Numbers 13
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Nledo ala Kenan
1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2“Ziga ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa legharịa anya nʼala Kenan, ala ahụ m na-enye Izrel. Ziga mmadụ iri na abụọ, otu onyendu site nʼebo Izrel ọbụla.”
3Ya mere, dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị, Mosis zipụrụ ha site nʼọzara Paran. Ha niile bụ ndị ndu nʼetiti ụmụ Izrel.
4Nke a bụ aha ha:
Site nʼebo Ruben, Shamua nwa Zakua,
5Shafat nwa Hori, onye si nʼebo Simiọn.
6Kaleb nwa Jefune, onye si nʼebo Juda.
7Igal nwa Josef, onye si nʼebo Isaka.
8Hoshea nwa Nun, onye si nʼebo Ifrem
9Palti nwa Rafu, onye si nʼebo Benjamin.
10Gadiel nwa Sodi, onye si nʼebo Zebụlọn.
11Gadi nwa Susi, onye sitere nʼebo Manase (ya bụ ebo Josef).
12Amiel nwa Gemali, onye si nʼebo Dan.
13Setua nwa Maikel, onye si nʼebo Asha.
14Nabi nwa Vofusi, onye si nʼebo Naftalị.
15Geuel nwa Maki, onye si nʼebo Gad.
16Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ Mosis zipụrụ inyocha ala ahụ. (Ọ bụ nʼoge a ka Mosis gbanwere aha Hoshea nwa Nun, ka ọ bụrụ Joshua.)
17Mosis zipụrụ ha ịga ledoo ala Kenan, ọ sịrị, “Gbagoonụ site nʼụzọ Negev gakwanụ nʼala ugwu ugwu. 18Letanụ otu ala ahụ dị. Chọpụtanụ ụdị ndị bi nʼime ya, ma ha dị ike ma ha bụ ndị na-adịghị ike, ma ha dị ọtụtụ ma ha dị ole na ole. 19Letanụ ụdị ala ha bi nʼime ya, ma ọ dị mma ma ọ jọrọ njọ. Chọpụtanụ ụdị obodo dị nʼebe ahụ, ma ha bụ obodo mgbidi na-adịghị gburugburu ha, ma ha bụ obodo e wusiri ike. 20Letanụ otu ala ahụ dị. Ọ na-epupụta ihe ka ọ bụ ala ụkpa? Letanụ ma ha nwere ọtụtụ osisi ka ọ bụ na osisi adịghị nʼime ya. Gbalịanụ ka unu weta ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi dị nʼala ahụ.” (Ọ bụ oge mkpụrụ mbụ nke osisi vaịnị.)
21Ya mere ndị a gara ledoo ala ahụ anya site nʼọzara Zin ruo na Rehob, nke dị nso na Lebo Hamat. 22Ha gara site na Negev rute Hebrọn, ebe Ahiman na Sheshai na Talmai, ụmụ ụmụ Anak bi. (Ma ewuru Hebrọn afọ asaa tupu e wuo obodo Zoan dị nʼIjipt.) 23Mgbe ha rutere Ndagwurugwu Eshkọl, ha gbutere otu alaka osisi vaịnị nke nwere ụyọkọ mkpụrụ vaịnị. Mmadụ abụọ butere ya nʼosisi tinyere ụfọdụ mkpụrụ osisi pomegranet na fiig. 24A kpọrọ ebe ahụ Ndagwurugwu Eshkọl, nʼihi ụyọkọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị Izrel gbutere nʼebe ahụ. 25Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi.
Akụkọ ndị nledo ala ahụ
26Ha lọtara bịakwute Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel, na Kadesh nke dị nʼọzara Paran. Ndị nledo ahụ kọrọ akụkọ otu ha si gaa nʼọgbakọ ụmụ Izrel niile. Gosikwa mkpụrụ osisi si nʼala ahụ. 27Nke a bụ akụkọ ha kọọrọ Mosis, “Anyị ruru nʼala ahụ ị sị anyị gaa leta. Ọ bụkwa ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ndị a bụ mkpụrụ osisi si nʼala ahụ. 28Ma ndị bi nʼobodo ahụ siri ike. Obodo ha buru ibu bụrụkwa nke e wusiri ike. Anyị hụkwara ụmụ ụmụ Anak nʼebe ahụ. 29Ndị Amalek bi na Negev, ndị Het na ndị Jebus na ndị Amọrait bi nʼala ugwu ugwu. Ma nʼakụkụ osimiri Mediterenịan na ndagwurugwu mmiri Jọdan ka ndị Kenan bi.”
30Ma Kaleb kwuru okwu mere ka obi sie ndị Izrel ike nʼoge a ha guzoro nʼihu Mosis sị ha, “Ka anyị gaanụ otu ihu nweta ala ahụ. Nʼihi na anyị nwere ike imeri ha.”
31Ma ndị nledo ahụ soro ya gaa zara sị, “Anyị enweghị ike ibu agha megide ndị a; ha dị ike karịa anyị.” 32Ndị a gbasara akụkọ ọjọọ nʼetiti ụmụ Izrel banyere ala ahụ ha gara ledoo. Ha sịrị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala na-eripịa ndị bi nʼime ya. Ndị niile anyị hụrụ nʼebe ahụ gbara nnọọ dimkpa 33Anyị hụrụ ndị Nefilim nʼebe ahụ (ndị bụ ụmụ ụmụ Anak, ndị sitere na ndị Nefilim). Nʼanya anyị, anyị dịka ụkpana nʼebe ha nọ, otu a ka anyị dịkwa nʼanya ha.”

Did you know?
Spying Out the Promised Land
- Moses sent twelve leaders representing the tribes of Israel from the Wilderness of Paran to scout the land of Canaan. The expedition explored the territory for forty days, traveling north from the arid Negev as far as Rehob toward Lebo-hamath.Sources: the Bible text itself · Paran · Negeb · Rehob
- At a valley called Eshcol, the scouts gathered specimens of the fertile land's harvest, including pomegranates, figs, and a single cluster of grapes so heavy that two men carried it on a wooden pole.Sources: the Bible text itself · Brook Eshcol
- Before dispatching the leaders, Moses gave Hoshea son of Nun the name Joshua. Upon returning, Caleb and Joshua encouraged Israel to take the land, while the other scouts reported with fear that the cities were fortified and inhabited by the tall descendants of Anak.Sources: the Bible text itself · Joshua · Caleb · Anak
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Canaan · 32.767, 35.333 · verses 2, 17
- Paran · 30.303, 34.777 · verses 3, 26
- Negeb · 31.245, 34.841 · verses 17, 22, 29
- Zin · Today: Zin Desert · 30.971, 35.325 · verse 21
- Egypt · 30.129, 31.308 · verse 22
- Hebron · Today: Tel Rumeida · 31.525, 35.102 · verse 22
- Zoan · Today: Tanis · 30.977, 31.880 · verse 22
- Amalek · 30.648, 34.422 · verse 29
- Great Sea · Today: Mediterranean Sea · 31.805, 34.170 · verse 29
- Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verse 29
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org