Nations Bible

John 8

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

1Ma Jisọs rigooro nʼUgwu Oliv.

2Nʼisi ụtụtụ echi ya, ọ bịara ọzọ nʼụlọnsọ ukwuu ebe ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya. Ọ nọdụrụ ala malite ikuziri ha ihe. 3Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile. 4Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko. 5Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?” 6Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo.

Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala. 7Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, “Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume.” 8Ọzọ, o hulatakwara ala malite ide ihe ọ na-ede nʼala.

9Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile nʼotu nʼotu, malite nʼonye okenye ha, sitere nʼebe ahụ pụọ. Nʼikpeazụ, ọ fọdụrụ naanị Jisọs na nwanyị ahụ, ebe o guzoro nʼihu ya. 10Jisọs guzoro ọtọ jụọ ya sị, “Nwanyị, oleekwanụ ha? Ọ dịghị onye mara gị ikpe?”

11Ọ sịrị, “O nweghị onye ọbụla Onyenwe anyị.”

Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe: Gawa, kama emehiekwala ọzọ.”

Jisọs ìhè nke ụwa

12Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.”

13Ndị Farisii sịrị, “Ị na-agbara onwe gị ama! Ya mere ama ị na-agbara onwe gị abụghị ezie.”

14Ma Jisọs zara sị, “A sịkwarị na mụ na-agbara onwe m ama, ama m na-agba bụ eziokwu. Nʼihi na-amara m ebe m si bịa, marakwa m ebe m na-aga. Ma unu aghọtaghị ebe m si bịa, maọbụ ebe m na-aga. 15Unu na-ekpe ikpe dị ka mmadụ; ma ekpeghị m onye ọbụla ikpe. 16Ma ọ bụrụ na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu nʼihi na ọ bụghị naanị m nọ, kama ọ bụ mụ na Nna m, onye zitere m. 17E dere nʼiwu unu sị, ‘ama mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’ 18Ana m agba ama banyere onwe m. Nna m, onye zitere m, na-agbakwa ama banyere m.”

19Mgbe ahụ ha jụrụ ya, “Olee ebe Nna gị nọ?”

Jisọs zara, “Unu amaghị m, unu amakwaghị Nna m. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.” 20Okwu ndị a niile ka o kwuru nʼụlọnsọ ukwu ha, mgbe ọ na-akụzi ihe na mpaghara ụlọ ahụ ebe a na-adọba onyinye. Ma ọ dịghị onye ọbụla jidere ya nʼihi na oge ya erubeghị.

Jisọs ekwuo banyere ọnwụ ya

21Ọzọ ọ gwara ha, “Aga m ahapụ unu, unu ga-achọ m, ma unu ga-anwụ nʼime mmehie unu. Ma unu apụghị ịbịa nʼebe m na-aga.”

22Nke a mere ka ndị Juu na-asị, “Ọ ga-egbu onwe ya? Ọ bụ ya mere o ji sị, ‘Ebe m na-aga unu apụghị ị bịa’?”

23Ma ọ sịrị ha, “Unu si nʼala ma esi m nʼelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa a. 24A sịrị m unu na unu ga-anwụ nʼime mmehie unu, naanị na unu kwenyere na mụ onwe m, bụ onye ahụ.”

25Ha jụrụ ya, “Onye ka ị bụ?”

Jisọs zara sị ha, “Abụ m onye ahụ m gwara unu na m bụ na mbụ. 26E nwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwu nʼikpe unu ikpe. Ma matanụ na onye ahụ zitere m bụ onye eziokwu. Nʼihi nke a, ihe niile m nụrụ site nʼọnụ ya ka m gwara ụwa.”

27Ọ bụ ihe banyere Nna ya ka ọ na-agwa ha, ma ha aghọtaghị ya. 28Ya mere Jisọs sịrị, “Mgbe unu weliri Nwa nke Mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-ama na mụ onwe m bụ ya. Unu ga-amatakwa na ọ dịghị ihe m na-eme nʼonwe m, kama, dị ka Nna m ziri m ka m na-ekwu ihe ndị a. 29Onye ahụ nke zitere m na-anọnyekwara m. Ọ hapụghịkwa m mgbe ọbụla, nʼihi na ọ bụ ihe na-amasị ya ka m na-eme mgbe niile.” 30Mgbe ọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na ya.

Ụmụ nke Ebraham

31Jisọs gwara ndị Juu ndị kwere na ya, “Ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwu m nʼezie unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m. 32Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”

33Ha zara ya, “Anyị bụ ụmụ Ebraham, o nwebeghị oge anyị ji bụrụ ohu onye ọbụla. Olee otu i si na-asị na a ga-eme ka anyị nwere onwe anyị?”

34Jisọs zara ha, “Nʼezie, nʼezie asị m unu, onye ọbụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie. 35Ohu enwekwaghị ọnọdụ mgbe ọbụla nʼezinaụlọ, ma ọkpara nwere ọnọdụ ruo ebighị ebi. 36Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu nʼezie, unu ga-abụ ndị nwere onwe unu. 37Ama m na unu bụ ụmụ ụmụ Ebraham, ma unu na-achọ igbu m nʼihi na okwu m enweghị ọnọdụ nʼime unu. 38Ana m ekwu ihe m hụrụ nʼebe Nna m nọ, ma unu na-eme ihe unu nụrụ site nʼaka nna unu.”

39Ha zara ya, “Ebraham bụ nna anyị.”

Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebraham, unu gara na-arụ ọrụ Ebraham rụrụ. 40Ma unu na-achọ igbu m, bụ onye gwara unu eziokwu ahụ m nụrụ nʼebe Chineke nọ. Ebraham emeghị otu a. 41Unu na-arụ ọrụ nna unu rụrụ.”

Ha sịrị ya, “Anyị abụghị ụmụ a mụrụ site nʼịkwa iko; naanị Chineke ya onwe ya bụ otu Nna anyị nwere.”

Ụmụ nke Ekwensu

42Jisọs gwara ha, “Ọ bụrụ nʼezie na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m nʼanya, nʼihi na ọ bụ Chineke zitere m. Abịaghị m site nʼike aka m. 43Gịnị mere unu adịghị aghọta ihe m na-ekwu? Ọ bụ na unu enweghị ike ịnabata okwu m. 44Unu bụ ụmụ nke nna unu ekwensu. Uche unu bụ imezu ihe nke nna unu na-achọ. Ọ bụ ogbu ọchụ site na mbụ. Ọ dịghị ejigide eziokwu nʼihi na eziokwu adịghị nʼime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọdịdị ya sịrị dị, nʼihi na ọ bụ onye ụgha bụrụkwa nna nke ụgha. 45Ma nʼihi na m na-ekwu eziokwu, ọ bụ ya mere unu ekwenyeghị na m. 46O nwere onye nʼime unu pụrụ ịtụ m mmehie m nʼihu? Ọ bụrụ na m na-ekwu eziokwu, gịnị mere unu ekwenyeghị na m? 47Onye ọbụla sitere na Chineke na-anụ ihe Chineke na-ekwu. Ihe kpatara unu adịghị anụ bụ maka unu abụghị ndị nke Chineke.”

Jisọs na Ebraham

48Ndị Juu zara sị, “Anyị e kwughị eziokwu mgbe anyị sịrị na ị bụ onye Sameria, na mmụọ ọjọọ bikwa nʼime gị?”

49Jisọs zaghachiri, “Mmụọ ọjọọ ọbụla adịghị nʼime m, kama ana m asọpụrụ Nna m, ma unu adịghị asọpụrụ m. 50Anaghị m achọ otuto nke onwe m, kama ọ dị onye nke na-achọ ya. Ọ bụkwa ya bụ onye ikpe. 51Nʼezie, nʼezie, agwa unu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ọzọ.”

52Mgbe ahụ ndị Juu sịrị ya, “Anyị maara ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nʼime gị. Ebraham nwụrụ anwụ ya na ndị amụma, ma gị onwe gị na-asị na onye ọbụla kwere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi. 53Ị dị ukwuu karịa nna anyị Ebraham? Ọ nwụrụ, ma ndị amụma nwụkwara. Onye ka ị na-eche na ị bụ?”

54Jisọs zara, “Ọ bụrụ na m etoo onwe m, otuto m bụ ihe efu, Nna m, onye unu na-asị na ọ bụ Chineke unu, bụ onye na-eto m. 55Amaara m onye ọ bụ nʼagbanyeghị na unu amaghị ya. Aga m abụ onye ụgha ma ọ bụrụ na m ga-asị na-amaghị m onye ọ bụ. Amaara m ya na-edebekwa okwu ya. 56Nna unu Ebraham ṅụrịrị ọṅụ mgbe o chetara na ọ ga-ahụ ụbọchị m; ọ hụrụ ya ma ṅụrịakwa ọnụ.”

57Ndị Juu sịrị ya, “Ị gbabeghị iri afọ ise ma ị hụla Ebraham?”

58Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, tupu amụọ Ebraham, mụ onwe m nọ ya.” 59Ya mere, ha tụtụlitere nkume ịtụ ya, ma Jisọs zoro onwe ya, sitekwa nʼụlọnsọ ukwuu ahụ pụọ.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Light, Law, and Abraham

  • John 8 opens as Jesus goes to the Mount of Olives and returns early in the morning to the temple courts, where he sits and teaches the people who gather. The Mount of Olives is a ridge east of Jerusalem, separated from the city by the Kidron valley and named for the olive trees that cover its sides.Sources: the Bible text itself · Mount of Olives
  • Scribes and Pharisees bring in a woman caught in adultery and ask Jesus what he says about Moses' command in the Law to stone such a woman, seeking to test him and to gain a basis for accusing him. Still in the temple courts, near the treasury, Jesus later says, "I am the light of the world." A dated event list places both episodes in AD 29, each lasting one day.Sources: the Bible text itself · Woman Caught in Adultery · Light of the World/I am discourse
  • When Jesus says that the truth will set them free, his hearers answer that they are Abraham's descendants and have never been slaves to anyone. Abraham is called "father of a multitude"; he was the son of Terah and the heir of the promises. After Jesus declares, "before Abraham was born, I am," they pick up stones to throw at him.Sources: the Bible text itself · Abraham

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Mount of Olives · 31.778, 35.246 · verse 1

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.