Nations Bible

John 13

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Jisọs asaa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya

1Tupu oge Mmemme Ngabiga eruo, Jisọs amatala na oge ọ ga-ahapụ ụwa lakwuru Nna ya eruola. Ọ hụrụ ndị nke ya nọ nʼụwa nʼanya, hụkwa ha nʼanya ruo ọgwụgwụ.

2Mgbe a na-eri nri anyasị, ekwensu etinyelarị ya nʼime obi Judas Iskarịọt, nwa Saimọn ka ọ rara ya nye. 3Jisọs matara na Nna enyefeela ya ihe niile nʼaka. Ọ maara na ya si nʼebe Chineke nọ bịa, matakwa na ya ga-alaghachikwuru Chineke. 4Ya mere, o sitere nʼoche ọ nọkwasịrị bilie ọtọ, yipụ uwe nke elu ya, chiri akwa mmiri e ji ehicha ahụ kee nʼukwu ya. 5Ọ wụnyere mmiri nʼime efere ịsa aka, bido ịsa ndị na-eso ụzọ ya ụkwụ, jirikwa akwa mmiri ahụ o kere nʼukwu ya na-ehicha ụkwụ ha.

6Ọ bịakwutere Saimọn Pita, onye sịrị ya, “Onyenwe m, ị ga-asa m ụkwụ?”

7Ma Jisọs zara sị ya, “Ị ghọtaghị ihe m na-eme ugbu a, ma emesịa ị ga-aghọta ya.”

8Pita sịrị ya, “Ị gaghị asaa m ụkwụ ma ọlị.”

Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na m asachaghị gị ụkwụ, mụ na gị enweghị oke ọbụla.”

9Saimọn Pita sịrị ya, “Onyenwe m, ọ bụghị naanị ụkwụ m ka ị ga-asa, kama saakwa aka m na isi m.”

10Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla sara ahụ agaghị asakwa ya ọzọ, ọ bụ naanị ịsa ụkwụ ya dịrị ya nʼihi na ahụ ya niile dị ọcha. Unu dị ọcha, kama ọ bụghị unu niile.” 11Nʼihi na ọ maararị onye ahụ ga-arara ya nye. Ya mere o ji sị, “Ọ bụghị unu niile dị ọcha.”

12Mgbe ọ sachasịrị ha ụkwụ, o yiiri uwe ya, nọdụkwa ala ọzọ, ọ sịrị ha, “Unu ghọtara ihe m meere unu? 13Unu na-akpọ m Onyenwe unu na Nna unu ukwu, unu mere nke ọma nʼihi na nke a ka m bụ. 14Ebe ọ bụ na mụ onwe m, bụ Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu. 15Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu. 16Nʼezie, nʼezie, ohu adịghị adị ukwuu karịa nna ya ukwu, maọbụ onye e ziri ozi a karịa onye ziri ya ozi. 17Ọ bụrụ na unu a mara ihe ndị a, ngọzị ga-adịrị unu ma unu mee ha.

Jisọs agbaa ama maka mgba okpuru ya

18“Anaghị m ekwu maka unu niile, amaara m ndị m họpụtara. Ma nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ‘Onye mụ na ya na-erikọ nri ebiliela megide m.’

19“Ana m agwa unu ugbu a tupu ihe ndị a emee, ka unu kwere na mụ bụ ya mgbe ọ ga-emezu. 20Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla nabatara onye m zitere nabatara m. Onye ọbụla nabatara m nabatakwara onye zitere m.”

21Mgbe Jisọs kwusiri ihe ndị a, o nweghị udo nʼime mmụọ ya. Ọ gbara ama sị, “Nʼezie, nʼezie, a sị m unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.”

22Ndị na-eso ụzọ ya lerịtara onwe ha anya na-eche nʼime obi ha onye ọ na-ekwu maka ya. 23Otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya dabere ya nso. 24Saimọn Pita fufeere ya isi, ka ọ, Jụọ ya onye ọ na-ekwu maka ya.

25Ebe ọ dabere Jisọs nso, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, onye ka ọ bụ?”

26Jisọs zara, “Ọ bụ onye ahụ m ga-enye iberibe achịcha a mgbe m sunyere ya nʼime efere nri.” Mgbe o sunyesịrị achịcha ahụ nʼime efere ahụ, o nyere ya Judas nwa Saimọn Iskarịọt. 27Mgbe ọ narasịrị iberibe achịcha ahụ, ekwensu bara nʼime ya.

Jisọs sịrị ya, “Ihe ọbụla ị chọrọ ime, mee ya ngwangwa.” 28Ma ọ dịghị onye ọbụla so nọrọ nʼoche nri ghọtara ihe mere o ji gwa ya otu a. 29Nʼihi na ụfọdụ na-eche, ebe Judas ji akpa ego ha, Jisọs na-asị ya ka ọ gaa zụta ihe ndị dị mkpa maka mmemme, maọbụ ka ọ gaa nye ndị ogbenye ihe. 30Mgbe ọ natachara iberibe achịcha ahụ, ọ pụrụ na-atụfughị oge, ọchịchịrị agbaala.

Jisọs agbaa ama na Pita ga-agọnarị ya

31Mgbe ọ pụrụ, Jisọs sịrị, “Ugbu a ka a na-enye Nwa nke Mmadụ otuto, a na-enyekwa Chineke otuto nʼime ya. 32Ọ bụrụ na e nye Chineke otuto nʼime ya, Chineke ga-enyekwa Ọkpara ya otuto nʼime onwe ya, ọ ga-enyekwa ya otuto ahụ ngwangwa.

33“Ụmụntakịrị m, enwere m oge ntakịrị nke mụ na unu ga-anọ. Unu ga-achọ m, ma dị ka m gwara ndị Juu ka m na-agwa unu ugbu a. Ebe m na-aga unu enweghị ike ịbịa ya.

34“Ana m enye unu iwu ọhụrụ: Hụrịtanụ onwe unu nʼanya. Dị ka m hụrụ unu nʼanya, otu a ka unu ga-esi hụrịta onwe unu nʼanya. 35Ọ bụrụ na unu ahụrịta onwe unu nʼanya, otu a ka mmadụ niile ga-esi mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.”

36Saimọn Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị ebee ka ị na-aga?”

Jisọs zaghachiri ya, “Ebe m na-aga, i nweghị ike iso m gaa ya ugbu a. Ma ị ga-abịa ma emesịa.”

37Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị, gịnị mere na m apụghị isoro gị ugbu a? Aga m atọgbọ ndụ m nʼihi gị.”

38Jisọs zaghachiri, “I jikeere ịtọgbọ ndụ gị nʼihi m? Nʼezie, nʼezie, asị m gị, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

John 13: Love to the End

  • The disciple who leaves to betray Jesus is Judas, son of Simon—not Simon Peter, but another Simon named as Judas's father—called Iscariot. Easton's Bible Dictionary (1897) explains that surname as meaning a man of Kerioth, and notes that his name stands last in the apostle lists of the first three Gospels. He kept the money bag, so when Jesus told him to do quickly what he was about to do, some at the table thought Jesus was telling him to buy what was needed for the feast or to give something to the poor.Sources: the Bible text itself · Judas Iscariot · Simon
  • The chapter uses both 'the devil' and 'Satan' for the one behind Judas's betrayal: the devil had already put betrayal into his heart, and after he took the dipped morsel, Satan entered into him. Easton's Bible Dictionary (1897) says that Satan means adversary or accuser, and that in the New Testament the name is used interchangeably with Diabolos, or the devil, more than thirty times.Sources: the Bible text itself · Satan
  • Simon Peter, who first refuses to let Jesus wash his feet and then asks to have his hands and head washed as well, was originally called Simon, which Easton's Bible Dictionary (1897) equates with Simeon, meaning 'hearing.' He was a fisherman from Bethsaida, on the western coast of the Sea of Galilee. Later in the chapter he promises to lay down his life for Jesus, who tells him that before the rooster crows he will deny him three times.Sources: the Bible text itself · Simon Peter

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.