Nations Bible

Luke 21

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Onyinye nwanyị dị ya nwụrụ

1Ọ leliri anya elu hụ ka ndị ọgaranya si etinye onyinye ha nʼime igbe onyinye. 2Ọ hụkwara otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ ka ọ bịara tinye naanị mkpụrụ ego kọpa abụọ. 3Ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, nwanyị ogbenye a di ya nwụrụ etinyela ego karịa ndị ọzọ niile. 4Nʼihi na ndị ọzọ niile nyere onyinye ha site nʼego mapụtaara ha nʼakụnụba ha, ma ya onwe ya sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o ji biri.”

Akara na-egosi ọgwụgwụ oge

5Mgbe ụfọdụ na-ekwu okwu banyere otu e si were nkume mara mma na onyinye e chere nʼihu Chineke, chọọ ụlọnsọ ukwu ahụ mma, ọ sịrị, 6“Ma banyere ihe ndị a, oge na-abịa mgbe ihe ndị a niile unu na-ahụ na-agaghị adịkwa. Ọ dịghị otu nkume a ga-ahapụ nʼelu ibe ya, a ga-akwatusị ha niile.”

7Ha jụrụ ya sị, “Onye ozizi, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama ga-egosi na ha na-aga imezu?”

8Ọ sịrị, “Lezienụ anya ka a ghara iduhie unu nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya,’ na-asịkwa na ‘Oge ahụ dị nso.’ Unu esokwala ha. 9Mgbe ọbụla unu nụrụ akụkọ agha dị iche iche na ọgbaaghara, ka ụjọ ghara ịtụ unu, ihe ndị a aghaghị ibu ụzọ mezuo, ma ọgwụgwụ oge erubeghị.”

10Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze. 11A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nʼebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe dị egwu na ihe ịrịbama dị ukwuu site na mbara eluigwe.

12“Ma tupu ihe ndị a niile emezuo, ha ga-ejide unu, kpagbukwaa unu. Ha ga-enyefe unu nʼaka ọtụtụ ụlọ ekpere. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-akpọpụkwa unu nʼihu ndị eze na ndị ọchịchị nʼihi aha m. 13Nke a ga-abụrụ unu ohere iji gbaa akaebe. 14Ma burunu ụzọ kpebie nʼobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu maka ihe unu ga-aza. 15Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide. 16Ọ bụladị ndị mụrụ unu, ụmụnne unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị ikwu unu na ndị enyi unu, ha ga-arara unu nye nʼaka ndị ọchịchị, ndị ga-egbukwa ụfọdụ nʼime unu. 17Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. 18Ma otu agịrị isi dị nʼisi unu agaghị ala nʼiyi. 19Unu ga-azọpụta ndụ unu site na ntachiobi unu.

20“Mgbe unu hụrụ ka ndị agha gbara Jerusalem gburugburu, matanụ na oge e ji ala ya nʼiyi eruola. 21Nʼoge ahụ ka ndị nọ na Judịa gbalaga nʼugwu, ka ndị nọ nʼime obodo si na ya pụta, ka ndị na-anọghị nʼobodo gharakwa ịba nʼime ya. 22Nʼihi na oge a ga-abụ oge ịbọ ọbọ ka e mezuo ihe niile akwụkwọ nsọ kwuru. 23Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ! A ga-enwe oke ihe mgbu nʼala a, iwe ga-adakwasịkwa ụmụ mmadụ. 24Mma agha ga-egbu ha, mba niile ga-adọrọkwa ha nʼagha. Ndị mba ọzọ ga na-azọtọsị Jerusalem nʼụkwụ ruo mgbe oge nke ndị mba ọzọ ahụ zuru.

25“A ga-enwe ihe ịrịbama nʼanyanwụ, nʼọnwa, na kpakpando. Nʼelu ụwa, mba niile ga-anọ nʼoke ahụhụ na mgbagwoju anya dị ka oke osimiri na-eme mkpọtụ, ebili mmiri ga na-ebilikwa. 26Ndị mmadụ ga-adakwa mba nʼobi nʼihi ụjọ mgbe ha ghọtara ihe gaje ịbịakwasị ụwa, nʼihi na a ga-eme ka ike niile nke dị nʼeluigwe maa jijiji. 27Nʼoge ahụ, a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼike na ebube nʼigwe ojii. 28Mgbe ihe ndị a malitere ime, guzoronụ ọtọ welie isi unu elu, nʼihi na oge mgbapụta unu dị nso.”

29Ọ tụụrụ ha ilu a, “Leenụ osisi fiig na osisi ndị ọzọ niile anya. 30Mgbe ha bidoro ipupụta ahịhịa ọhụrụ, unu na-amata na ọkọchị adịla nso. 31Nʼụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke adịla nso.

32“Nʼezie agwa m unu, ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo. 33Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.

34“Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya. 35Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa. 36Nọrọnụ na nche oge niile ma na-ekpekwanụ ekpere ka unu nwee ike ịgbanarị ihe niile gaje ịbịa, ka unu nweekwa ike iguzo nʼihu Nwa nke Mmadụ.”

37Kwa ụbọchị, ọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma nʼuhuruchi, ọ na-arịgoro nʼelu Ugwu Oliv ị ga nọọ ọnọdụ abalị. 38Ndị mmadụ niile na-abịakwute ya nʼisi ụtụtụ niile nʼụlọnsọ ukwu ịnụrụ okwu ya.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Jerusalem, the temple, and the days ahead

  • A geographical note says that the name Jerusalem is dual in the original and means “possession of peace” or “foundation of peace.” It adds that this form probably refers to the two mountains on which the city was built, Zion and Moriah, or, as some suppose, to the upper and lower city, and it calls Jerusalem a mountain city enthroned on a mountain stronghold. In this chapter Jesus says that city will be surrounded by armies, left desolate, and trodden down by the Gentiles.Sources: Jerusalem · the Bible text itself
  • Jesus tells those who are in Judea to flee to the mountains when they see Jerusalem surrounded by armies. A geographical note explains that, under the Romans in the time of Christ, Judea meant the southernmost of the three divisions of Palestine, distinguished from Galilee and Samaria, though the name was sometimes used for Palestine in general. As a province it included the territories of the tribes of Judah, Benjamin, Dan, Simeon, and part of Ephraim, and it formed part of Syria.Sources: Judea · the Bible text itself
  • The chapter opens not with armies but with a poor widow who puts two small copper coins into the temple treasury. Jesus says she has given more than the rich, who contributed from their surplus, because she put in all she had to live on. The disciples then remark on the beautiful stones and consecrated gifts of the temple, and he answers that not one stone will be left on another.Sources: the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 20, 21, 24
  • Judea · Today: Judea 1 · 31.777, 35.234 · verse 21
  • Mount of Olives · 31.778, 35.246 · verse 37

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.