John 15
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Ezi osisi vaịnị na alaka ya
1“Mụ onwe m bụ ezigbo osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye ọrụ ubi. 2Ọ na-egbuda alaka ọbụla dị nʼime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọbụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-egbucha, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ. 3Ugbu a, e meela ka unu dịrị ọcha nʼihi okwu m gwara unu. 4Nọgidenụ nʼime m, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime unu. Dịka alaka ọbụla apụghị ịmị mkpụrụ nʼonwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nʼosisi vaịnị. Otu a, unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị nʼime m.
5“Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ; unu bụkwa alaka ya. Onye ọbụla na-anọgide nʼime m, nke mụ onwe m na-anọgidekwa nʼime ya, na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Nʼihi na ewezuga m, unu enweghị ike ime ihe ọbụla. 6Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼime m dị ka alaka e gbuturu, tụpụ ya, ọ kpọnwụọ. A ga-achịkọta ya, chịnye ya nʼọkụ, o repịa. 7Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya. 8Nke a ga-abụrụ Nna m otuto na unu mịrị ọtụtụ mkpụrụ hie nne, ọ na-egosikwa na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.
9“Dị ka Nna sị hụ m nʼanya, otu a ka m sị hụkwa unu nʼanya. Ya mere, nọgidenụ nʼime ịhụnanya m. 10Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya. 11Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m dịrị nʼime unu ka ọṅụ unu zukwaa oke. 12Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya. 13Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya. 14Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere nʼiwu. 15Anaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nʼihi na ohu adịghị amatazu ihe niile onyenwe ya na-eme. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nʼihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ nʼọnụ Nna m. 16Ọ bụkwaghị unu onwe unu họọrọ m. Ọ bụ m họọrọ unu, wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgidekwa. Ya mere, Nna m ga-enye unu ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼaha m. 17Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya.
Ụwa kpọrọ ha asị
18“Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị. 19A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị. 20Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’ Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu. 21Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m. 22Ọ bụrụ na abịaghị m, gwa ha okwu, ikpe mmehie agaraghị ama ha. Ma ugbu a, ha enweghị ngọpụ ọbụla banyere mmehie ha. 23Onye ọbụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị. 24A sị na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọbụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu a ha ahụzuola ọrụ ebube ndị a niile, ma ha nọgidekwara na-akpọ mụ na Nna m asị. 25Nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ iwu ha. ‘Ha kpọrọ m asị na-enweghị ihe m mere.’
Ọrụ Mmụọ nsọ na-arụ
26“Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m. 27Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite.

Did you know?
The True Vine, Friendship, and the World
- In this chapter Jesus calls himself the true vine and his Father the keeper of the vineyard. Branches that bear no fruit are cut off, while branches that do bear fruit are pruned so they become even more fruitful. He says no branch can bear fruit unless it remains in the vine, and that apart from him his hearers can do nothing.Sources: the Bible text itself
- Jesus tells his hearers that he no longer calls them servants, because a servant does not understand what his master is doing. He calls them friends, because he has made known to them everything he learned from the Father. He also says they did not choose him; he chose them and appointed them to bear fruit that will remain.Sources: the Bible text itself
- Jesus says the world hates those he has chosen out of the world, and that it hated him first. He recalls a word he had already spoken, “No servant is greater than his master,” and says this hatred fulfills what is written in their Law: “They hated Me without reason.” He also promises the Advocate, the Spirit of truth who proceeds from the Father, who will testify about him.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org