Nations Bible

Luke 17

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Mmehie na okwukwe na ije ozi

1Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Ihe ndị nke na-eme ka mmadụ jehie aghaghị ịdị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla ọnọdụ ndị a ga-esi nʼaka ya bịa. 2Ọ ga-akara gị mma ka e kenye gị nkume igwe nri nʼolu, tụnye gị nʼime oke osimiri, karịa na ị ga-eduhie otu nʼime ụmụntakịrị ndị a ụzọ. 3Kpachapụrụnụ onwe unu anya!

“Ọ bụrụ na nwanna gị e mejọọ gị, baara ya mba. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya. 4Ọ bụrụkwa na o mejọọ gị ugboro asaa nʼotu ụbọchị, rịọkwa gị ugboro asaa sị, ‘E chegharịala m,’ ị ghaghị ịgbaghara ya.”

5Ndị ozi ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, mee ka okwukwe anyị dị ukwuu!”

6Onyenwe anyị zara, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ha ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị osisi ukwu a, Ka e site na mgbọrọgwụ hopu gị ma kụọkwa gị nʼime oke osimiri, ọ ga-erubere unu isi.

7“Ọ bụ onye nʼime unu nke nwere ohu onye si ebe ọ gara rụọ ọrụ maọbụ ịzụ atụrụ lọbata, ga-asị ya, ‘Mee ngwangwa nọdụ ala rie nri’? 8Ọ gaghị asị ya, ‘Siere m nri ọsịịsọ, kwadoo onwe gị jere m ozi ka m na-eri na aṅụkwa ihe ọṅụṅụ; emesịa ị ga-eri nri ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ nke gị’? 9Ọ ga-ekele ohu ahụ nʼihi na ọ rụrụ ọrụ o kwesiri ịrụ? 10Nʼotu aka ahụ, mgbe unu rụchara ọrụ niile unu kwesiri ịrụ, ihe unu ga-ekwu bụ, ‘Anyị bụ ụmụ ohu na-ekwesighị ekwesi, anyị emeela ihe anyị kwesiri ime.’ ”

Ọgwụgwọ ndị ekpenta iri

11Ka ọ na-aga Jerusalem, o sitere nʼụzọ dị nʼagbata Sameria na Galili. 12Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya. 13Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.”

14Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha.

15Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke. 16Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria.

17Jisọs jụrụ sị, “Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ? 18Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?” 19Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị.”

Ọbịbịa nke alaeze Chineke

20Ma mgbe ndị Farisii jụrụ ya sị, Olee mgbe alaeze Chineke ga-abịa? O kwuru, “Ọbịbịa alaeze Chineke agaghị a bụ nʼụzọ a ga-eji anya efu hụ ya. 21Ha agaghịkwa asị, ‘Lee, ọ nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘nʼebe ahụ,’ nʼihi nʼezie, alaeze Chineke nọ nʼetiti unu. ”

22Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Oge na-abịa mgbe ọ ga-agụsi unu agụụ ike ịhụ otu nʼime ụbọchị nke Nwa nke Mmadụ, ma unu agaghị ahụ ya. 23Ha ga-asị unu, ‘Lee, nʼebe ahụ,’ maọbụ, ‘Lee, nʼebe a,’ unu agala, unu esokwala ha. 24Nʼihi na Nwa nke Mmadụ nʼụbọchị ya ga-adị ka amụma nke eluigwe nke na-enye ìhè na mbara eluigwe site nʼotu ebe ruo nʼebe nke ọzọ. 25Ma ọ ghaghị ibu ụzọ hụọ ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ga-ajụkwa ya.

26“Dị ka ọ dị nʼụbọchị Noa, otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị Nwa nke Mmadụ. 27Ha nọ na-eri na-aṅụ, na-alụ nwunye na-ekekwa ụmụ ha di, ruo mgbe Noa banyere nʼụgbọ mmiri. Oke iju mmiri ahụ bịakwara laa ha nʼiyi.

28“Otu a ka ọ dịkwa nʼoge Lọt. Ha nọ na-eri, na-aṅụ, na-azụrịtakwa ahịa, na-akụ mkpụrụ, na-arụkwa ụlọ. 29Ma nʼụbọchị ahụ Lọt si nʼobodo Sọdọm pụta, ọkụ na nkume dị ọkụ sitere nʼeluigwe zoo ka mmiri, laa ha niile nʼiyi.

30“Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị a ga-eme ka Nwa nke Mmadụ pụta ìhè. 31Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ, ma ihe ya dị nʼime ụlọ, arịtukwala ịba nʼime ụlọ iburu ngwongwo ndị ahụ. Nʼotu aka ahụ, onye ọbụla nọ nʼubi, ya ghara ịlọghachita. 32Chetakwanụ nwunye Lọt. 33Onye ọbụla chọrọ iche ndụ ya nche ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla na-atụfu ndụ ya ga-echebe ya. 34Asị m unu, nʼanyasị ahụ mmadụ abụọ ga-edina nʼotu akwa, a ga-ewepụ otu nʼime ha hapụ onye nke ọzọ. 35Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ ọka nʼotu ebe, a ga-ewere otu ma hapụ nke ọzọ.” 36Ụmụ nwoke abụọ ga-anọ nʼubi, a ga-ewere otu onye hapụ nke ọzọ.

37Ha jụrụ ya sị, “Olee ebe, Onyenwe anyị?”

Ọ sịrị ha, “Ebe ọbụla ozu dị, ka udele na-ezukọta.”

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Ten lepers and the day of the Son of Man

  • Luke says that, on the way to Jerusalem, Jesus was passing between Samaria and Galilee when ten lepers met him as he entered a village. Easton's Bible Dictionary (1897) traces the name Samaria to Shomeron, a hill in the mountains of Israel that King Omri bought from Shemer and where he built his capital, and explains Galilee, meaning “circuit,” as a land long occupied by its original inhabitants and so called “Galilee of the Gentiles.” Of the ten who were healed, only a Samaritan returned, and Jesus called him a foreigner.Sources: the Bible text itself · Samaria · Galilee
  • Jesus says that the day of the Son of Man will be like the days of Noah, when people were eating and drinking, marrying and being given in marriage, until Noah entered the ark and the flood destroyed them all. Easton's Bible Dictionary (1897) explains the name Noah as “rest” and identifies him as the son of Lamech and the father of Shem, Ham, and Japheth.Sources: the Bible text itself · Noah
  • Jesus also recalls the days of Lot, when people were eating and drinking, buying and selling, planting and building, until the day Lot left Sodom and fire and sulfur rained down from heaven. Easton's Bible Dictionary (1897) explains the name Sodom as “burning” or “the walled” and places the city in the vale of Siddim, where it says fire from heaven destroyed it. In the same warning, Jesus tells anyone on a housetop or in a field not to turn back for possessions, and adds, “Remember Lot's wife!”Sources: the Bible text itself · Sodom

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Galilee · 32.760, 35.527 · verse 11
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verse 11
  • Samaria · Today: Samaria 2 · 32.276, 35.195 · verse 11

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.