Matthew 8
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Ọgwụgwọ onye ekpenta
1Ọtụtụ mmadụ sooro Jisọs mgbe o si nʼugwu ahụ rịdata. 2Mgbe ha na-aga nʼụzọ, otu onye ekpenta bịakwutere ya kpọọ isiala nye ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
3O setịpụrụ aka ya, metụ ya sị, “Achọrọ m ka ị dị ọcha, dịrịkwa ọcha!” Ngwangwa, ekpenta ahụ lara. 4Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Hụ na ịgwaghị onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja onyinye dịka Mosis, nyere nʼiwu, ka ọ bụrụ ihe ama nye ya.”
Okwukwe nke onye ọchịagha
5Mgbe ọ banyere na Kapanọm, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ka o nyere ya aka. 6Ọ sịrị, “Onyenwe m, onye na-ejere m ozi dina nʼụlọ nʼoke ihe mgbu, akụkụ ahụ ya kpọnwụkwara akpọnwụ.”
7Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ m bịa gwọọ ya?”
8Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, ekwesighị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m. Naanị nọdụ nʼebe a, kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa onye na-ejere m ozi ike. 9Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a, ‘gaa.’ Ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ, ‘bịa.’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a.’ Ọ na-emekwa ya.”
10Mgbe Jisọs nụrụ okwu a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ so ya okwu sị, “Nʼezie, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ebe ọbụla; ọ bụladị nʼIzrel niile. 11Nʼezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ bịa soro Ebraham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nʼoriri nʼalaeze eluigwe. 12Ma ụmụ alaeze ahụ, ka a ga-atụpụ nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.”
13Jisọs gwara ọchịagha ahụ okwu sị ya, “Laa! E meerela gị dị ka okwukwe gị sịrị dị.” Ahụ dịrị onye ahụ na-ejere ya ozi mma nʼotu awa ahụ.
Jisọs agwọọ ndị ọrịa
14Mgbe Jisọs ruru nʼụlọ Pita, ọ chọpụtara na nne nwunye ya nwere ahụ ọkụ. 15Ọ metụrụ ya aka, ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya, o biliri malite ijere ya ozi.
16Nʼoge uhuruchi, ha kpọtaara ya ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. O ji okwu ọnụ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ niile, gwọọkwa ndị niile ahụ na-adịghị ike. 17Nke a bụ imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị,
“O bupụrụ nrịa nrịa anyị niile,
burukwa ọrịa anyị niile.”
Ihe ọ ga-efu iso Jisọs
18Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ dị ukwuu ndị gbara ya gburugburu, ọ nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gafee nʼofe nke ọzọ. 19Nʼoge ahụ, otu onye nʼetiti ndị na-ezi iwu bịakwutere ya sị ya, “Onye nkuzi, aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.”
20Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina. Ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ; ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe obibi.”
21Otu onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe m, aga m eso gị, kama kwere ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”
22Ma Jisọs zara sị ya, “Soro m ugbu a. Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha.”
Ebili mmiri adajụọ
23Mgbe ọ banyere nʼụgbọ, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya. 24Nʼotu ntabi anya, oke ifufe bidoro ife nʼọdọ mmiri ahụ, nke mere na ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ. Ma ọ nọ na-arahụ ụra mgbe ihe ndị a na-eme. 25Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya, kpọtee ya, sị ya, “Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee, na anyị nʼala nʼiyi.”
26Ma ọ zaghachiri, “Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?” Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii.
27O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru.”
Ọgwụgwọ ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu
28Mgbe o rutere nʼofe nke ọzọ nke obodo Gadarin, mmadụ abụọ ndị mmụọ ọjọọ si nʼebe a na-eli ozu zutere ya. Ha na-akpa ike nke ukwuu, na ọ dịkwaghị onye na-esite nʼụzọ ahụ agafe nʼihi ha. 29Ngwangwa, ha tiri mkpu bido na-ajụ ajụjụ sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Ọkpara Chineke? Ị gaghị echekwa eche ka oge ruo tupu ibido ịta anyị ahụhụ?”
30Igwe ezi nọ nʼakụkụ ebe ahụ na-akpa nri. 31Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya arịrịọ sị, “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nʼime ezi ndị a.”
32Ọ nyere ha iwu sị ha, “Ngwa, gaanụ!” Ha sitere nʼime mmadụ abụọ ahụ pụta banye nʼime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ kwa, ezi ndị ahụ niile gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ dabanyechaa nʼime mmiri ahụ. Ha nwụkwara nʼime ya. 33Ndị na-elekọta igwe ezi ndị ahụ gbapụrụ gbaga nʼime obodo kọọrọ ha ihe niile mere; tinyere ihe mere ndị ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu. 34Ya mere ndị niile nọ nʼobodo ahụ pụtara ịhụ Jisọs. Mgbe ha hụrụ ya ha rịọrọ ya sị ya pụọra ha nʼakụkụ obodo ha.

Did you know?
Healings, faith, and the sea
- Capernaum, which Jesus enters in this chapter, was a Galilean city not named in the Old Testament. Easton's Bible Dictionary (1897) says it became his “own city” after he left Nazareth, and it lists the centurion’s appeal and the healing at Peter’s house among the events set there.Sources: Capernaum · the Bible text itself
- Jesus says that many will come from east and west to share the banquet with Abraham, Isaac, and Jacob in the kingdom of heaven. Easton's Bible Dictionary (1897) calls Abraham the son of Terah and heir of the promises, Isaac Abraham’s only son by Sarah, and Jacob—also known as Israel—the younger twin son of Isaac and Rebekah.Sources: the Bible text itself · Abraham · Isaac · Jacob (Israel)
- Matthew presents that evening’s healings as fulfilling words spoken through the prophet Isaiah: “He took on our infirmities and carried our diseases.” Easton's Bible Dictionary (1897) identifies Isaiah as the son of Amoz, who prophesied in the reigns of Uzziah, Jotham, Ahaz, and Hezekiah.Sources: the Bible text itself · Isaiah
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Gadara · Today: Umm Qais · 32.656, 35.679 · verse 28
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org