Nations Bible

Jeremiah 9

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

1Ọ gaara adị m mma ma a sị na isi m bụ isi iyi, ebe mmiri si asọpụta;

ọ gaara adị m mma ma a sịkwa na anya mmiri akwa jupụtara m nʼanya.

Agaara m akwagide akwa ehihie na abalị

nʼihi ndị m niile e gburu egbu.

2Ọ gaara adị m mma

ma a sị na m nwere ụlọ ndị ije e wuru nʼime ọzara.

Ka m nwee ike hapụ ndị m

site nʼebe ha nọ pụọ.

Nʼihi na ha niile bụ ndị na-akwa iko,

igwe ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.

3“Ha na-ekwe ire ha dịka ụta,

ịgbapụ okwu ụgha dịka àkụ;

Ọ bụghị site nʼeziokwu

ka ihe ji agara ha nke ọma nʼala ahụ.

Ha na-esite nʼotu mmehie gaa nʼọzọ;

ọ dịkwaghị mgbe ha ji mara m,”

otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

4“Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ.

Atụkwasịkwala nwanne gị obi.

Nʼihi na nwanne ọbụla na-aghọ aghụghọ.

Ndị enyi niile bụkwa ndị nkwutọ.

5Enyi na-aghọgbu enyi ya,

ọ dịkwaghị onye na-agwa ibe ya eziokwu.

Ha azụọla ire ha ikwu naanị okwu ụgha;

ha emeekwala ka ike gwụ anụ ahụ ha ime mmehie.

6I bi nʼetiti aghụghọ.

Ha jụkwara ịmara m nʼime aghụghọ ha.”

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

7Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,

“Lee, aga m anụcha ha, nwaa ha ọnwụnwa.

Gịnị ọzọ ka m kwesiri ime

nʼihi mmehie ndị m?

8Ire ha na-egbu dịka àkụ.

Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta.

Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo,

ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.”

9Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị,

“M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?

M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ

megide mba dị otu a?”

10Aga m anọ nʼelu ugwu ukwu kwa akwa.

Nʼebe ahụ ka m ga-anọ kwaa ụwa m nʼihi ebe ịta nri nke anụmanụ ndị ahụ dị nʼọzara.

Ha tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịghị onye na-ejegharị nʼime ya.

A naghị anụkwa olu anụ ụlọ nʼebe ahụ.

Ụmụ nnụnụ efefusịala.

Otu a kwa, ụmụ anụmanụ alaala.

11“Aga m eme ka Jerusalem ghọọ ebe a na-awụfu unyi.

Ọ ga-aghọ ebe nkịta ọhịa na-awagharị na-achọ nri.

Aga m ekposa obodo niile nke Juda.

Ọ dịkwaghị onye ga-ebi na ya.”

12Olee onye ahụ maara ihe, nke nwere ike ịghọta ihe ndị a niile? Onye ka Onyenwe anyị ziri ihe ndị a, nke ga-akọwa ya? Gịnị mere e ji bibie ala a, kposaa ya, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka ọzara mmadụ na-enweghị ike ịgafe?

13Onyenwe anyị kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ha agbakụtala iwu ahụ m nyere ha idebe azụ. Ha jụrụ irubere m isi, jụkwa ịgbaso iwu m. 14Kama, ha na-agbaso isiike nke obi ha, ha gbasoro chi Baal dịka nna nna ha si kuziere ha.” 15Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel kwuru, “Lee, aga m eme ka ndị a rie nri na-akụ ilu. Ha ga-aṅụkwa mmiri e tinyere nsi. 16Aga m ekposa ha na mba niile nke ụwa. Ha ga-ebi na mba nke ha na nna ha na-amaghị. Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m bibiri ha niile.”

17Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,

“Tụgharịanụ uche unu ugbu a. Kpọọnụ ụmụ nwanyị ndị ọrụ ha bụ ịbụ abụ akwa.

E, zienụ ozi ka ndị ọkachamara nʼetiti ha bịa.

18Ha bịa ngwangwa

kwaa akwa nʼihi anyị,

tutu anya mmiri akwa ejupụta ha nʼanya,

tutu anya mmiri akwa esite anyị nʼanya na-asọda ruo na ntị anyị.

19Olu ụzụ ịkwa akwa ka a nụrụ site na Zayọn

‘Lee ka anyị si laa nʼiyi!

Lee ka ihe ihere anyị si dị ukwuu!

Nʼihi na anyị hapụrụ ala anyị,

nʼihi na ha etikpọsịala ebe obibi anyị niile.’ ”

20Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị,

megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ.

Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa,

kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa.

21Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị

bata nʼebe niile e wusiri ike nke ala anyị.

O gbuola ụmụntakịrị ndị na-ejegharị nʼokporoụzọ,

gbukwaa ụmụ okorobịa ndị na-anọ nʼama.

22Gwa ha, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,

“ ‘Ozu ndị nwụrụ anwụ ga-atọgbọrọ

dịka unyi e kpofuru nʼọhịa,

dịka ukwu ọka nke e gbuturu nʼazụ onye na-aghọ mkpụrụ ubi,

nke ọ dịghị onye ga-achịkọta ha.’ ”

23Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Ka onye maara ihe hapụ ịnya isi nʼihi amamihe ya,

ka onye dị ike ghara ịnya isi nʼihi ịdị ike ya,

ka ọgaranya hapụkwa ịnya isi nʼihi ịba ụba nke akụ ya,

24kama, onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa isi nʼihi nke a:

na o nwere uche ịghọta na mụ onwe m bụ,

Onyenwe anyị nke na-eme obi ebere,

na-ekpe ikpe ziri ezi na ezi omume nʼụwa.

Nʼihi nʼihe ndị a ka m na-enwe obi ụtọ,”

ka Onyenwe anyị kwubiri.

25“Lee, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata ndị ahụ niile nke e biri ugwu naanị nʼanụ ahụ ha ahụhụ. 26Ya bụ ndị Ijipt, Juda, Edọm, Amọn, na Moab, na ndị ahụ niile bi nʼọzara nʼebe dị anya. Nʼihi na, nʼezie, mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị ugwu. Ọ bụladị ụlọ Izrel niile bụ ndị a na-ebighị ugwu nʼime obi ha.”

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

A Lament over Deceit and Ruin

  • In ancient Near Eastern culture, skilled professional mourning women were summoned during major calamities and funerals to lead communal laments and teach dirges to the next generation.Sources: the Bible text itself
  • The passage warns against boasting in human wisdom, military power, or material riches, presenting the true knowledge of God—characterized by loving devotion, justice, and righteousness—as the only legitimate ground for confidence.Sources: the Bible text itself
  • The chapter groups Judah with its regional neighbors—Egypt, Edom, Ammon, and Moab—warning that external religious marks like physical circumcision offer no protection if the heart remains uncircumcised and disobedient.Sources: the Bible text itself · Edom · Ammon · Moab

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verse 11
  • Zion · Today: Jerusalem · 31.777, 35.234 · verse 19
  • Ammon · 31.955, 35.934 · verse 26
  • Edom · 30.746, 35.604 · verse 26
  • Egypt · 30.129, 31.308 · verse 26
  • Moab · Today: Moab 1 · 31.181, 35.701 · verse 26

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.