Nations Bible

Hebrews 6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

1Ya bụ ka anyị na-aga nʼihu nʼihe mmụta zuru ezu, ka anyị gharakwa ịnọgide nʼihe mmụta mbụ ahụ nke anyị nwere banyere Kraịst. Anyị agaghị alaghachi azụ ịtọ ntọala nchegharị ọzọ site nʼọrụ ndị nwụrụ anwụ nʼokwukwe nʼebe Chineke nọ, 2na-akụzi banyere ime baptizim na ibikwasị aka nʼisi na onyinye nke Mmụọ Nsọ, na mbilite nʼọnwụ na ikpe ebighị ebi. 3Anyị ga-eme nke a ma Chineke kwe.

4Ma ọ dịghị mfe ịkpọghachi ndị dara ada ọzọ, bụ ndị natarala ihe ahụ na mbụ, ndị detụkwara onyinye amara dị iche iche nke si nʼeluigwe bịa ire, ndị ketakwara oke Mmụọ Nsọ, 5ndị detụkwara ịdị mma nke okwu Chineke ahụ ire na ike nke ụwa na-abịa, 6ma mesịa dahie nʼonwe ha, ọ bụ ihe siri ike ịkpọghachite ha ruo nchegharị. Ha na akpọgidekwa Ọkpara Chineke nʼobe ọzọ, na emenyekwa ya ihere nʼihu ọha mmadụ. 7Nʼihi na ala ahụ nke na-amị mmiri na-ezokwasị nʼelu ya mgbe niile, na-amịpụta mkpụrụ bara ụba nye ndị e ji maka ha kọọ ya, na-enweta ngọzị nʼaka Chineke. 8Ma ọ bụrụ na o puo naanị ogwu na ahịhịa, ọ baghị uru ọbụla. Kama, ọ ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ, nke ọgwụgwụ ya ga-abụ ịkpọ ya ọkụ.

9Ma ọ bụ ezie na anyị na-ekwu otu a, ezi ndị enyi m, anyị nwere ntụkwasị obi maka ihe dị ezi mma banyere unu, bụ ihe ndị ha na nzọpụta so bịa. 10Chineke abụghị onye na-ekpe ikpe nʼezighị ezi. Ọ gaghị echefu ọrụ niile unu rụrụ ya. Ọ gaghị echefu ịhụnanya niile unu gosiri nʼihi ya site nʼịgara ndị nsọ ozi, dịka unu na-aga nʼihu na-emekwa. 11Anyị chọrọ ka onye ọbụla nʼime unu nọgidesie ike nʼotu ịnụ ọkụ nʼobi ahụ ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka unu nwee olileanya inwezu ihe niile unu na-atụ anya ya mgbe oge ruru. 12Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama ka unu bụrụ ndị na-eṅomi ndụ ahụ jiri okwukwe na ntachiobi nweta ihe ahụ e kwere na nkwa.

Chineke adịghị agbanwe uche ya

13Mgbe Chineke kwere Ebraham nkwa, o ji onwe ya ṅụọ iyi, nʼihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ukwuu karịa ya, 14na-asị, “Nʼezie aga m agọzi gị, nyekwa gị ọtụtụ ụmụ ụmụ.” 15Ebraham nwere ndidi, natakwa ihe e kwere ya na nkwa.

16Ụmụ mmadụ na-eji ndị ka ha ukwuu ṅụọ iyi, iyi aṅụrụ nʼụzọ dị otu a na-eme ka ihe e kwuru guzosie ike ma wezugakwa ịrụ ụka niile nʼetiti mmadụ. 17Ya mere, mgbe Chineke chọrọ igosi ndị ahụ ga-eketa nkwa ahụ, ụdịdị izuzu ya, o jiri ịṅụ iyi mee ka o doo ha anya na izuzu ya adịghị agbanwe agbanwe. 18Ka ọ ga-abụ site nʼihe abụọ na-enweghị mgbanwe, nke na-agaghị ekwe omume izi Chineke dịka onye ụgha, anyị bụ ndị gbara ọsọ ndụ ga-enweta agbamume siri ike iji jide olileanya e dobeere anyị. 19Anyị nwere olileanya a dị ka arịlịka nke mkpụrụobi nke guzosiri ike ma bụrụkwa nke e chekwara. Ọ na-abanye nʼime ime ebe nchụaja ahụ nʼazụ akwa mgbochi 20ebe Jisọs onye buru anyị ụzọ, abanyela nʼihi anyị; ọ ghọlara anyị onyeisi nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Maturity, God's oath, and a priest forever

  • A dictionary entry explains the name Abraham as "father of a multitude" and calls him the heir of the promises. Hebrews 6 quotes God's words to him, "I will surely bless you and multiply your descendants," and says that after waiting patiently he obtained the promise.Sources: Abraham · the Bible text itself
  • The chapter describes an ordinary custom: people swear by someone greater than themselves, and the oath confirms what was said and ends all argument. Since there was no one greater, God swore by himself, so the heirs of the promise would see that his purpose does not change. The letter speaks of two unchangeable things in which it is impossible for God to lie, and of this hope as an anchor for the soul.Sources: the Bible text itself
  • A dictionary entry gives Melchizedek's name as "king of righteousness" and calls him king of Salem. It says that all that is known of him is recorded in Genesis 14:18-20, and that the Old Testament mentions him again only in Psalm 110:4. Hebrews 6 ends with Jesus, as forerunner, entering the inner sanctuary behind the curtain and becoming a high priest forever in Melchizedek's order, a comparison the letter sets out in the next chapter, where Melchizedek is the type of a priest who lives forever.Sources: Melchisedec · the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.