Nations Bible

Judges 20

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Ndị Izrel ebuso ebo Benjamin agha

1Mgbe ahụ, ndị Izrel niile ndị si nʼala Dan ruo Bịasheba, tinyere ndị si nʼala Gilead, pụtara dịka otu mmadụ, bịa zukọọ nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa. 2Ndị ndu ebo Izrel niile weere ọnọdụ na nzukọ nke ndị Chineke, ọnụọgụgụ ha bụ narị puku ndị agha anọ, ndị na-ebu mma agha. 3Mgbe na-adịghị anya, nzukọ ụmụ Izrel niile na Mizpa ruru ụmụ Benjamin ntị. Mgbe ahụ, ndịisi Izrel niile kpọrọ nwoke ahụ e gburu iko ya nwanyị sị ya, “Kọọrọ anyị otu ihe ọjọọ a si mee.”

4Ya mere, onye Livayị ahụ, di nwanyị ahụ e gburu kwuru sị, “Mụ na iko m nwanyị bịaruru obodo Gibea, obodo nta ndị Benjamin, kwụsị nʼebe ahụ ịnọ ọnọdụ abalị. 5Nʼoge abalị, ndị ikom Gibea bịara gba ụlọ anyị nọ nʼime ya gburugburu. Nzube ha bụ igbu m. Ma ha jidere iko m nwanyị, dinakwuru ya nʼike, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ. 6Nʼihi ya, abọwasịrị m ahụ iko m nwanyị ụzọ iri na abụọ, zisa ya nʼakụkụ niile nke ihe nketa ndị Izrel niile nʼihi na ndị ikom Gibea ndị ahụ emeela ihe ọjọọ na ihe ihere nʼala Izrel. 7Ugbu a, unu ụmụ Izrel niile, unu onwe unu tụleenụ okwu a, nyekwanụ ndụmọdụ ihe a ga-eme ebe a.”

8Ndị mmadụ niile kulitere dịka otu onye, sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ala na be ya. O nweghị onye ọbụla ga-esi nʼebe a laa nʼụlọ ya. 9Ma ugbu a, nke a bụ ihe anyị ga-eme ndị Gibea. Anyị ga-efe nza chọpụta ndị ga-aga lụso ndị Gibea agha. 10Anyị ga-esite nʼebo niile nke Izrel họpụta mmadụ iri site na narị mmadụ, họpụta narị mmadụ site na puku mmadụ, họpụtakwa puku mmadụ site nʼiri puku mmadụ, ka ha hụ maka iwetara ndị agha ihe oriri. Mgbe ndị agha a rutere Geba dị na Benjamin, anyị pụrụ ịkwụghachi ha ụgwọ ruru ha dịka ihe ihere niile ha mere nʼala Izrel si dị.” 11Ya mere, ndị Izrel niile jikọtara onwe ha ọnụ ibu agha ahụ dịka otu onye, megide obodo ahụ.

12Ndị ebo Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha gazuo ebo Benjamin niile, sị ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a jọgburu onwe ya emere nʼetiti unu? 13Ugbu a, kpọpụtara anyị ndị ikom ọjọọ dị a si nʼobodo Gibea ka anyị gbuo ha. Anyị ga-esikwa otu a hichapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.”

Ma ụmụ Benjamin egeghị ndị Izrel ibe ha ntị. 14Ha sitere nʼobodo ha dị iche iche zukọtaa na Gibea maka ibuso ndị Izrel agha. 15Nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin sitere nʼobodo ha dị iche iche kpọkọta iri puku ndị ikom abụọ na puku isii bụ ndị na-amịpụta mma agha, tinyere narị ndị ikom asaa ahụ zuruoke site na ndị bi na Gibea. 16Nʼime ndị agha ndị a, e nwere narị ndị agha asaa, ndị a maara nke ọma dịka ndị na-agbata ụta nke ọma. Ha bụ ndị na-eme aka ekpe, onye ọbụla nʼime ha nwere ike iji okwute mata otu agịrị isi, ghara ịmahie ya.

17Ma ọnụọgụgụ ndị agha ụmụ Izrel, ma ọ bụrụ na e wezuga ụmụ Benjamin, dị narị puku anọ.

18Ma tupu agha ahụ ebido, ndị agha Izrel buru ụzọ gaa Betel ịjụta Chineke ase. Ha jụrụ ya sị, “Olee ebo ga-edu anyị ibuso ndị agha Benjamin agha?”

Onyenwe anyị zara sị ha na ọ bụ Juda ga-ebu ụzọ.

19Nʼihi nke a, nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị agha ụmụ Izrel niile buliri ihe agha ha pụọ, maa ụlọ ikwu ha nso nso Gibea. 20Emesịa, ndị Izrel pụrụ izute ndị Benjamin, doo onwe ha nʼusoro ibu agha na Gibea. 21Ma nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin si Gibea nupụta nʼigwe gbuo ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ na puku abụọ. 22Ndị agha Izrel gbarịtara onwe ha ume, ma werekwa ọnọdụ ibu agha dịka ha mere nʼụbọchị mbụ. 23Ndị agha Izrel kwara akwa nke ukwuu nʼụbọchị ahụ nʼihu Onyenwe anyị site nʼụtụtụ ruo anyasị. Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ sị ya, “Anyị ga-aga nʼihu ịlụso ụmụnna anyị ndị Benjamin ọgụ?”

Onyenwe anyị zara sị ha, “Gaanụ ga lụso ha agha.”

24Nʼihi nke a, ndị Izrel jeghachikwara ọzọ ibuso ụmụ Benjamin agha nʼụbọchị nke abụọ ya. 25Nʼoge a kwa, ndị agha Benjamin si nʼobodo Gibea pụta ibuso ha agha. Ha gburu ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ. Ndị a niile bụkwa ndị ji mma agha ebu agha.

26Mgbe ahụ, ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ nʼebe ahụ, kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị Ha erighị nri ọbụla nʼụbọchị ahụ site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha chere nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja udo, ma chụọkwa aja nsure ọkụ. 27Ndị Izrel jụrụ ase site nʼaka Onyenwe anyị. (Nʼoge ndị ahụ, igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼebe ahụ. 28Finehaz nwa Elieza, nwa nwa Erọn na-eje ozi nchụaja nʼebe ahụ.) Ụmụ Izrel jụrụ Onyenwe anyị ase sị ya, “Ọ bụ anyị gaakwa ọzọ ibuso ụmụnna anyị ndị Benjamin agha, ka ị sị anyị agala?”

Onyenwe anyị zara sị ha, “Gaanụ, nʼihi na aga m ahụ na unu meriri ndị agha Benjamin echi.”

29Nʼihi nke a, ụmụ Izrel kewapụtara ndị zoro onwe ha nʼọhịa, gburugburu obodo Gibea. 30Nʼụbọchị nke atọ ya, ha pụrụ gaakwa izute ndị Benjamin, ha were ọnọdụ ha imegide ndị Gibea dịka ha mere nʼoge gara aga. 31Ndị Benjamin pụtara izute ha, e mere ka ha site nʼobodo pụọ. Ha malitere igbu ndị Izrel dịka ha mere na mbụ, nke mere na ndị ikom iri atọ dara nwụọ nʼọhịa ma na ụzọ, otu nke gawara obodo Betel, na nke ọzọ gawara obodo Gibea. 32Ya mere, mgbe ndị agha Benjamin malitere na-asị, “Lee, anyị emeriela ha dịka anyị mere na mbụ,” ndị Izrel nọ na-ekwu sị, “Ka anyị gbara ọsọ na-aga ruo mgbe ha ga-anọ ebe dị anya site nʼobodo ha.”

33Ndị ikom niile nke Izrel sitere nʼọnọdụ ha bilie, doo onwe ha nʼusoro na Baal-Tama, ndị Izrel ndị zoro onwe ha wapụtara site nʼọnọdụ ha nʼọdịda anyanwụ nke Geba, si nʼọhịa mapụta. 34Iri puku ndị ikom Izrel ahụ zuruoke gara na ncherita ihu Gibea busoo ya agha. Agha ahụ dị ike nke ukwuu nke mere na ndị Benjamin amataghị na oke mbibi na-abịakwasị ha. 35Onyenwe anyị meriri ndị Benjamin nʼihu Izrel, nʼụbọchị ahụ; ndị Izrel gburu ndị agha Benjamin ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ, na puku ise, na otu narị. Ha niile bụkwa ndị na-eji mma agha aga agha. 36Mgbe ahụ, ndị Benjamin nʼonwe ha, hụrụ na e emeriela ha.

Ugbu a, ndị ikom Izrel nyere ndị Benjamin ohere ịga nʼihu, nʼihi na ha dabere na ndị ha zoro nʼọhịa nʼakụkụ Gibea. 37Ndị ahụ zoro nʼọhịa gbapụtara ọsịịsọ gbaba nʼobodo Gibea, kesaa onwe ha, were mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo ahụ. 38Ndị Izrel na ndị zoro nʼọhịa kwekọtara na ha ga-eme ka anwụrụ ọkụ dị ukwuu na-ala elu elu site nʼobodo ahụ, 39ma mgbe ahụ, ndị Izrel ga-ebido ịbọ ọbọ ogbugbu egburu ha.

Ndị Benjamin egbuolarị iri ndị Izrel atọ, nʼihi ya ha sịrị, “Anyị na-emeri ha dịka anyị mere nʼagha mbụ.” 40Ma mgbe anwụrụ ọkụ malitere ịla elu site nʼobodo ahụ, ndị Benjamin lere anya nʼazụ hụ ka anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼakụkụ niile nke obodo ahụ. 41Mgbe ahụ, ndị Izrel bidoro igbu ha, oke egwu jidere ndị Benjamin nʼihi na ha ghọtara na ịla nʼiyi adakwasịla ha. 42Ha si nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, gbaga nʼụzọ gawara nʼọzara, ma ha enweghị ike ịgbanarị agha ahụ. Ndị Izrel si nʼobodo Gibea gbapụta gburu ha nʼebe ahụ. 43Ha gbara ndị Benjamin gburugburu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Gibea, gbuo ọtụtụ nʼime ha nʼebe ahụ. 44Ndị agha Benjamin e gburu nʼagha ụbọchị ahụ dị puku iri na asatọ. 45Mgbe ha chigharịrị na-agbala nʼụzọ ọzara na-aga nʼebe oke nkume Rimọn dị, ndị Izrel gburu puku ndị agha ise nʼime ha nʼụzọ ahụ. Ha chụgidere ndị Benjamin ọsọ ruo Gidom, gbukwaa puku ndị agha ha abụọ.

46Ya mere, ndị Benjamin e gburu nʼagha nʼụbọchị ahụ dị iri puku abụọ, na ise. Ndị a bụ ndị agha mma agha, dike na dimkpa nʼagha. 47Naanị narị ndị agha isii nʼime ha tụgharịrị gbapụ ọsọ gbalaga nʼọzara, nʼebe nkume Rimọn dị. Ha nọgidere nʼebe ahụ ọnwa anọ. 48Mgbe ahụ, ndị agha Izrel hapụrụ ha, laghachi azụ, gaa nʼobodo ndị Benjamin niile gbuo ndị niile nọ nʼime ha, igwe anụ ụlọ, na ihe ndị ọzọ niile dị nʼime ha. Obodo niile ha ruru, ha kpọrọ ha ọkụ.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The War Against Benjamin

  • The phrase 'from Dan to Beersheba' describes the full extent of the Promised Land from north to south, a distance of roughly 144 miles (230 km). The assembly gathered at Mizpah, a hilltop town located a few miles northwest of Jerusalem that regularly served as a meeting place during major national crises.Sources: Beersheba · Mizpah · the Bible text itself
  • The text notes that Phinehas, son of Eleazar and grandson of Aaron, ministered before the Ark of the Covenant at Bethel when Israel inquired of God. This detail indicates that the civil war at Gibeah took place relatively early in the period of the judges, within two generations of the Exodus.Sources: Phinehas (Levite) · Eleazar · Aaron · Bethel (of Palestine)
  • After devastating losses that nearly wiped out the tribe of Benjamin, only 600 surviving warriors managed to escape. They fled to the Rock of Rimmon, a steep hilltop site on the edge of the hill country, where they held out for four months.Sources: Rimmon · Gibeah · the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Dan · Today: Tel Dan · 33.249, 35.652 · verse 1
  • Gilead · Today: Gilead 1 · 32.187, 35.692 · verse 1
  • Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verse 1
  • Maareh-geba · Today: within 2 km of Tel el Ful · 31.823, 35.231 · verse 33

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.