Galatians 4
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
1Isiokwu m bụ nke a, mgbe nwa bụ onye ga-eketa ihe nna ya ka dị na nwata, ọnọdụ ya akaghị mma karịa nke ohu, ọ bụ ezie na akụ ahụ niile bụ nke ya. 2Ma ha ka nọ nʼokpuru ndị nlekọta na ndị e tinyere ya nʼaka ruo oge nna ya kwuru. 3Otu a ka ọnọdụ anyị dị, mgbe anyị bụ ụmụntakịrị. Anyị nọ dị ka ohu nʼokpuru mmụọ nke ụwa. 4Ma mgbe oge a kara aka ruru, Chineke zitere Ọkpara ya, bụ onye amụrụ site na nwanyị, onye amụrụ nʼokpuru iwu, 5ka ọ gbapụta ndị nọ nʼokpuru iwu, ime anyị ndị a ga-agụ dị ka ụmụ a họpụtara. 6Ebe unu bụ ụmụ, Chineke zitere Mmụọ Ọkpara ya, ka ọ bịa biri nʼobi anyị, na-eti mkpu na-asị, “Abba, Nna.” 7Ugbu a, ị bụkwaghị ohu, kama ị bụ nwa. Ebe ị bụ nwa, e meekwala ka ị bụrụ onye nketa site na Chineke.
Mmetụta obi Pọl maka ndị Galeshịa
8Nʼoge gara aga, mgbe unu na-amaghị Chineke, unu bụ ohu nye chi niile nke na-abụghị dịka ha si pụta ụwa. 9Ma ugbu a, unu matarala Chineke, ka m ga-asị na Chineke amatala ndị unu bụ, gịnị mere unu ji chọọ ịtụgharị azụ laghachi nʼokpukpe ndị ahụ na-enweghị isi, nke ike ọbụla na-adịghị nʼime ha? Unu chọrọ ka ha mee unu ndị ohu ha ọzọkwa? 10Unu na-edebe ụbọchị ụfọdụ, na ọnwa ụfọdụ, na oge ụfọdụ, na afọ ụfọdụ. 11Egwu na-atụ m na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti unu abụrụla ihe efu.
12Ezi ụmụnna m, arịọọ m unu, meenụ onwe unu dị ka mụ onwe m, nʼihi na mụ onwe m emela onwe m ka m dị ka unu. O nweghị ihe ọjọọ ọbụla unu mere m. 13Unu maara na ọ bụ nʼime adịghị ike nke anụ ahụ ka m ji kwusaara unu oziọma a. 14Ọ bụ ezie, ọnọdụ m nʼoge ahụ bụ ọnwụnwa nʼebe unu nọ, unu eledaghị m anya, maọbụ jụ ige m ntị. Kama unu nabatara m, dị ka mmụọ ozi Chineke, maọbụ dị ka a ga-asị na m bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya. 15Ebee ka mmụọ nke obi ụtọ ahụ unu nwere nọ? Nʼihi na m na-agba ama, na-asị na ọ bụrụ ihe a pụrụ ime, unu gaara aghụpụta anya unu nye m. 16Ugbu a, aghọọla m onye iro unu, nʼihi na m na-agwa unu eziokwu?
17Ha na-ezipụta mmasị nʼebe unu nọ, ma ọ bụghị maka ọdịmma unu. Ha chọrọ ikewapụ unu nʼebe m nọ, ka unu nwee mmasị nʼebe ha nọ. 18Maka ebumnuche dị mma, ọ dị mma inwe mmasị mgbe niile. Ọ bụghị naanị mgbe mụ na unu nọ. 19Ụmụntakịrị m, ndị m kwe maka ha nọdụ nʼọnọdụ ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ọzọ, na-eche ụbọchị ahụ a ga-eme ka ụdịdị Kraịst dị nʼime unu. 20Ọ gaara adị m mma ma a sị na m nọ nʼetiti unu ugbu a, nwee ike ịmata otu m ga-esi gbanwee olu okwu m, nʼihi na-amaghị m ihe m kwesiri ime nʼihi ọnọdụ unu.
Hega na Sera
21Gwanụ m, unu ndị na-eche na ọ dị mkpa idebe iwu, unu agaghị aṅaa ntị na ihe iwu ahụ kwuru? 22Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ na Ebraham nwere ụmụ nwoke abụọ. Otu nʼime ha bụ nwa nke ohu ya nwanyị mụrụ, nke ọzọ bụ nke nwunye ya na-abụghị ohu mụtara. 23Nwa ahụ nke ohu nwanyị ahụ mụrụ bụ onye amụrụ site na anụ ahụ. Ma nwa ahụ nwunye ya na-abụghị ohu mụtara bụ onye a mụrụ site na nkwa.
24Anyị ga-ewere ihe ndị a dị ka ihe ịmaatụ, nʼihi na ụmụ nwanyị abụọ ndị a nọchiri anya ọgbụgba ndụ abụọ. Otu ọgbụgba ndụ sitere nʼUgwu Saịnaị ma mụọkwa ụmụ ndị bụ ohu: nke a bụ Hega. 25Hega bụ Ugwu Saịnaị nke dị nʼArebịa. Ọ dabara nʼọnọdụ Jerusalem nke ugbu a, nʼihi na ya na ụmụ ya nọ nʼohu. 26Ma nwanyị nke ọzọ nọ ọnọdụ Jerusalem nke dị nʼelu, nke nwe onwe ya. Ọ bụkwa ya bụ nne anyị. 27Nʼihi na e dere ya,
“Ṅụrịa ọṅụ, gị nwanyị aga,
onye na-amụtaghị nwa.
Tie mkpu ọṅụ, tisiekwa mkpu akwa ike
gị onye ime nwa na-emetụbeghị,
nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ
karịa ụmụ nke nwanyị nwere dị.”
28Ugbu a, ụmụnna m, unu bụ ụmụ ahụ nke e kwere na nkwa, dị ka Aịzik. 29Nʼoge ahụ, nwa ahụ a mụrụ nʼụzọ anụ ahụ kpagburu nwa ahụ a mụrụ site nʼike nke Mmụọ Nsọ. Otu a ka ọ dịkwa nʼoge a. 30Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya, nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị a apụghị isoro nwa nke nwanyị na-abụghị ohu kerikọta oke.” 31Ya mere, ụmụnna m, anyị abụghị ụmụ nke nwanyị ohu, kama anyị bụ ụmụ nke nwanyị nwere onwe ya.

Did you know?
No Longer Slaves, but Sons
- This chapter says Abraham had two sons, one by a slave woman and one by a free woman, and that the women represent two covenants. Hagar, the slave woman, was an Egyptian, Sarah's handmaid, given to Abraham as a secondary wife; her son was Ishmael. Isaac, Abraham's only son by Sarah, is the child of promise to whom the chapter likens its readers.Sources: the Bible text itself · Hagar · Isaac
- The chapter identifies Hagar with Mount Sinai in Arabia, a mountain also called Horeb. Easton's Bible Dictionary (1897) describes that mountain district as the place the Hebrews reached in the third month after the Exodus, where they camped for about a year, and places the Sinai peninsula in Western Arabia.Sources: the Bible text itself · Mount Sinai · Arabia
- The chapter contrasts the Jerusalem of its own day, which it says is in slavery with her children, with the Jerusalem above, which it calls free. Easton's Bible Dictionary (1897) calls the city the holy city and the city of God, and says its name, dual in form, means possession of peace or foundation of peace, probably referring to Mounts Zion and Moriah or, as some suppose, to the upper and lower city.Sources: the Bible text itself · Jerusalem
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Arabia · Today: Arabia Petraea · 30.070, 35.350 · verse 25
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 25, 26
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org