Jeremiah 43
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
1Mgbe Jeremaya gwasịrị ndị ahụ niile okwu ahụ Onyenwe anyị Chineke ha ziri ya ka o zie ha, 2Azaraya nwa Hoshaya, Johanan nwa Kariya na ndị nganga niile nọ nʼebe ahụ, gwara Jeremaya okwu sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka i kwuru! Onyenwe anyị Chineke anyị ezighị gị ka i kwuo na anyị ekwesighị ịga biri nʼIjipt, 3Kama ọ bụ Baruk nwa Neraya na-akwalị gị megide anyị, nʼihi na ọ chọrọ inyefe anyị nʼaka ndị Babilọn ka ha gbuo anyị, maọbụ buru anyị gaa Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha.”
4Ya mere, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha ahụ niile, nakwa ndị mmadụ ahụ niile nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụụ ịnọgide nʼala Juda. 5Kama Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ, duuru ndị ahụ fọdụrụ na Juda pụọ, ha na ndị ahụ si na mba ndị ọzọ dị iche iche, ebe ha gbagara lọta. 6Ha duuru ndị ikom niile na ndị inyom niile na ụmụntakịrị niile, na ụmụ ndị inyom eze niile, bụ ndị ahụ Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze Babilọn tinyere na nlekọta Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan na Jeremaya onye amụma na Baruk nwa Neraya. 7Ya mere, ha nupuru isi nʼebe Onyenwe anyị nọ site nʼịbanye ala Ijipt. Ha jegidere ije ruo nʼobodo Tapanhis.
8Mgbe ha nọ na Tapanhis, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya, 9“Mgbe ndị Juu nọ na-ele gị anya, chịrị ụfọdụ nkume buru ibu nʼaka gị, gaa zoo ha nʼime ụrọ dị na mpụta ihu ụlọ e ji aja ụrọ wuo, nke dị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ Fero dị na Tapanhis. 10Mgbe ahụ sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel sịrị, Aga m ezi ozi kpọta ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn. Aga m edokwasịkwa ocheeze ya nʼelu nkume ndị a m zoro nʼebe a, ọ ga-agbasa ụlọ ndo nke ịbụ eze ya nʼelu ha. 11Ọ ga-abịa buso Ijipt agha, si otu a mee ka ha nwụọ, bụ ndị ahụ a kwadobere maka ọnwụ, mee ka a dọta ha nʼagha, bụ ndị ahụ a kwadobere na-aga adọta nʼagha; mekwaa ka ha nwụọ site na mma agha bụ ndị ahụ a kwadobere na ha ga-anwụ site na mma agha. 12Ọ ga-esunyekwa ọkụ nʼụlọ ebe a nọ na-efe chi niile nke ndị Ijipt. Ọ ga-esure ụlọ ndị a ọkụ, dọtakwa chi ha niile nʼagha. Dịka onye ọzụzụ atụrụ si ewepụcha igwu site na uwe ya, ọ ga-esikwa otu a wezuga onwe ya nʼudo site nʼIjipt pụọ. 13Nʼime ụlọnsọ anyanwụ dị nʼIjipt, ka ọ ga-akwatu ogidi nsọ niile, surekwaa ụlọnsọ niile nke chi dị iche iche nʼIjipt ọkụ.’ ”

Did you know?
Flight to Egypt and Prophecy at Tahpanhes
- When Jeremiah warned the survivors to stay in Judah, leaders such as Johanan son of Kareah and Azariah son of Hoshaiah rejected the message, accusing the prophet of lying and claiming that his secretary Baruch was turning him against them. Disobeying the divine instruction, they forced the entire remnant, including Jeremiah and Baruch, to flee to Egypt as far as Tahpanhes.Sources: the Bible text itself · Baruch · Johanan
- At Tahpanhes, God instructed Jeremiah to bury large stones in the clay of the brick pavement at the entrance of Pharaoh's palace. This prophetic act announced that King Nebuchadnezzar of Babylon would invade Egypt and place his royal throne and pavilion directly over those embedded stones.Sources: the Bible text itself · Tahpanhes
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Egypt · 30.129, 31.308 · verses 2, 7, 10, 11, 12, 13
- Babylon · 32.543, 44.422 · verses 3, 10
- Chaldea · 30.962, 46.104 · verse 3
- Tahpanhes · Today: Tell Defenneh · 30.861, 32.171 · verses 7, 8, 9
- Heliopolis · Today: Ain Shams · 30.129, 31.308 · verse 13
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org