Revelation 4
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Ocheeze dị nʼeluigwe
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, eleliri m anya m hụ ọnụ ụzọ dị nʼeluigwe ka e meghere ya. Ụda olu ahụ m nụrụ na mmalite dara ọzọ, dị ka ụda opi ike sị m, “Bịa, gbagota nʼebe a, ka m gosi gị ihe ga-emezuriri mgbe ihe ndị a gasịrị.” 2Nʼotu oge ahụ, e mere ka m nọọ nʼime mmụọ, ma lee, ahụrụ m onwe m nʼeluigwe, hụkwa ka e debere otu ocheeze nke otu onye na-anọkwasị nʼelu ya. 3Ụdịdị onye nọkwasịrị nʼocheeze ahụ na-egbu nweghenweghe dịka nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa na kanelian. Eke na egwurugwu dịka nkume oke ọnụahịa. Emeralụdụ gbara ocheeze ahụ gburugburu. 4Iri ocheeze abụọ na anọ ọzọ, gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu. Ndị nọkwasịrị nʼocheeze ndị a bụ iri ndị okenye abụọ na anọ, ndị yi uwe ọcha. Ha kpukwa okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha. 5Mgbe ahụ, ụda dịka ụda egbe eluigwe, ya na amụma na-egbuke sitere nʼocheeze ukwu ahụ na-ada na-achapụtakwa. Nʼihu ocheeze ukwu ahụ, e nwere oriọna asaa na-enwu ọkụ. Oriọna ndị a bụ mmụọ asaa nke Chineke. 6Nʼihu ocheeze ahụ e nwere ihe dịka oke osimiri e ji enyo mee, nke na-enwu dịka kristal.
Nʼetiti ihu ocheeze ahụ na gburugburu ya, e nwere anụ anọ dị ndụ nwere anya nʼakụkụ ahụ ha niile, ihu na azụ. 7Nke mbụ nʼime anụ ndị ahụ dị ndụ nwere oyiyi dịka ọdụm. Nke abụọ dịka ehi. Nke atọ nwere ihu yiri nke mmadụ. Nke anọ dịka ugo gbasapụrụ nku ya na-efe efe. 8Nke ọbụla nʼime ihe anọ ndị a dị ndụ nwere nku isii. Anya jupụtara nʼahụ ha niile na nʼime ha, ọ bụladị nʼokpuru nku ha. Ehihie na abalị niile, ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị,
“ ‘Nsọ, Nsọ, Nsọ
ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile dị,’
bụ onye ahụ dịkwaarị, onye ahụ na-adị, na onye ahụ na-aga ịbịa.”
9Mgbe ọbụla anụ ndị ahụ dị ndụ na-enye onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi otuto na nsọpụrụ na ekele, 10iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nʼala nʼihu onye ahụ nọ nʼocheeze na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ha niile nʼotu nʼotu na-atụda okpueze ha nʼihu ya na-abụ abụ na-asị,
11“Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị,
kwesiri ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike.
Nʼihi na gị onwe gị kere ihe niile,
ọ bụkwa site nʼọchịchọ gị ka e ji kee ha,
ma meekwa ka ha dịrị ndụ.”
Did you know?
The Throne and Its Worship
- The chapter opens as the narrator looks and sees a door standing open in heaven. The voice he had already heard, sounding like a trumpet, calls him to come up and be shown what must happen afterward; at once he is in the Spirit and sees a throne, with someone seated on it who looks like jasper and carnelian, ringed by a rainbow that gleams like an emerald.Sources: the Bible text itself
- The text itself explains one image: the seven torches of fire burning before the throne are the seven Spirits of God. Lightning, rumblings, and thunder come from the throne, and before it lies something like a sea of glass, clear as crystal.Sources: the Bible text itself
- Four living creatures surround the throne, like a lion, a calf, a human face, and an eagle in flight. Each has six wings and is covered with eyes, and day and night they never stop declaring the Lord God Almighty holy. Whenever they give glory, twenty-four elders in white, with golden crowns, fall down, cast their crowns before the throne, and call the One seated there worthy because he created all things and by his will they exist.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org