Nations Bible

Revelation 16

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Efere asaa nke ọnụma Chineke

1Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼụlọnsọ ahụ na-ada na-agwa ndị mmụọ ozi asaa ahụ okwu, “Ngwanụ, gaanụ wụsa ihe dị nʼefere ọnụma asaa Chineke ahụ nʼelu ụwa.”

2Mmụọ ozi nke mbụ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu ụwa, ọnya ọjọọ na-egbu oke mgbu bịakwasịrị mmadụ niile nwere akara anụ ọhịa ahụ, na ndị na-akpọrọ oyiyi ya isiala.

3Mmụọ ozi nke abụọ wụsara ihe dị nʼime efere nke ya nʼelu osimiri niile. Otu mgbe ahụ, osimiri niile chagharịrị ghọọ ọbara dịka nke onye nwụrụ anwụ. Nke a mere ka ihe niile dị ndụ nʼime osimiri ahụ nwụọ.

4Mmụọ ozi nke atọ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu iyi na nʼelu isi iyi niile. Nke a mere ka ha niile ghọọ ọbara. 5Anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ mmiri niile dị nʼaka ya kwuru okwu sị,

“I kpere ikpe ziri ezi, Gị, Onye dị Nsọ,

na onye na-adị site na mmalite, na onye na-adịkwa ugbu a.

6Nʼihi na ha wụsara ọbara ndị nsọ gị na ndị amụma gị.

Ma ugbu a, i nyela ha ọbara ka ha ṅụọ. Nke a bụkwa ezi ụgwọ ọrụ ha kwesiri ịnata.”

7Mgbe ahụ kwa, anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ na-anọ nʼebe ịchụ aja sịrị,

“E, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile,

ikpe gị niile bụ nke ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.”

8Mmụọ ozi nke anọ pụrụ wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu anyanwụ si otu a mee ka anwụ were okpomọkụ ya chagbuo ndị mmadụ. 9Okpomọkụ ahụ si nʼanyanwụ bịa rere onye ọbụla ọkụ nʼahụ. Nke a mere ka ndị mmadụ bido ịkọcha aha Chineke, onye nwere ike ịchị ihe otiti ndị a, ma ha jụrụ ichegharị nye ya otuto.

10Mmụọ ozi nke ise pụrụ wụkwasị ihe dị nʼefere nke ya nʼelu ocheeze anụ ọhịa ahụ, mee ka alaeze ya jupụta nʼọchịchịrị. Ndị mmadụ tabiri ire ha nʼihi oke ahụ ụfụ. 11Ha kọchara Chineke nke eluigwe nʼihi ihe ụfụ na ọnya bịakwasịrị ha. Ma ha jụrụ ichegharị site nʼajọ ọrụ ha niile.

12Mmụọ ozi nke isii pụkwara wụkwasị ihe dị nʼefere ya nʼelu mmiri ukwu ahụ bụ Yufretis si otu a mee ka mmiri dị nʼime ya taa. Nke a mere ka ọ dịrị ndị eze ahụ si nʼọwụwa anyanwụ mfe. 13Ahụrụ mmụọ atọ rụrụ arụ ndị pụtara ihe nʼụdịdị awọ, ha si nʼọnụ agwọ ochie ahụ na nʼọnụ anụ ọhịa ahụ nwere ike ịrụ ọrụ ịtụnanya pụta, na nʼọnụ onye amụma ụgha ahụ. 14Ha bụ mmụọ nke ajọ mmụọ ndị ahụ na-arụ ọrụ ịrịbama. Ọ bụ ha na-ejekwuru ndị eze ụwa niile ịchịkọta ha maka ibu agha nʼụbọchị ukwu ahụ bụ ụbọchị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.

15“Lee! Ana m abịa dịka onye ohi. Ngọzị na-adịrị onye ahụ nọ na-eche nche, ndị yi uwe ha na njikere, ka ọ ghara ijegharị nʼọnọdụ ịgba ọtọ, bụrụ onye ọnọdụ ya na-eweta ihere.”

16Ha kpọkọrọ ndị eze ahụ nʼotu ebe a na-akpọ Amagidọn nʼasụsụ Hibru.

17Mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị nʼefere nke ya nʼikuku, otu olu sitere nʼocheeze dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ daa ụda sị, “Emezuola ya!” 18Mgbe ahụ egbe eluigwe bidoro na-agba na-eme mkpọtụ, amụma bidokwara na-egbu, oke ala ọma jijiji dịkwara nʼụwa, ụdị nke na-adịbeghị site na mgbe e kere ụwa. Ọ bụ ala ọma jijiji kachasị ala ọma jijiji ndị ọzọ njọ. 19Obodo ukwu ahụ kewara ụzọ atọ. Obodo niile dị na mba niile dakwara. Chineke chetara obodo ukwu ahụ bụ Babilọn. O nyere ya iko jupụtara na mmanya nke nʼoke iwe nke ọnụma ya. 20Mgbe ahụ, agwa etiti niile mikpuru, ugwu niile ghọrọ ala dị larịị. 21Mkpụrụ mmiri nke ịdị arọ otu nʼime ha ruru kilogram iri anọ na ọkara, sitere nʼeluigwe na-adakwasị ndị mmadụ. Nke a mekwara ka ha kọchaa Chineke nʼihi ihe ntaramahụhụ nke mkpụrụ mmiri ahụ, nʼihi na ihe ntaramahụhụ ahụ dị nnọọ njọ nke ukwuu.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Seven Bowls of Wrath

  • Armageddon is named only in Revelation 16:16, where the kings assemble for battle; the Revised Version reads Har-Magedon. Easton's Bible Dictionary (1897) says the word properly means mount of Megiddo and treats it as a symbolic name for that battlefield, an image suggested by the Old Testament battlefield of the plain of Esdraelon.Sources: Armageddon · the Bible text itself
  • The sixth bowl is poured on the great river Euphrates, and its water is dried up to prepare the way for the kings of the East. Easton's Bible Dictionary derives the Greek name Euphrates from Persian Ufratush, meaning sweet water, and notes that the Assyrian name means the stream or the great stream. In the Bible the river is often called simply the river (Exodus 23:31) or the great river (Deuteronomy 1:7).Sources: Euphrates · the Bible text itself
  • When the seventh bowl is poured out, the text says that God remembered Babylon the great. Easton's Bible Dictionary identifies Babylon as the Greek form of Babel, from the Semitic name Babilu, the Gate of God, a city that stood on the Euphrates about two hundred miles above the point where the river meets the Tigris.Sources: Babylon · the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • East · Today: region around Amman · 31.955, 35.934 · verse 12
  • Euphrates · Today: Euphrates River · 31.004, 47.442 · verse 12
  • Babylon · Today: Rome · 41.892, 12.485 · verse 19

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.