Nations Bible

Isaiah 36

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Senakerib ebuso Jerusalem agha

1Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib, bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, meriekwa ha. 2Mgbe ahụ, eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha ya, ya na usuu ndị agha ijekwuru Hezekaya na Jerusalem. Mgbe ọchịagha ahụ kwụsịrị nʼụzọ mmiri nke ọdọ mmiri dị Elu, nʼụzọ jere nʼebe ọhịa Ọsụ akwa. 3Eliakịm, nwa Hilkaya, onye nlekọta ụlọeze, na Shebna, bụ ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, onye ndekọ akụkọ ihe mere, pụrụ jekwuru ya.

4Ọchịagha ahụ sịrị ha, “Gwanụ Hezekaya:

“ ‘Otu a ka eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa, na-ekwu, Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere? 5Ị na-ekwu na i nwere ndụmọdụ na ike ibu agha, maọbụ naanị egbe ọnụ ka ị na-agba. Ọ bụ onye ka ị na-atụkwasị obi, mere i ji enupu isi nʼokpuru m? 6Lee, amatara m na ị na-atụkwasị obi nʼIjipt, mkpanaka achara ahụ gbajiri agbaji, nke na-adụwa aka onye ọbụla na-adabere na ya. Otu a ka Fero, eze Ijipt dị nye ndị niile na-atụkwasị ya obi. 7Ma ọ bụrụ na unu asị m, “Anyị na-atụkwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị obi.” Ọ bụghị ya ka Hezekaya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, “Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼebe ịchụ aja a?”

8“ ‘Ma ugbu a, bịa kwee nna m ukwu, bụ eze Asịrịa nkwa. Aga m enye gị puku ịnyịnya abụọ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịchọta ndị ga-agba ha. 9Ị ga-esi kwa aṅaa jụ otu onyeisi nke dịkarịsịrị nta nʼime ndịisi ọrụ onyenwe m, na-agbanyeghịkwa na i na-atụkwasị obi nʼIjipt maka inweta ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya? 10Tinyere nke a, abịara m ibuso ala a agha na ibibi ya ma ọ bụghị nkwado Onyenwe anyị? Onyenwe anyị ya onwe ya gwara m ka m bilie megide obodo a, lakwaa ya nʼiyi.’ ”

11Mgbe ahụ Eliakịm, Shebna na Joa sịrị ọchịagha ahụ, “Biko, gwa ndị ohu gị okwu nʼasụsụ Aramaik, ebe ọ bụ na anyị na-aghọta ya. Agwala anyị okwu nʼasụsụ Hibru, ebe ndị nọ nʼelu mgbidi ga-anụ.”

12Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?”

13Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu niile nke eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa. 14Nke a bụ ihe eze sịrị, Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu. 15Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Onyenwe anyị obi, mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, Onyenwe anyị aghaghị ịnapụta anyị. A gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’

16“Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya: 17ruo mgbe m ga-abịa duru unu gaa nʼala dịka nke unu, bụ ala mkpụrụ ọka na nke mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịnị jupụtara nʼime ya.

18“Unu ekwela ka Hezekaya rafuo unu mgbe ọ na-asị, ‘ Onyenwe anyị ga-anapụta anyị.’ O nweela chi niile nke ndị mba ọzọ, nke napụtarala ala ha site nʼaka eze Asịrịa. 19Olee ebe ka chi ndị Hamat na Apad nọ? Olee ebe ka chi ndị Sefavaim nọkwa? Ha anapụtala Sameria site nʼaka m? 20Olee chi nʼime chi mba ndị a niile, bụ ndị zọpụtarala ala ha site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na Onyenwe anyị pụrụ ịzọpụta Jerusalem site nʼaka m?”

21Ma ndị ahụ niile gbara nkịtị, ha ekwughị ihe ọbụla, nʼihi na eze nyere ha iwu sị, “Unu azaghachila ya.”

22Mgbe Eliakịm nwa Hilkaya, onyeisi ọchịchị, na Shebna ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, ode akwụkwọ akụkọ eze laghachikwuuru Hezekaya, ha dọwara uwe ha mgbe ha na-aga igosi ya ịda mba nke obi ha. Ha gwakwara ya ihe niile onyeisi agha ndị Asịrịa kwuru.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Sennacherib's Threat Against Jerusalem

  • The term Rabshakeh was not a personal name, but a high-ranking title designating the chief cup-bearer or vizier of the Assyrian royal court. Sennacherib sent this official from Lachish to Jerusalem with a large army to demand the surrender of King Hezekiah.Sources: Rabshakeh · Lachish · the Bible text itself
  • Hezekiah's ministers asked the Assyrian envoy to speak in Aramaic, a language used for international diplomacy that the common people would not understand. Rabshakeh refused and intentionally shouted in Hebrew so that the guards and civilians sitting on the city wall would hear his threats directly.Sources: Rabshakeh · the Bible text itself
  • The Judean delegation sent out to meet the Assyrian envoy included Eliakim the palace administrator, Shebna the royal scribe, and Joah the recorder. After listening to the envoy's speech defying their God and their king, they returned to Hezekiah in deep mourning with their clothes torn.Sources: Eliakim · Shebna · Joah · the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Assyria · 36.359, 43.153 · verses 1, 2, 4, 8, 13, 15, 16, 18
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 2, 7, 20
  • Lachish · Today: Tell ed Duweir · 31.565, 34.849 · verse 2
  • Upper Pool · Today: in Jerusalem · 31.777, 35.234 · verse 2
  • Egypt · 30.129, 31.308 · verses 6, 9
  • Hamath · Today: Hama · 35.136, 36.750 · verse 19
  • Samaria · 32.276, 35.195 · verse 19

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.