Nations Bible

Numbers 26

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Ịgụ ọnụ nke ugboro abụọ

1Mgbe ihe otiti ahụ niile gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis na Elieza nwa Erọn, onye nchụaja okwu sị ha, 2“Gaanụ gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ nzukọ niile nke ụmụ Izrel dịka ezinaụlọ ha si dị; ndị niile gbara iri afọ abụọ gafee. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị nwere ike ije agha.” 3Ya mere, na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ka Mosis na Elieza onye nchụaja nọ gwa ha okwu sị ha, 4“Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.”

5Ụmụ ụmụ Ruben, ọkpara Izrel, bụ ndị a:

site na Hanok, ikwu Hanok,

site na Palu, ikwu Palu,

6site na Hezrọn, ikwu Hezrọn

site na Kami, ikwu Kami 7Ndị a bụ agbụrụ Ruben. Ọnụọgụgụ ha dị iri puku anọ, puku atọ na narị asaa na iri atọ (43,730).

8Nwa Palu bụ Eliab, 9ụmụ Eliab bụ Nemuel, Datan na Abiram. Datan na Abiram bụ ndị ndu ọgbakọ ahụ nupuru isi megide Mosis na Erọn. Ha sonyere ndị ahụ so Kora mgbe ha nupuru isi megide Onyenwe anyị. 10Ala meghere ọnụ ya, loo ha na Kora, ma ọkụ rechapụrụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ọzọ ahụ sonyere ha. Ọnwụ ha ghọrọ ihe ịdọ aka na ntị. 11Otu ọ dị, ndị niile si nʼezinaụlọ Kora anwụchaghị.

12Ụmụ ụmụ Simiọn dịka ikwu ha si dị bụ,

site na Nemuel, ikwu Nemuel,

site na Jamin, ikwu Jamin,

site na Jakin, ikwu Jakin,

13Site na Zera, ikwu Zera,

site na Shaul, ikwu Shaul. 14Ndị a bụ ndị agbụrụ Simiọn. Ọnụọgụgụ ndị ikom ha dị iri puku abụọ, puku abụọ na narị abụọ (22,200).

15Ụmụ ụmụ Gad dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:

ikwu Zefọn, site na Zefọn,

ikwu Hagi, site na Hagi,

ikwu Shuni, site na Shuni,

16ikwu Ozni, site na Ozni,

ikwu Eri, site na Eri,

17ikwu Arodi, site na Arodi,

ikwu Areli, site na Areli, 18Ndị a bụ agbụrụ Gad. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ na narị ise (40,500).

19Ụmụ ndị ikom Juda abụọ, Ịa na Onan, nwụrụ nʼala Kenan.

20Ma ụmụ ụmụ Juda ndị ọzọ, dịka ikwu ha dị iche iche si dị bụ ndị a:

ikwu Shela, site na Shela,

ikwu Perez, site na Perez,

ikwu Zera, site na Zera.

21Ikwu abụọ ọzọ si nʼagbụrụ Perez bụ ndị a:

Ikwu Hezrọn, site na Hezrọn,

Ikwu Hamul, site na Hamul. 22Ndị a bụ agbụrụ Juda. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku asaa, puku isii na narị ise (76,500).

23Ụmụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:

ikwu Tola, site na Tola,

ikwu Pua, site na Pua

24ikwu Jashub, site na Jashub,

ikwu Shịmrọn, site na Shịmrọn. 25Ndị a bụ agbụrụ Isaka. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị atọ (64,300).

26Ụmụ ụmụ Zebụlọn dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:

ndị Sered, site nʼikwu Sered,

ndị Elọn, site nʼikwu Elọn,

ndị Jaliil, site nʼikwu Jaliil. 27Ndị a bụ agbụrụ Zebụlọn. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii na narị ise (60,500).

28Ụmụ ụmụ Josef dịka ha si dị nʼagbụrụ Manase na Ifrem bụ ndị a:

29Ụmụ ụmụ Manase bụ ndị a:

ndị Makia, site nʼikwu Makia. Makia bụ nna Gilead.

Ikwu Gilead, site na Gilead.

30Ndị a bụ ụmụ ụmụ Gilead:

ikwu Leza, site na Leza,

ikwu Helek, site na Helek.

31Ikwu Asriel, site na Asriel.

Ikwu Shekem, site na Shekem.

32Ikwu Shemida, site na Shemida,

ikwu Hefa, site na Hefa.

33(Hefa mụtara nwoke a na-akpọ Zelofehad. Ma Zelofehad amụtaghị nwoke ọbụla kama ndị inyom ndị a ka ọ mụtara, Mahla, na Noa, na Hogla, na Milka, na Tịaza.) 34Ndị a bụ agbụrụ Manase. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku abụọ na narị asaa (52,700).

35Ndị a bụ ụmụ ụmụ Ifrem dịka ikwu ha si dị:

ikwu Shutela site na Shutela,

ikwu Beka site na Beka,

ikwu Tahan site na Tahan.

36Ndị a bụ ụmụ ụmụ Shutela:

ikwu Eran site na Eran. 37Ndị a bụ agbụrụ Ifrem. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku atọ, puku abụọ na narị ise (32,500).

38Ndị a bụ ụmụ ụmụ Benjamin dịka ikwu ha si dị:

ikwu Bela site na Bela,

ikwu Ashbel site Ashbel,

ikwu Ahiram site na Ahiram.

39Ikwu Shufam site na Shufam,

ikwu Hufam site na Hufam.

40Ụmụ ụmụ Bela site na Aad, na Naaman bụ,

ikwu Aad site na Aad,

ikwu Neeman site na Neeman. 41Ndị a bụ agbụrụ Benjamin. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị isii (45,600).

42Ụmụ ụmụ Dan dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:

ikwu Shuham, site na Shuham. 43Ha niile si nʼagbụrụ Shuham. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị anọ (64,400).

44Ụmụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:

ikwu Imna site na Imna,

ikwu Ishvi, site na Ishvi,

ikwu Beriya, site na Beriya.

45Ikwu e nwere site nʼụmụ ụmụ Beriya bụ ndị a:

ikwu Heba, site na Heba,

ikwu Malkiel, site na Malkiel. 46Asha mụtakwara otu nwa nwanyị aha ya bụ Sera. 47Ndị a bụ agbụrụ Asha. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).

48Ụmụ ụmụ Naftalị dịka ikwu ha si dị bụ ndị a:

ikwu Jaziil, site na Jaziil,

ikwu Guni, site na Guni,

49ikwu Jeza, site na Jeza,

ikwu Shilem, site na Shilem. 50Ndị a si nʼagbụrụ Naftalị. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị anọ (45,400).

51Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom niile tozuru ije agha nʼIzrel dị narị puku isii, otu puku na narị asaa, na iri atọ (601,730).

52Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 53“Ị ga-ekenye ha ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha dịka ọnụọgụgụ aha ha si dị. 54Ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ ga-eketa ala dị ukwuu, ma ndị dị nta ga-eketa ala dị nta. Ihe nketa nke onye ọbụla ga-enweta ga-adị ka ọnụọgụgụ ahụ e dere. 55Lezie anya hụ na e kesara ala ahụ site nʼife nza. Ala ndị ọbụla ga-eketa ga-abụ dịka aha nna ochie ebo ha si dị. 56A ga-esite nʼife nza kenye ndị ọbụla ihe nketa nke ha dịka ịdị ukwuu maọbụ ịdị nta ha si dị.”

57Ndị a bụ ndị Livayị a gụrụ ọnụ dịka ikwu ha si dị,

ikwu Geshọn, site na Geshọn,

ikwu Kohat, site na Kohat,

ikwu Merari, site na Merari.

58Ndị a sikwa nʼagbụrụ Livayị:

ikwu Libni,

ikwu Hebrọn,

ikwu Mahali,

ikwu Mushi, na

ikwu Kora.

(Kohat bụ nna nna Amram. 59Aha nwunye Amram bụ Jekobed, nwa nwa Livayị, onye a mụrụ nʼagbụrụ ndị Livayị nʼIjipt. Ọ mụtaara Amram ụmụ ndị a: Erọn na Mosis, na Miriam, nwanne ha nwanyị. 60Erọn mụtara Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama. 61Ma Nadab na Abihu nwụrụ mgbe ha chere ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị.)

62Ọnụọgụgụ ụmụ ndị ikom Livayị niile dị otu ọnwa gaa nʼihu dị iri puku abụọ na puku atọ (23,000). Ma a gụnyekọghị ọnụọgụgụ agbụrụ Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel, nʼihi na agbụrụ Livayị enweghị oke ọbụla mgbe e kenyere agbụrụ Izrel niile ihe nketa ha.

63Ya mere, ndị a bụ nchọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Izrel, dịka Mosis na Elieza onye nchụaja kwadobere gụọ na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko. 64Ma nʼetiti ndị a, o nweghị otu onye ọbụla Mosis na Erọn onye nchụaja gụrụ nʼọnụọgụgụ mgbe ha gụrụ ndị Izrel ọnụ nʼọzara Saịnaị. 65Nʼihi na Onyenwe anyị gwara ndị Izrel ahụ na ha ga-anwụ nʼime ọzara ahụ. Naanị ndị a hapụrụ ndụ bụ Kaleb, nwa Jefune, na Joshua nwa Nun.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Second Census on the Plains of Moab

  • This second military census was conducted by Moses and the high priest Eleazar on the plains of Moab across the Jordan from Jericho. It counted 601,730 men aged twenty and older who were able to serve in the army, and it provided the basis for dividing the promised land among the tribes by lot according to their size.Sources: the Bible text itself · Eleazar · Moab
  • The census marked a complete generational shift: of all the Israelites originally numbered at Mount Sinai, not a single man remained alive except for Caleb son of Jephunneh and Joshua son of Nun.Sources: the Bible text itself · Sinai
  • The Levites were counted separately from the rest of the tribes, numbering 23,000 males one month old and older. Because they were not allotted a territorial land inheritance among the other tribes of Israel, they were excluded from the general census.Sources: the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Jericho · Today: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · verses 3, 63
  • Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verses 3, 63
  • Moab · Today: Moab 2 · 31.840, 35.674 · verses 3, 63
  • Egypt · 30.129, 31.308 · verses 4, 59
  • Canaan · 32.767, 35.333 · verse 19
  • Wilderness of Sinai · Today: about 50 km around Jebel Musa · 28.540, 33.973 · verse 64

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.