Nations Bible

Jonah 4

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Iwe Jona nʼihi ọmịiko Onyenwe anyị

1Ma ihe a jọrọ Jona njọ nʼobi nke ukwuu, iwe ya dịkwa ọkụ. 2Nʼihi ya, o kpeere Onyenwe anyị ekpere sị, “O, Onyenwe anyị, nke a ọ bụghị ihe m kwuru, mgbe m nọ nʼala m? Ọ bụ ya mere m ji chọọ ịgbalaga na Tashish na mbụ nʼihi na amaara m na ị bụ Chineke onye na-eme amara, na onye jupụtara nʼobi ebere, na onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, nke bara ụba nʼịhụnanya, onye na-anaghị ata mmadụ ahụhụ dịka mmehie ya siri dị. 3Ugbu a, O, Onyenwe anyị napụ m ndụ m. Ọ ga-adị m mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ.”

4Ma Onyenwe anyị sịrị, “O ziri ezi na ị ga-esi otu a wee oke iwe dị ọkụ?”

5Mgbe ahụ, Jona si nʼebe ahụ pụọ jee nọdụ ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke obodo ahụ. O weere ahịhịa meere onwe ya ụlọ ndo, nọdụ nʼime ya, chere ka ọ hụ ihe gaje ime obodo ahụ. 6Ma Onyenwe anyị Chineke rọpụtara otu osisi nwere akwụkwọ sara mbara, nke tolitere nʼelu isi Jona, ka o ghọọrọ ya ndo ịnapụta ya nʼọnọdụ ahụ mgbakasị. Jona ṅụrịrị ọṅụ maka osisi ahụ. 7Ma nʼisi ụtụtụ echi ya, Chineke mere ka otu ikpuru pụta nke riri osisi ahụ site nʼogwe ya, si otu a mee ka ọ kpọnwụọ. 8O ruo, mgbe anyanwụ wara, Chineke mere ka ifufe na-ekpo ọkụ site nʼọwụwa anyanwụ, anyanwụ a chara Jona nʼisi nke ukwuu nke mere nʼike gwụsịrị ya. Ọ rịọrọ ka ọnwụ gbuo ya, na-asị, “ọ ga a kaara m mma na m nwụrụ anwụ, karịa na m dị ndụ.”

9Ma Chineke sịrị Jona, “Ọ bụ ihe ziri ezi ka i wee iwe maka osisi a?”

Ọ sịrị, “E, ana m ewe oke iwe, ọ bụladị na m chọrọ ịnwụ.”

10Mgbe ahụ Onyenwe anyị kwuru, “I nwere obi ebere nʼebe osisi a dị, nke ị na-akụghị na nke i mekwaghị ka o too, bụ nke toro nʼanyasị, nwụọkwa nʼanyasị. 11Mụ onwe m, m ga-aghara inwe obi ebere nʼahụ obodo ukwu a dịka Ninive, nke nwere ihe karịrị narị puku ndị mmadụ na iri puku mmadụ abụọ, bụ ndị na-amaghị nke bụ aka nri ha maọbụ aka ekpe ha, na nke ọtụtụ anụmanụ dịkwa nʼime ya?”

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Jonah's Anger and God's Compassion

  • Jonah admits that he originally attempted to flee toward Tarshish precisely because he knew God is gracious, compassionate, slow to anger, and relents from sending disaster. His distress arose when God chose to spare Nineveh rather than destroy it.Sources: the Bible text itself · Tarshish
  • Nineveh, the flourishing capital of the Assyrian empire, is described at the conclusion of the book as home to more than 120,000 people who cannot discern between their right and left hand, along with many cattle. God highlights this massive population to contrast divine compassion with Jonah's concern for a single withered plant.Sources: the Bible text itself · Nineveh

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Nineveh · 36.359, 43.153 · verse 11

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.