Nations Bible

Leviticus 23

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Mmemme dị iche iche

1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka nye Onyenwe anyị, nke unu ga-ekwusa dịka mkpọkọta dị nsọ.

Ụbọchị izuike

3“ ‘Ụbọchị isii ka unu ga-eji rụọ ọrụ. Ma ụbọchị nke asaa, bụ ụbọchị izuike, ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, nʼebe ọbụla unu bi. Ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị.

Mmemme Ngabiga na Mmemme Achịcha na-ekoghị eko

4“ ‘Ndị a bụ mmemme Onyenwe anyị a kara aka, mkpọkọta dị nsọ nke unu ga-ekwusa nʼoge a kara aka. 5Nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa ahụ, nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ka Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị ga-adị. 6Mmemme achịcha na-ekoghị eko Onyenwe anyị ka unu ga-ebido nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa ahụ. Abalị asaa ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. 7Nʼụbọchị mbụ nke mmemme a, unu ga-enwe mkpọkọta dị nsọ, ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-arụ ọrụ ọbụla. 8Unu ga-eweta aja e sitere nʼọkụ chụọ nye Onyenwe anyị. Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.’ ”

Mmemme Mkpụrụ Mbụ

9Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, 10“Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-aga inye unu, ghọta mkpụrụ ihe ubi nke mbụ unu, unu ga-ewetara onye nchụaja otu ukwu ọka site nʼọka unu ghọtara nʼubi unu. 11Ọ ga-anara unu ukwu ọka ahụ fufee ya nʼihu Onyenwe anyị, ka a nabata ya. Ọ bụ nʼụbọchị ahụ ga-esote ụbọchị izuike ka onye nchụaja ga-efufe ya. 12Nʼotu ụbọchị ahụ e fufere ukwu ọka ahụ, unu ga-ewere nwa ebule na-enweghị ntụpọ, nke gbara naanị otu afọ, chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ. 13Aja mkpụrụ ọka ga-eso aja nsure ọkụ a. Ọ ga-eji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ a gwara mmanụ oliv, ka ọ bụrụ ihe e surere nʼọkụ na-esi ezi isi ọma nye Onyenwe anyị. A ga-enyekwa iko mmanya atọ dịka onyinye ihe ọṅụṅụ 14Unu agaghị eri achịcha, maọbụ ọka e ghere eghe, maọbụ ọka ọhụrụ tutu ruo mgbe unu buru ụzọ weta onyinye nye Chineke unu. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide ruo ọgbọ niile.

Mmemme Izu Asaa

15“ ‘Site nʼụbọchị ahụ sotere ụbọchị izuike, bụ ụbọchị ahụ unu wetara ukwu ọka nke onyinye mfufe, gụpụta izu asaa zuru ezu. 16Gụpụtakwa iri ụbọchị ise site nʼụbọchị izuike ahụ mezuru izu asaa ahụ ma wetara Onyenwe anyị onyinye ọka ọhụrụ. 17Site nʼebe ọbụla unu bi, unu ga-ewetara Onyenwe anyị ogbe achịcha abụọ nke unu ji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ, nke e ji ihe na-eko achịcha mee, ya bụ yiist, dịka aja mfufe nke mkpụrụ mbụ nye Onyenwe anyị. 18Tinyere achịcha a, unu ga-eweta ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, na otu nwa oke ehi, na ebule abụọ. Ha ga-abụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ya na aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ, aja e sitere nʼọkụ chụọ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị. 19Unu ga-ejikwa otu mkpi chụọ aja mmehie. Werekwa ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja udo. 20Onye nchụaja ga-efufe ụmụ atụrụ abụọ ndị a, na achịcha ndị si na mkpụrụ mbụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha bụ aja dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ọ bụkwa ndị nchụaja ga-ewere ha dịka nri ha. 21Nʼotu ụbọchị ahụ unu ga-akpọsakwa mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ ga-adịgide ebighị ebi site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile, nʼebe ọbụla unu bi.

22“ ‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ niile nke ubi unu. Hapụrụnụ ha ụmụ ogbenye, na ndị ọbịa. Hapụkwara ha mkpụrụ ubi niile dara nʼala. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”

Mmemme Opi

23Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 24“Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Ụbọchị mbụ nke ọnwa nke asaa ga-abụ ụbọchị izuike, ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nke a ga-eji opi na-ada oke ụda cheta. 25Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, kama unu ga-achụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.’ ”

Ụbọchị Mkpuchi Mmehie

26Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 27“Ụbọchị nke iri nke ọnwa asaa a bụ ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ọ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nye unu. Unu ga-ata onwe unu ahụhụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ. 28Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ nʼihi na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịchụ aja mkpuchi mmehie unu nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu. 29Onye ọbụla na-ejighị ụbọchị ahụ weda onwe ya nʼala ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya. 30Aga m ebibikwa onye ọbụla rụrụ ọrụ nʼụbọchị ahụ. 31Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide nye unu niile site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 32Ọ ga-abụ ụbọchị izuike zuruoke nye unu, unu ga-ewedakwa onwe unu nʼala. Nʼụbọchị nke itoolu nke ọnwa ahụ, site nʼuhuruchi ruo nʼuhuruchi nke na-esote ya, unu ga-edebe izuike unu.”

Mmemme Ụlọ Ikwu

33Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 34“Gwa ụmụ Izrel, ‘Nʼụbọchị nke iri na ise, nʼọnwa nke asaa, ka unu ga-amalite mmemme Ụlọ Ikwu Onyenwe anyị. A ga-eme ya ụbọchị asaa. 35Nʼụbọchị nke mbụ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ nʼụbọchị ahụ. 36Nʼụbọchị ọbụla nʼime ụbọchị asaa ndị a niile ka a ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ. Nʼụbọchị nke asatọ ka mkpọkọta dị nsọ ga-adị. A ga-achụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nʼụbọchị a. Ọ bụ mkpokọta mmechi, nʼihi ya, a gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.

37(“ ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka, mgbe a ga-ekwusa mkpọkọta dị nsọ maka iwetara Onyenwe anyị onyinye nri, ya bụ, onyinye aja nsure ọkụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na aja dị iche iche, na onyinye ihe ọṅụṅụ dịka e sị hazie na ọ ga na-adị kwa ụbọchị. 38Unu ga-enye onyinye ndị a, tinyere onyinye a na-enye Onyenwe anyị nʼụbọchị izuike, na tinyere onyinye ndị ọzọ unu na-enye na ihe ndị ọzọ unu kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu niile unu na-enye Onyenwe anyị.)

39“ ‘Ya mere, malite nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa asaa, mgbe unu webatasịrị ihe ubi unu, meerenụ Onyenwe anyị mmemme ụbọchị asaa, ụbọchị nke mbụ, na ụbọchị nke asatọ ga-abụ ụbọchị izuike. 40Nʼụbọchị nke mbụ, unu ga-ewere ụfọdụ mkpụrụ osisi dị mma nke si nʼosisi unu na-amị mkpụrụ, gbutekwa igu nkwụ, na alaka osisi nwere ahịhịa ndụ, na osisi pọpla, jiri ha mee mmemme obi ụtọ nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu ụbọchị asaa. 41Mmemme ụbọchị asaa a ga-adị nye Onyenwe anyị nʼafọ niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ unu niile. Ọ bụkwa nʼọnwa nke asaa ka unu ga-eme mmemme a. 42Nʼoge mmemme a, ụmụ Izrel niile ga-ebi nʼụlọ e ji alaka osisi na ahịhịa wuo ụbọchị asaa. Ụmụ afọ Izrel niile ga-ebi nʼụlọ dị otu a. 43Nke a ga-echetara ọgbọ ụmụ Izrel niile na mgbe m kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, unu biri nʼụlọ e ji osisi na ahịhịa wuo nʼọzara. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”

44Mosis gwara ụmụ Izrel ihe gbasara mmemme niile a kara aka nye Onyenwe anyị.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Appointed Festivals of the Lord

  • Leviticus 23 outlines Israel's sacred calendar, beginning with the weekly Sabbath of complete rest and detailing annual observances including Passover, the Feast of Unleavened Bread, Firstfruits, the Feast of Weeks, the Day of Atonement, and the Feast of Tabernacles.Sources: the Bible text itself
  • Alongside the harvest festivals, the law instituted a regular provision for social welfare by forbidding farmers from reaping to the very edges of their fields or collecting the gleanings, reserving them for the poor and foreign residents.Sources: the Bible text itself
  • During the seven-day Feast of Tabernacles, native-born Israelites were commanded to gather branches of palms, willows, and leafy trees to dwell in temporary booths, commemorating how their ancestors lived in shelters after being brought out of Egypt.Sources: the Bible text itself · Egypt

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Egypt · 30.129, 31.308 · verse 43

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.