Joshua 3
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Ngabiga osimiri Jọdan
1Nʼisi ụtụtụ, Joshua na ụmụ Izrel niile hapụrụ Shitim bịaruo nʼakụkụ osimiri Jọdan, maa ụlọ ikwu nʼebe ahụ. Nʼebe a ka ha nọ chere tutu ruo mgbe ha ga-agafe. 2Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ndịisi ụmụ Izrel gabigara jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ahụ, 3nye ha iwu sị, “Mgbe unu hụrụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ndị nchụaja, ụmụ Livayị, bulitere ya, unu onwe unu ga-esi nʼebe unu nọ bilie soro ha nʼazụ. 4Ma a ga-enwe oke nʼetiti unu na ha, ihe dịka otu kilomita site nʼebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị. Unu agaghị abịaru ya nso. Nke a bụ maka ị mara ụzọ unu ga-eso, nʼihi na unu esibeghị nʼụzọ a gaa ije mbụ.”
5Joshua gwara ndị Izrel sị, “Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na echi ka Onyenwe anyị ga-eme oke ihe ebube dị iche iche nʼetiti unu.”
6Joshua gwara ndị nchụaja sị ha, “Bulienụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, gabiga nʼihu ndị Izrel.” Ha buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bido ịga nʼihu ụmụ Izrel.
7Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị. 8Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’ ”
9Mgbe ahụ, Joshua gwara ụmụ Izrel niile sị, “Bịanụ nso, bịanụ nụrụ okwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu. 10Otu a ka unu ga-esi mata nʼezie na Chineke dị ndụ nọ nʼetiti unu, unu ga-amatakwa na ọ ghaghị ịnapụ ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Hiv, na ndị Periz, na ndị Gigash, na ndị Amọrait, na ndị Jebus ala ha nʼihu unu. 11Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile ga-agabiga nʼihu unu banye nʼime Jọdan. 12Ugbu a sitenụ nʼebo Izrel niile họpụta ndị ikom iri na abụọ, site nʼebo ọbụla otu onye. 13Ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile zọnyere ụkwụ na Jọdan, mmiri Jọdan nke si nʼebe elu ya na-arịdata ga-akwụsị ịsọ, guzoro dịka mgbidi.”
14Ya mere, mgbe ndị Izrel sitere nʼụlọ ikwu ha bilie njem ịgabiga osimiri Jọdan, ndị nchụaja bụ igbe ọgbụgba ndụ buuru ha ụzọ na-aga ha nʼihu. 15Nʼoge owuwe ihe ubi ọbụla, osimiri Jọdan na-etoju etoju, sọjukwaa akụkụ ya niile. Ma ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ a bịaruru nso zọnye ụkwụ ha nʼọnụ mmiri Jọdan, 16mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, ọ gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko. 17Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.

Did you know?
Crossing the Jordan River
- The biblical narrative notes that the Jordan overflowed all its banks during the harvest season, making the crossing an extraordinary challenge. The flow of water was arrested upstream as far as the city of Adam near Zarethan (about thirty miles north), cutting off the waters flowing south into the Salt Sea.Sources: the Bible text itself · Zarethan · Salt Sea
- Levitical priests carrying the ark of the covenant led the way into the Jordan, with the people commanded to maintain a distance of about two thousand cubits. The priests stood firm on dry ground in the middle of the riverbed until the entire nation finished crossing opposite Jericho.Sources: the Bible text itself · Jericho
- After serving as Moses' minister during the wilderness wanderings, Joshua was established as Israel's leader before the entire nation through this river crossing, fulfilling God's promise to be with him just as he was with Moses.Sources: the Bible text itself · Joshua · Moses
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verses 1, 8, 11, 13, 14, 15, 17
- Jericho · Today: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · verse 16
- Salt Sea · Today: Dead Sea · 31.500, 35.500 · verse 16
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org