Joshua 8
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Mbibi Ai
1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla egwu, adakwala mba. Chịrị ndị agha gị niile gaa Ai, nʼihi na ugbu a, unu onwe unu ga-emeri ha. Aga m eme ka i merie eze ndị Ai, na ndị ya na obodo ya, na ala ya. 2Ị ga-emekwa obodo Ai na eze ya ihe i mere Jeriko na eze ya. Ma ihe dị iche na nke a bụ na unu ga-edebere onwe unu ihe niile unu kwatara nʼagha, ya bụ anụ ụlọ niile na ngwongwo obodo ahụ niile. Jikerenụ ibuso ha agha. Ọ bụkwa nʼazụ obodo ha ka unu ga-esi lụso ha agha.”
3Mgbe ahụ, Joshua na ndị agha ya niile, biliri gaa ibuso Ai agha. Joshua họpụtara iri puku ndị agha atọ zipụ ha nʼabalị 4o nyere ha iwu a, “Lee! Unu ga-aga zoo onwe unu nʼọhịa dị nʼazụ obodo Ai. Unu ezola onwe unu nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ, kama nọọnụ nso, nọọkwanụ na njikere. 5Mụ na ndị niile so m ga-abịaru obodo ahụ nso. Mgbe ha ga-apụta ịlụso anyị ọgụ dịka ha mere na mbụ, anyị ga-agbakwa ọsọ nʼihu ha, 6Ha ga-achụ anyị ọsọ, tutu ruo mgbe anyị mere ka ha niile hapụ nʼobodo ha pụta. Nʼihi nʼuche ha, ha ga-asị, ‘Ha na-agbara anyị ọsọ dịka ha mere na mbụ, bịanụ ka anyị chụọ ha ọsọ gbuo ha.’ Ya mere, dịka anyị na-agbapụ site nʼebe ha nọ, 7unu ga-esite nʼebe unu zoro onwe unu bilie, nweta obodo ahụ, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ya nʼaka unu. 8Mgbe unu weere obodo ahụ, unu ga-esunye obodo ahụ ọkụ. Meenụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Hụnụ na unu mezuru ihe ndị a m nyere unu nʼiwu.”
9Mgbe Joshua nyesịrị ha iwu ndị a, o zipụrụ ha. Ha hapụkwara nʼabalị ahụ gaa zoo onwe ha nʼọhịa dị nʼetiti Betel na ọdịda anyanwụ Ai. Ma Joshua na ndị agha ndị ọzọ fọdụrụ nọdụrụ nʼabalị ahụ nʼetiti ndị Izrel.
10Nʼisi ụtụtụ echi ya, Joshua chịkọtara ndị agha ya, ya na ndị ndu Izrel gara nʼihu ha, ruo Ai. 11Ndị agha niile ha na ya so, chere ihu ha gaa nso obodo ruo nʼihu ya. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu obodo Ai, ndagwurugwu bụ ihe kewara ha na obodo ahụ. 12Joshua chịịrị ihe ruru puku ndị agha ise, zoo ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ obodo ahụ, nʼetiti Betel na Ai. 13Ya mere, ndị agha were ọnọdụ ha nʼusoro, ndị ga-ebu agha nọ nʼakụkụ ugwu, ndị niile zoro onwe ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo ahụ. Ma nʼabalị ahụ, Joshua gara nọdụ na ndagwurugwu ahụ.
14Mgbe eze Ai hụrụ nke a, ya na ndị ikom obodo ahụ niile mere ngwangwa pụọ nʼisi ụtụtụ izute ndị Izrel nʼotu ebe, nke chere ihu nʼAraba. Ma ọ mataghị na o nwere ndị agha zubere imegide ya ndị zoro onwe ha nʼọhịa dị nʼazụ obodo. 15Joshua na ndị Izrel niile mere ka ha chụghachi ha azụ site nʼihu ha, ha gbara ọsọ na-aga akụkụ ọzara ahụ niile dịka ndị e meriri emeri. 16Nʼihi nke a, a kpọkuru ndị ikom niile nọ nʼime obodo Ai sị ha pụta bịa chụọ ụmụ Izrel ọsọ, ha chụrụ Joshua na-aga, e si otu a rapụta ha nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ. 17Ọ dịkwaghị otu onye nwoke nke fọdụrụ na Ai maọbụ na Betel. Ha hapụkwara obodo ahụ ka o ghere oghe, gaa ịchụ ndị Izrel ọsọ.
18Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ Joshua sị ya, “Setịpụ ùbe dị gị nʼaka nʼụzọ Ai, nʼihi na aga m enye gị obodo a.” Joshua mere dịka Onyenwe anyị gwara ya. 19Mgbe ndị agha ahụ zoro onwe ha nʼime ọhịa lere anya hụ na Joshua setịrị aka ya, ngwangwa, ha wụpụtara site nʼebe ha zoro onwe ha, gbara ọsọ gbaba nʼobodo Ai, merie ya, mụnye ya ọkụ.
20Ma mgbe ndị agha Ai lere anya nʼazụ, hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo ha na-alali elu, ha dara mba nʼime onwe ha. Ohere ọbụla adịghịkwa nye ha ịgbalaga gaa otu ụzọ maọbụ ụzọ ọzọ. Nʼihi na ndị Izrel ahụ buuru ụzọ gbaa ọsọ, ndị ahụ gbara na-aga nʼọzara, chigharịrị bido ịlụso ndị agha Ai ahụ na-achụ ha ọsọ ọgụ. 21Nʼihi na mgbe Joshua na ndị agha Izrel so ya lepụrụ anya hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo Ai na-arịgo elu, ha matara na ndị ha zoro onwe ha nʼọhịa abanyela obodo Ai, lụgbuo ya. Ya mere, Joshua na ndị agha so ya tụgharịrị bido igbu ndị agha obodo Ai. 22Ndị agha Izrel ahụ gara kpọọ obodo ahụ ọkụ pụtakwara, site nʼobodo ahụ, bido ịlụso ndị agha Ai ọgụ. Nke a mere ka ndị agha Ai nọdụ nʼetiti ụzọ ndị agha Izrel abụọ. Otu nʼihu ha, ndị nke ọzọ nʼazụ ha. Ya mere, ndị agha Izrel menyụrụ ha anya, gbuo ha, ruo na ọ dịkwaghị otu onye fọdụrụ nʼime ha, maọbụ onye gbapụrụ agbapụ. 23Naanị eze Ai ka e jidere na ndụ. A kpọtakwara ya bịaruo nʼebe Joshua nọ.
24Mgbe ndị agha Izrel gbusịrị ndị agha Ai niile nọ nʼọhịa na nʼọzara, ha lọghachiri azụ gbuo ndị niile fọdụrụ nʼime obodo ahụ. 25Ndị niile e gburu nʼụbọchị ahụ, ma nwoke ma nwanyị dị puku iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị niile nọ nʼobodo ahụ ka e gburu. 26Nʼihi na Joshua nọgidere setịpụ ùbe o ji nʼaka ya, megide obodo Ai, tutu e bibie ndị niile nọ nʼobodo ahụ kpamkpam. 27Ma ndị Izrel kwaara anụ ụlọ, na ihe nkwata nʼagha nke obodo ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị nyere Joshua nʼiwu si dị.
28Ya mere, Joshua kpọrọ obodo Ai ọkụ, mee ya ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu ruo taa. 29Ma Joshua kwụbara eze ndị Ai nʼelu osisi site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Mgbe anyanwụ dara, Joshua nyere iwu ka e wedata ozu eze Ai site nʼosisi ahụ, tụsa ya nʼihu ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Emesịa, ha tụkọtara ọtụtụ nkume nʼelu ya. Nkume ahụ ha tụkọtara dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
Ngụpụta akwụkwọ iwu nʼugwu Ebal
30Mgbe ahụ, Joshua wuuru Onyenwe anyị, Chineke Izrel ebe ịchụ aja nʼelu ugwu Ebal, 31dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ndị Izrel nʼiwu. O wuru ya dịka ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis si dị, ebe ịchụ aja a na-ejighị nkume a wara awa wuo, nkume a na-ejighị ngwa ọrụ igwe waa. Nʼelu ebe ịchụ aja a ka ha chụụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ na aja udo. 32Ma mgbe ndị Izrel nọ na-ele anya, Joshua depụtara iwu ndị ahụ Mosis nyere ha nʼelu nkume. 33Izrel niile, ha na ndị okenye ha, na ndị ọchịagha ha, na ndị ikpe ha, guzo nʼakụkụ abụọ nke igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na ncherita ihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị ndị na-ebu ya. Ma ndị ọbịa bi nʼetiti ha, ma ndị amụrụ nʼala ahụ nọ nʼebe ahụ. Ọkara nʼime ha gara guzo nʼakụkụ ugwu Gerizim, ọkara ndị ọzọ guzoro nʼakụkụ ugwu Ebal, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu na mbụ, na ha ga-agọzi ndị Izrel.
34Emesịa, Joshua gụpụtara na ntị ha, okwu niile nke iwu ahụ, ya na ngọzị na ọbụbụ ọnụ so ya, dịka ihe niile e dere nʼAkwụkwọ Iwu si dị. 35Iwu niile Mosis nyere ha ka Joshua gụpụtara na ntị ndị Izrel niile. Ndị inyom na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa niile bi nʼetiti ụmụ Izrel so nọkọọ nʼoge a ndị Izrel niile zukọrọ.

Did you know?
The Fall of Ai and the Covenant at Mount Ebal
- Ai was the second Canaanite city captured by Israel, located east of Bethel. Joshua used the rugged terrain to set an ambush of troops between Bethel and Ai, feigning a retreat to draw out the defenders before signaling his men to seize and burn the city.Sources: Ai · Bethel (of Palestine) · the Bible text itself
- Following the battle, Joshua built an altar of uncut stones on Mount Ebal, precisely following instructions written in the Law of Moses that forbade using iron tools on altar stones. Burnt offerings and peace offerings were sacrificed there, and a copy of the law was inscribed on the stones.Sources: Mount Ebal · Moses · the Bible text itself
- The entire community of Israel—including native citizens, resident foreigners, women, and children—gathered in the valley between Mount Ebal and Mount Gerizim. Positioned on either side of the Ark of the Covenant, they listened as Joshua read all the blessings and curses of the law.Sources: Mount Ebal · Mount Gerizim · the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Jericho · Today: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · verse 2
- Arabah · 30.417, 35.151 · verse 14
- Mount Ebal · 32.234, 35.273 · verses 30, 33
- Mount Gerizim · 32.199, 35.273 · verse 33
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org