tinye okwukwe ya na onye ahụ na-agụnye ndị ajọọ omume dịka ndị ezi omume, a ga-eji okwukwe ya gụnyere ya dịka ezi omume. 6Devid nʼonwe ya kwukwara banyere ọṅụ dịịrị onye ọbụla Chineke gụrụ nʼonye ezi omume nʼagbanyeghị ọrụ ya.
7“Ngọzị na-adịrị
ndị a gbaghaara ajọ omume ha niile,
ndị ekpuchikwara mmehie ha niile.
8Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ,
onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya.”
9Ngọzị a ọ dịrị naanị ndị e biri ugwu ka ọ bụ nyekwa ndị a na-ebighị ugwu? Ihe anyị na-ekwu bụ na a gụrụ okwukwe Ebraham dị ka ezi omume nye ya. 10Olee mgbe a gụrụ ya nye ya? Ọ bụ tupu e bie ya ugwu, ka ọ bụ mgbe e bichara ya ugwu? Ọ bụghị mgbe e bichara ya ugwu kama ọ bụ tupu e bie ya ugwu. 11Ọ natara ihe ịrịbama nke obibi ugwu dịka akara nke ezi omume nke okwukwe o nwere mgbe ọ nọ na-ebighị ugwu. Nke a bụ ime ya nna ndị niile kweerenụ, ndị ahụ ọ gụrụ dịka ndị ezi omume, ọ bụ ezie na ha bụ ndị a na-ebighị ugwu. 12Nʼụzọ dị otu a kwa, ọ bụ nna ndị niile e biri ugwu. Ndụ ya na-egosikwa ha na ọ bụghị obibi ugwu ha na-azọpụta ha, kama ọ bụ okwukwe ha. Nʼihi na Chineke nabatara Ebraham naanị site nʼokwukwe o nwere tupu e bie ya ugwu.
E kwere Ebraham nkwa nʼihi okwukwe ya
13Nkwa o kwere Ebraham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị site nʼidebe iwu, kama ọ bụ site nʼezi omume nke okwukwe. 14Nʼihi na, ọ bụrụ na ndị a ga-enye ihe e kwere na nkwa bụ ndị na-edebe iwu, inwe okwukwe abakwaghị uru, nkwa ahụ enwekwaghị isi ọbụla. 15Nʼihi na iwu nʼonwe ya na-eme ka ọnụma bịa. Ma ebe iwu na-adịghị, mmehie adịghịkwa.
16Ya mere, nkwa ahụ na-abịa site nʼokwukwe, ka ọ bụrụ naanị site nʼamara ka e ji mee ka ụmụ ya niile nweta ya, ọ bụghị naanị nye ndị nọ nʼokpuru iwu, kama ọ bụkwa nye ndị nwere ụdị okwukwe Ebraham. Nʼihi na ọ bụ nna anyị niile. 17Dịka e dere ya, “Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.” Ya mere, nʼihu Chineke ahụ bụ onye o kweenyere nʼime ya, bụ onye ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịbụghị, mee ka ha dịrị.
Ebraham bụ ihe ịmaatụ banyere okwukwe
18Ọ bụladị mgbe olileanya gasịrị, o kwenyere na ya ga-abụ nna nke ọtụtụ mba, dịka ihe a gwara ya si dị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị.” 19Ọ daghị mba nʼokwukwe ọ bụladị mgbe ọ matara na ya akala nka nʼahụ, nʼihi na ọ gbaruola otu narị afọ, tinyekwara na akpanwa Sera bụ ihe nwụrụ anwụ. 20Ọ dịghị mgbe ọbụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe niile o kwere ya na nkwa. Kama, okwukwe ya mere ka ọ gbasie ike, ka ọ na-enye Chineke otuto. 21O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe niile ọbụla o kwere na nkwa. 22Ọ bụ nʼihi ya ka e ji gụọ nke a nye ya dị ka ezi omume. 23Okwu ndị a, “A gụrụ ya nye ya dịka onye ezi omume,” edeghị ya naanị maka ya. 24Kama e dere ya nʼihi anyị bụ ndị kwere nʼonye ahụ mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie. 25Onye a rara nye ka ọ nwụọ nʼihi mmehie anyị niile, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie ka anyị bụrụ ndị a gụrụ dịka ndị ezi omume.
Did you know?
Abraham's faith credited as righteousness
- Easton's Bible Dictionary (1897) explains the name Abraham as "father of a multitude." This chapter quotes the promise, "I have made you a father of many nations," and calls him the father of all who believe, whether circumcised or not.Sources: Abraham · the Bible text itself
- This chapter stresses that Abraham's faith was credited to him as righteousness before he was circumcised, not afterward. Circumcision is described as a sign and seal of that righteousness, so he is the father both of uncircumcised believers and of circumcised people who follow the same faith.Sources: the Bible text itself
- Easton's Bible Dictionary (1897) explains the name Sarah as "princess" and says it was given when it was announced that she would be the mother of the promised child. This chapter recalls Abraham, about a hundred years old, believing God's promise even though Sarah's womb was lifeless.Sources: Sarah · the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org