Leviticus 20
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Ahụhụ nʼihi mmehie
1Onyenwe anyị sịrị Mosis, 2“Gwa ụmụ Izrel, ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa ọbụla bi nʼetiti unu, nke weere nwa ya nye maka ịchụrụ Molek aja, aghaghị ime ka ọ nwụọ. Ndị mmadụ ga-ewere nkume tugbuo ya. 3Mụ onwe m ga-emegide onye ahụ, bipụ ya site nʼetiti ndị ya, nʼihi na o merụọla ebe nsọ m, mee ka aha m gharakwa ịdị nsọ, site nʼiji ụmụ ya chụọrọ Molek aja. 4Ọ bụrụ na ndị obodo elezie anya mee omume dịka a ga-asị na ha amaghị ihe onye ahụ mere, hapụkwa igbu ya, mgbe o were otu nʼime ụmụ ya nye Molek, 5mụ onwe m ga-emegide onye ahụ na ezinaụlọ ya bipụ ha site nʼetiti ndị ya. Otu a kwa ka m ga-eme ya na ndị niile so ya merụọ onwe ha site nʼife arụsị Molek.
6“ ‘Aga m edo ihu m megide onye ọbụla gara jụọ ase site nʼaka mmụọ ọjọọ, maọbụ onye gara na dibịa afa gbaa afa, site nʼiso ha kwaa iko. Aga m ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.
7“ ‘Doonụ onwe unu nsọ, ma dịkwanụ nsọ nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu. 8Debenụ ụkpụrụ m niile, ma gbasoonụ ha nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo unu nsọ.
9“ ‘Onye ọbụla kọchara nne ya maọbụ nna ya ka a ga-egbu nʼihi na ọ kọchara nne na nna ya. Ọbara onye dị otu a ga-adịkwa ya nʼisi.
10“ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwoke ọzọ, ya bụ nwunye onye agbataobi ya, nwoke ahụ na nwanyị kwara iko ka a ga-egbu.
11“ ‘Nwoke ọbụla ya na nwunye nna ya dinakọrọ nwe mmekọ, emerụọla nna ya. A ga-egbu nwoke ahụ na nwanyị ahụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.
12“ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwa ya, wetara onwe ha ikpe ọmụma, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ọ bụ arụ ka ha mere.
13“ ‘Ọ bụrụ nwoke na nwoke ibe ya edinakọọ nwee ụdị mmekọ edina nwoke na nwanyị, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ihe ha mere bụ ihe rụrụ arụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.
14“ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwanyị na nne mụrụ ya, ajọ ihe ka ọ bụ. Nwoke ahụ na ndị inyom ndị ahụ ka a ga-akpọ ọkụ, ka ihe ọjọọ dị otu a hapụ ịdị nʼetiti unu.
15“ ‘Ọ bụrụ na nwoke na anụmanụ enwee mmekọrịta, a ga-egbu nwoke ahụ gbukwaa anụmanụ ahụ.
16“ ‘Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla abịaruo anụmanụ ọbụla nso dinakwuru ya inwe mmekọ, a ga-egbu nwanyị ahụ na anụmanụ ahụ, nʼihi na ha kwesiri ọnwụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.
17“ ‘Nwoke ọbụla ya na nwanne ya nwanyị nwere mmekọ edina, maọbụ nwa afọ nne ya maọbụ nwa nwunye nna ya, a ga-ekpochapụ ha site nʼihu ọha mmadụ nʼihi na ọ bụ ihe ihere dị ukwuu ka ha mere. Ọ merụọla nwanne ya, nʼihi ya ikpe ọmụma dị ya nʼisi.
18“ ‘Nwoke ọbụla nke ya na nwanyị nọ na nsọ nwanyị ya dinakọrọ nwee mmekọ ekpugheela adịghị ọcha nwanyị ahụ. Nwanyị ahụ nʼonwe ya ekpugheekwala adịghị ọcha nke ya. A ga-ebipụ ha abụọ site nʼetiti ndị ha.
19“ ‘Ị gaghị enwe mmekọ edina nʼetiti gị na nwanne nwanyị nne gị maọbụ nwanne nwanyị nna gị, nʼihi na nke a bụ ihe nleda anya nye onye ọbara jịkọrọ gị na ya. Ikpe ọmụma ga-adịrị unu abụọ.
20“ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla na nwunye nwanne nna ya edinaa, ọ bụ omume ileda anya nye nwanne nna ya. Ha ga-ebu mmehie ha. Ha ga-anwụ na-amụtaghị nwa.
21“ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwunye nwanne ya, ọ bụ omume rụrụ arụ, nʼihi na ọ bụ ihe nleda anya nye nwanne ya. Ha ga-agba aka nwa.
22“ ‘Debenụ iwu ndị a na ụkpụrụ ndị a, ma gbasoonụ ha ka ala ahụ m na-eduba unu nʼime ya hapụ imeghe ọnụ ya gbụpụ unu. 23Unu agbasola omenaala ndị mba niile a m na-achụpụ site nʼala m na-enye unu, nʼihi na ha na-eme ihe ndị a niile m nyere unu nʼiwu emela. Ọ bụ nke a mere ihe banyere ha ji sọọ m oyi. 24Ma agwala m unu sị, “Unu ga-eketa ala ha. Aga m enye ya unu ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kewapụtara unu doo unu iche site na mba ndị ọzọ niile.
25“ ‘Unu aghaghị ịkpa oke nʼetiti anụmanụ ndị dị ọcha iri eri, na anụmanụ ndị na-adịghị ọcha, na nʼetiti anụ ufe dị ọcha iri eri na ndị rụrụ arụ. Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ maọbụ anụ ufe, maọbụ ihe ọzọ na-akpụgharị nʼala, ndị ahụ m kewapụrụ iche dịka ihe rụrụ arụ. 26Unu ga-adị nsọ nye m, nʼihi na mụ, bụ Onyenwe anyị, dị nsọ. Ekewapụtala m unu, doo unu iche, site nʼetiti ndị mba ọzọ niile, ka unu bụrụ nke m.
27“ ‘A ga-eji nkume tugbuo nwoke maọbụ nwanyị ọbụla nke na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa nọ nʼetiti unu ka ọ nwụọ. Ọbara ha ga-adịkwa ha nʼisi.’ ”
Did you know?
Penalties for Unfaithfulness and Disobedience
- Molech was the national deity of the Ammonites, associated with the sacrifice of children by fire. Leviticus 20 strictly prohibits this practice, establishing the death penalty by stoning for any Israelite or resident foreigner who gave a child to Molech.Sources: Molech · the Bible text itself
- The prohibitions and penalties in this chapter are framed around the call to holiness and separation from the surrounding nations. Israel was commanded to keep these statutes and distinguish between clean and unclean animals so that the land would not reject them.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org