James 1
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

About this book
About James
- Easton's Bible Dictionary (1897) identifies the author as James the Less, the Lord's brother and one of the twelve apostles, and as one of the three pillars of the Church. A related entry calls him the son of Alphaeus, or Cleopas, a near kinsman of Jesus, nicknamed "the Less" or "the Little," probably because he was short, and states that this James wrote the letter that bears his name.Sources: Easton: James, Epistle of · James (Brother of Jesus)
- Easton's Bible Dictionary (1897) places the writing in Jerusalem, where James was living, and, from internal evidence, in the period between Paul's two imprisonments in Rome, probably about A.D. 62.Sources: Easton: James, Epistle of
- The letter is addressed to the Jews of the dispersion, "the twelve tribes scattered abroad." The same James is described as head of the church at Jerusalem, where he presided at the council that considered the case of the Gentiles.Sources: Easton: James, Epistle of · James (Brother of Jesus)
- According to Easton, the writer sought to press the practical duties of the Christian life, warning against formalism, fanaticism, fatalism, bowing before the rich, false use of words and oaths, partisanship, evil speaking, boasting, and oppression. He presents the great lesson as patience in trial, in good works, and under provocation, oppression, and persecution, grounded in the near coming of the Lord, who would set wrongs right.Sources: Easton: James, Epistle of
- An entry on Job cites him, in connection with this letter, as an example for later generations of integrity and of submissive patience under the sorest calamities.Sources: Job
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
1Jemis, nwaodibo Chineke na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst,
Na-edegara agbụrụ iri na abụọ ndị gbasara nʼelu ụwa niile akwụkwọ ozi a:
Ndeewonụ!
Ọnwụnwa na nsogbu
2Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nʼọṅụ mgbe ọbụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu. 3Nʼihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachiobi unu na-enwe ohere ito eto. 4Ka nguzosike unu pụta ìhè, ka unu zuo oke ma nwezuokwa ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke ga-akọ unu. 5Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya. 6Ma rịọọ nʼokwukwe na-enweghị obi abụọ, nʼihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri oke osimiri mgbe ikuku na-ebugharị ya. 7Onye dị otu ahụ ekwesighị ile anya na ọ ga-esite nʼaka Onyenwe anyị nata ihe ọbụla. 8Nʼihi na mmadụ dị otu a bụ onye ihu abụọ, onye na-adịghị eguzo nʼotu ebe nʼihe ọbụla ọ na-eme.
9Ka nwanna ọbụla bụ ogbenye ṅụrịa ọṅụ, mgbe ọbụla e weliri ya elu. 10Ka onye bụ ọgaranya mgbe a na-eme ka ọ nọdụ ya dị ala, nʼihi na ndị bara ụba ga-akpọnwụ dị ka okoko osisi. 11Nʼihi na mgbe ọbụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahịhịa kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nʼala, mma ya agwụsịakwa. Nʼotu aka ahụ, onye ahụ bara ụba ga-akpọnwụ ọ bụladị mgbe ọ na-ejegharị nʼime ije ozi ya.
12Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.
13Ka onye ọbụla hapụ ị sị, mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke na-anwa m ọnwụnwa a.” Nʼihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ, ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọbụla ka o mee ihe ọjọọ. 14Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nʼọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya. 15Ọchịchọ ahụ, mgbe ha bara ụba nʼime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe mmehie bara ụba, ọ na-eduba nʼọnwụ.
16Ekwela ka onye ọbụla duhie unu ụmụnna m. 17Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya. 18Nʼihi imezu nzube ya, o sitere nʼokwu ya bụ eziokwu mụọ anyị. O mekwara nke a ka anyị bụrụ ụmụ mbụ nke ihe o kere eke.
Ịṅa ntị na ime ihe anyị nụrụ
19Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. 20Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke. 21Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ niile na ihe ọbụla dị njọ nke fọdụrụ nʼime ndụ unu. Ma jirinụ obi umeala nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nʼobi unu, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi unu.
22Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ naanị, na-arafu onwe ha, kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru. 23Nʼihi na onye ọbụla na-ege ntị nʼokwu ọbụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nʼenyo. 24O lesịa onwe ya pụọ, o chefuo ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa. 25Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nʼime iwu ahụ zuruoke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ee, nwoke ahụ na-aga nʼihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka a ga-agọzi nʼihe niile ọ na-eme.
26Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka maọbụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru. 27Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.

Did you know?
Trials and Pure Religion
- The letter opens in the name of “James, a servant of God and of the Lord Jesus Christ.” A traditional account identifies him as the son of Alphaeus, or Cleopas, called James “the Less” or “the Little,” probably because he was of low stature, and as a brother, near kinsman, or cousin of Jesus. That account says he appears to have headed the church in Jerusalem and that he presided at the council held to consider the case of the Gentiles.Sources: James (Brother of Jesus) · the Bible text itself
- He addresses “the twelve tribes of the Dispersion” and greets them as brothers. He treats trials of many kinds as a testing of faith that develops perseverance, but he warns that no one who is tempted should say, “God is tempting me,” because God tempts no one.Sources: the Bible text itself
- The rich man, he says, should exult in his low position, because he will pass away like a flower of the field when the sun rises with scorching heat and withers the plant. Pure and undefiled religion, in his words, is to care for orphans and widows in their distress and to keep oneself from being polluted by the world.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org