Nations Bible

Romans 10

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

1Ụmụnna m, ihe na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwu na ekpere m na-ekpe nye Chineke bụ ịhụ na a zọpụtara ha. 2Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nʼobi nke ukwuu. Kama ịnụ ọkụ nʼobi ha abụghị site na mmazu Chineke. 3Ebe ha na-amaghị ezi omume nke si na Chineke bịa kama ha chọrọ ihiwe nke onwe ha, ha ewedaghị onwe ha nʼokpuru ezi omume nke Chineke. 4Kraịst bụ ọgwụgwụ iwu. Ya mere, ezi omume ga-adịrị onye ọbụla nke kwere.

Ama Mosis gbara banyere idebe iwu

5Mosis si otu a dee banyere ezi omume nke sitere nʼiwu, “Onye ọbụla na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ site na ha.” 6Ma ezi omume ahụ nke sitere nʼokwukwe na-asị, “Asịla nʼime obi gị, ‘onye ga-arịgo nʼime eluigwe?’ ” (nke bụ, ikudata Kraịst) 7“maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’ ” (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ). 8Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,” ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa. 9Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị. 10Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị. 11Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.” 12Nʼihi na o nweghị ihe dị iche nʼetiti onye Juu na onye mba ọzọ, otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onye nwe mmadụ niile, ọ na-agọzibigakwa ndị na-akpọku ya oke. 13Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.”

14Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị? 15Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.”

16Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?” 17Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst. 18Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie.

“Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo,

okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.”

19Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị,

“Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu;

aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.”

20Ma Aịzaya jiri nkwuwa okwu sị,

“Ndị chọtara m bụ ndị na-adịghị ajụ ase m,

ekpugheere m onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.”

21O kwuru banyere ndị Izrel,

“Agbasara m aka m ogologo ụbọchị niile

nye ndị nnupu isi na ndị na-ekwesị olu ike.”

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Righteousness by Faith

  • The chapter opens with a heart's desire and a prayer to God for the Israelites' salvation. The writer testifies that they are zealous for God, but not on the basis of knowledge: because they were ignorant of God's righteousness and sought to establish their own, they did not submit to God's righteousness. Christ, it says, is the end of the law, to bring righteousness to everyone who believes.Sources: the Bible text itself
  • On the righteousness that is by the law, Moses writes, "The man who does these things will live by them." The righteousness that is by faith says instead that the word is near, in the mouth and in the heart—the word of faith being proclaimed: if you confess with your mouth, "Jesus is Lord," and believe in your heart that God raised him from the dead, you will be saved. There is no difference between Jew and Greek, for the same Lord is Lord of all.Sources: the Bible text itself
  • The chapter quotes Isaiah, "Lord, who has believed our message?" and Isaiah's bold words, "I was found by those who did not seek Me," and, concerning Israel, "All day long I have held out My hands to a disobedient and obstinate people." Isaiah was the son of Amoz and prophesied during the reigns of Uzziah, Jotham, Ahaz, and Hezekiah. Easton's Bible Dictionary (1897) says he probably began his career in 762 B.C.Sources: the Bible text itself · Isaiah

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.