Nations Bible

Hebrews 9

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Ebe ofufe nke ụwa na nke eluigwe

1Ọgbụgba ndụ nke mbụ nwere usoro ofufe na ebe nsọ nke ụwa nke a e jiri aka wuo. 2E guzobere ụlọ ikwu. Nʼọnụụlọ nke mbụ nʼụlọ ikwu ahụ, e nwere ihe ịdọba iheọkụ, na tebul, na achịcha e doro nsọ. Aha ọnụụlọ nke mbụ a bụ Ebe Nsọ. 3Nʼazụ akwa mgbochi nke abụọ ka e nwere ọnụụlọ a na-akpọ Ebe Kachasị Nsọ, 4nke nwere ebe ịchụ aja mgbaisiọma e ji ọlaedo wuo, na igbe ọgbụgba ndụ ahụ nke e jiri ọlaedo machie ahụ ya niile. Ihe dị nʼime ite ahụ bụ mánà na mkpanaka Erọn nke ahụ puputara ahịhịa, ya na mbadamba nkume e dekwasịrị iwu ọgbụgba ndụ. 5Ihe dị nʼelu igbe a bụ cherubim nke ebube ya, na-ekpuchite oche amara ahụ. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe niile ndị a nʼozuzu oke ugbu a.

6Mgbe e doro ihe niile ndị a nʼusoro, onye nchụaja na-abata mgbe ọbụla nʼime ọnụụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nʼebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ. 7Ma ọ bụ naanị onyeisi nchụaja na-abanye nʼime ọnụụlọ nsọ nke abụọ, naanị otu ugboro nʼafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nʼebe ahụ, iji chụọ aja maka onwe ya na nʼihi mmehie ndị mmadụ mere na-amaghị ama. 8Site na nke a, Mmụọ Nsọ na-egosi na ụzọ e si abanye nʼEbe Kachasị Nsọ ahụ bụ ihe na a ka apụtabeghị ihe, ebe ọ bụ na ụlọ ikwu nke mbụ ahụ ka na-eguzo. 9Nke a bụ ihe ilu banyere oge ugbu a. Site na nhazi nke a, onyinye na aja niile a na-achụ enweghị ike ime ka akọnuche onye na-efe ofufe zuo oke. 10Kama ha bụ naanị usoro iwu metụtara ihe oriri na ihe ọṅụṅụ na ụdị baptizim dị iche iche nke anụ ahụ, bụ nke e nyere ka a na-eme ya ruo mgbe a ga-edozigharị ihe niile.

Ọbara nke Kraịst

11Mgbe Kraịst bịara dị ka onyeisi nchụaja nke ezi ihe ahụ dị ugbu a, site nʼụlọ ikwu dị ukwuu zuruoke nke a na-ejighị aka mee, nke na-esoghị nʼihe e kere eke, 12o jighị ọbara ụmụ ewu na nke ụmụ ehi banye nʼebe ahụ, kama o ji ọbara nke ya onwe ya banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ naanị otu mgbe, jiri ya wetara anyị niile mgbapụta ebighị ebi. 13Ma ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oke ehi dị iche iche, ya na ntụ nwa agbọghọ ehi, nke e fekwasịrị ndị rụrụ arụ, pụrụ ido ha nsọ, meekwa ka ha dị ọcha nʼelu ahụ. 14Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ọ ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ.

15Nʼihi nke a, ọ bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ site na ya nata ihe nketa ebighị ebi ahụ bụ nke e kwere ha na nkwa. A pụrụ ime nke a nʼihi ọ nwụọla ọnwụ gbapụta ụmụ mmadụ site nʼikpe ọmụma nke mmehie ha mere nʼokpuru ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ.

16Ọ bụrụ na mmadụ ekee ekpe mgbe ọ nọ ndụ, a na-ebu ụzọ achọpụta ma onye kere ekpe ahụ ọ nwụọla. 17Ekpe na-amalite ịdị ire mgbe onye kere ekpe ahụ nwụrụ, nʼihi na ihe mmadụ kere nʼekpe anaghị adị ire mgbe onye kere ya ka dị ndụ. 18Ọ bụ nke a mere ọ bụladị ọgbụgba ndụ ochie ahụ jiri bụrụ ihe na-adịghị ire ruokwa mgbe ọbara batara na ya. 19Mgbe Mosis kwupụtachara ndị mmadụ iwu ahụ, o weere ọbara ụmụ ehi na ewu, ya na mmiri, ogbo uhie na hisọp fesaa nʼakwụkwọ iwu ahụ nakwa nʼelu mmadụ niile. 20Na-ekwu, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke Chineke nyere unu iwu.” 21Nʼotu aka ahụ, o fesakwara ọbara ahụ nʼelu ụlọ ikwu na nʼelu ihe niile dị nʼụlọ ikwu, bụ ihe niile e ji efe ofufe. 22Nʼikwu eziokwu, dịka iwu si dị, ọ dịghị ihe ọbụla nke a na-adịghị eji ọbara edo ọcha. Ọ bụrụ na a wụsịghị ọbara, mgbaghara mmehie adịghị.

Aja Kraịst chụrụ na-ewepụ mmehie

23O kwesiri ka e si otu a mee ka ihe ndị a yiri ihe ndị dị nʼeluigwe dị ọcha, ma ihe ndị dị nʼeluigwe nʼonwe ha kwesiri ka e nye ha aja dị mma karịa. 24Nʼihi na ọ bụghị nʼebe nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, nke yiri nke dị nʼeluigwe, ka Kraịst banyere, kama ọ banyere nʼime eluigwe nʼonwe ya, bụ ebe ọ na-anọchite anya anyị ugbu a nʼihu Chineke. 25Ọ banyeghị na ya ka o were onwe ya chụọ aja ọtụtụ ugboro, dị ka onyeisi nchụaja na-eji ọbara na-abụghị nke ya na-abanye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ kwa afọ. 26Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ gaara abụ onye na-ahụ ahụhụ mgbe kemgbe e kere ụwa. Ma, dị ka o si dị, ọ bịara naanị otu ugboro nʼọgwụgwụ oge ndị a, iwezuga mmehie site nʼiji onwe ya chụọ aja. 27Dị ka ọ bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie, 28otu a ka e si chụọ Kraịst dị ka aja naanị otu ugboro iwepụ mmehie ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-abịaghachi nke ugboro abụọ, ma ọ bụghị nʼihi ibu mmehie, kama ọ bụ nʼihi iweta nzọpụta nye ndị ahụ niile na-eche ọbịbịa ya.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Earthly Sanctuary

  • This chapter describes the first covenant's earthly sanctuary as a tabernacle divided into two rooms. According to Easton's Bible Dictionary (1897), the outer room, the Holy Place, was twenty cubits long and ten cubits high and wide. It had no opening for daylight, so only the golden lampstand lit it.Sources: the Bible text itself · Holy Place
  • A veil of the most costly materials and the brightest colors separated the Holy Place from the Most Holy Place. Priests entered the first room regularly to carry out their duties, but only the high priest entered the inner room, and only once a year, never without blood offered for himself and for sins the people had committed in ignorance.Sources: Holy Place · the Bible text itself
  • This chapter places the golden altar of incense in the Most Holy Place, together with the gold-covered ark, which held a gold jar of manna, Aaron's staff that had budded, and the stone tablets of the covenant. Easton's Bible Dictionary (1897), by contrast, locates that altar in the Holy Place, with the table of showbread. Aaron, whose staff is mentioned here, was Moses' elder brother and the eldest son of Amram and Jochebed.Sources: the Bible text itself · Holy Place · Aaron

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Holy Place · Today: on Mount Moriah · 31.778, 35.236 · verses 2, 8, 12, 25
  • Most Holy Place · Today: on Mount Moriah · 31.778, 35.236 · verses 3, 7

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.