Nations Bible

Revelation 6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Akara mechiri akwụkwọ ahụ

1Ahụrụ m mgbe Nwa atụrụ ahụ meghere otu nʼime akara asaa ahụ. Otu nʼime anụ anọ ahụ dị ndụ tiri mkpu dịka a ga-asị na ọ bụ egbe eluigwe sị, “Bịa!” 2Mgbe m lere anya, ahụrụ m ịnyịnya dị ọcha. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ụta nʼaka ya. A tụkwasịkwara okpueze nʼisi ya dịka onye agha na-emeri emeri mgbe niile.

3Mgbe o meghere akara nke abụọ, ngwangwa, anụrụ m ka anụ nke abụọ ahụ nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ tiri mkpu sị, “Bịa!” 4Mgbe ahụ, ịnyịnya ọzọ na-acha ọbara ọbara pụtara. E nyere onye nọkwasịrị nʼelu ya ike iwepụ udo nʼụwa nakwa ime ka ụmụ mmadụ na-egburita ibe ha. E nyekwara ya mma agha dị ukwuu.

5Ma mgbe o meghere akara nke atọ, anụrụ m ka anụ nke atọ ahụ dị ndụ kwuru, “Bịa!” Ahụrụ m ịnyịnya dị ojii. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ihe ọtụtụ abụọ nʼaka ya. 6Anụkwara m ihe dị ka olu nke sitere nʼetiti anụ anọ ahụ dị ndụ na-adapụta sị, “Otu ihe ọtụtụ kilo nke ọka wiiti bụ ụgwọ ọrụ otu ụbọchị, ihe ọtụtụ kilo atọ nke ọka balị bụkwa ụgwọ ọrụ otu ụbọchị. Ya mere, unu emebikwala mmanụ oliv na mmanya.”

7Mgbe o meghere akara nke anọ, anụrụ m ka anụ nke anọ dị ndụ sịrị, “Bịa!” 8Elere m anya ma hụ ịnyịnya na-acha ntụntụ nʼihu m. Aha onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ Ọnwụ na Ọkụ ala mmụọ na-esokwa ya nʼazụ. E nyere ha ike nʼebe otu ụzọ nʼụzọ anọ nke ụwa dị ka ha jiri mma agha na ụnwụ, na ọrịa ọjọọ na anụ ọhịa gbuchapụ ndị bi nʼime ha.

9Ma mgbe ọ meghere akara nke ise, ahụrụ m nʼokpuru ebe ịchụ aja mkpụrụobi ndị niile e gburu egbu nʼihi okwu Chineke na nʼihi ịgba ama nke ha jidesiri ike. 10Ha ji oke olu tie mkpu na-asị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, onye dị nsọ na onye eziokwu, ruo olee mgbe ka ị na-eche ikpe ụwa na ndị bi nʼime ya ikpe ma bọọkwa ọbọ nʼisi ha maka ọbara anyị ha wufuru?” 11E nyere ha nʼotu nʼotu uwe ọcha, a gwakwara ha ka ha zuru ike nwa oge nta, tutu ruo mgbe ọnụọgụgụ ndị ozi ibe ha na ụmụnna ha a ga-egbu dịka e gburu ha ga-ezu.

12Anọkwa m na-ele anya mgbe o meghere akara nke isii ahụ. Nke a mere ka oke ala ọma jijiji dịrị. Anyanwụ gbara ọchịchịrị dị ka akwa mkpe e jiri ajị mee. E mekwara ka ọnwa chaa uhie uhie dịka ọbara. 13Mgbe ahụ, kpakpando dị na mbara eluigwe malitere ịdapụ nʼala dịka mkpụrụ osisi fiig na-achaghị acha si adapụ mgbe oke ifufe na-efegharị ya. 14Mbara eluigwe gabigara, dịka akwụkwọ mgbe a na-apịakọta ya. Ugwu niile na agwa etiti niile ka e wepụkwara site nʼọnọdụ ha.

15Ndị eze niile nke ụwa na ndị nọ nʼọchịchị dị iche iche, na ndị ọgaranya, na ndị nọ nʼọnọdụ dị elu, na ndị ọchịagha, na ndị mmadụ niile dị iche iche, ndị ukwu ma ndị nta, ndị ohu na ndị nwe onwe ha, ha niile gara zoo onwe ha nʼime ọgba nkume na nʼokpuru ugwu, 16ha na-eti mkpu na-arịọ ugwu ndị ahụ na-asị, “Dakwasịnụ anyị zoo anyị ka onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ocheeze ahụ hapụ ịhụ anyị, ka oke iwe nke Nwa Atụrụ ahụ hapụ ịbịakwasị anyị. 17Nʼihi na, lee oke ụbọchị iwe ha abịala, onye pụrụ ịgbanarị ya?”

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Opening of the Six Seals

  • The first four seals reveal four riders on white, bright red, black, and pale green horses, summoned one by one by the four living creatures. Each horseman brings a distinct affliction across the earth, ranging from conquest and the loss of peace to widespread famine, plague, and death.Sources: the Bible text itself
  • The third horseman holds a pair of scales, accompanied by a proclamation setting the price of a quart of wheat or three quarts of barley at a denarius, reflecting severe inflation and food rationing while oil and wine are preserved.Sources: the Bible text itself
  • When the fifth and sixth seals are opened, the focus shifts to the souls of slain believers waiting under the altar, followed by immense cosmic and earthly upheavals that lead people of every social station to hide in mountain caves.Sources: the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.