Nations Bible

Ezra 9

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Ekpere Ezra banyere ịlụrịta di na nwunye

1Mgbe e mesịrị ihe ndị a, ndịisi bịakwutere m sị, “Ndị Izrel na ndị nchụaja, na ndị Livayị, ekewapụghị onwe ha site nʼetiti ndị agbataobi ha, na omume arụ ha niile, dịka nke ndị Kenan, na ndị Het; na ndị Periz, na ndị Jebus, na ndị Amọn, na ndị Moab, na ndị Ijipt, na ndị Amọrait. 2Ha alụtarala onwe ha nwunye site nʼụmụ ndị inyom mba ọzọ ndị a, lụtakwara ụmụ ha ndị ikom. Ha agwakọtala mkpụrụ nsọ na ndị dị iche iche nọ ha gburugburu. Ọ bụ ndị ndu na ndịisi ọchịchị ha bụ ndị butere ụzọ nʼibi ndụ ekwesighị ntụkwasị obi a.”

3Ma mgbe m nụrụ nke a, adọwara m uwe ahụ m na uwe mwụda m, dọpụkwa ụfọdụ agịrị isi nke isi m, na ajị afụọnụ m, nọdụkwa ala nʼọnọdụ mgbagwoju anya. 4Mgbe ahụ, ndị niile mara jijiji nʼokwu Chineke nke Izrel, gbakọtara m gburugburu nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọtaranụ. Mụ onwe m nọkwa nʼọnọdụ mgbagwoju anya ruo oge ịchụ aja nsure ọkụ nke anyasị.

5Nʼikpeazụ, nʼoge aja uhuruchi, esitere m nʼiweda onwe m ala bilie, eji m uwe na uwe mwụda dọkara adọka daa nʼala nʼikpere m, chilie aka m abụọ elu, tikuo Onyenwe anyị Chineke m 6nʼekpere sị,

“Ihere na-eme m, Chineke m, amaghị otu m ga-esi lelie anya m lekwasị gị nʼihu, nʼihi na mmehie anyị babigara ụba oke, ikpe ọmụma dị na-eche anyị dịkwa ukwuu, nʼezie o ruola eluigwe. 7Site nʼụbọchị nna nna anyị ha ruo taa, ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu. Nʼihi mmehie anyị, anyị na ndị eze anyị, na ndị nchụaja anyị ka enyefere nʼaka mma agha, na ndọta nʼagha, na ịpụnara anyị ihe nʼike na nweda nʼala nʼaka ndị eze ala mba ọzọ, dịka ọ dị taa.

8“Ma ugbu a, na nwa oge nta a, gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị egosila anyị amara, mee ka ole na ole fọdụrụ anyị. O nyeela anyị ọnọdụ siri ike nʼime ebe nsọ ya. Chineke anyị na-enye anya anyị ìhè, mee ka anyị kurutu ume ndụ nʼoge a site nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị. 9Nʼihi na ndị ohu ka anyị bụ, ma nʼihi obiọma na obi ebere gị, ị gbakụtaghị anyị azụ nʼọnọdụ ịbụ ohu anyị. Kama i mere ka ndị eze Peshịa gosi anyị obi ebere. Ha enyekwala anyị ndụ ọhụrụ, nke anyị ga-eji nwee ike wughachi ụlọnsọ Chineke anyị, ma wuziekwa ebe ya niile dakpọrọ adakpọ. Ọzọkwa, o nyekwala anyị ebe ize ndụ site na mwugharị nke mgbidi Juda na Jerusalem.

10“Ugbu a, Chineke anyị, gịnịkwa ka anyị nwere ikwu banyere ihe ndị a niile mere? Lee na anyị ahapụla gị ọzọ, hapụkwa ịgbaso iwu gị, 11nke i ji dọọ anyị aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma, bụ ndị ohu gị. Nʼihi na i si nʼọnụ ha kwuo sị, ‘Ala ahụ unu na-abanye inweta bụ ala nke ndị bi nʼime ya mere ka ọ rụọ arụ. Nʼihi na ndị bi nʼime ya esitela nʼomume ọjọọ ha mee ka akụkụ ala ahụ niile rụọ arụ. 12Ya mere, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụrụ, maọbụ kwenye ka ụmụ unu ndị ikom lụọ ụmụ ha ndị inyom. Unu achọkwala udo nke ọdịmma ọbụla nʼetiti unu na ha nʼoge ọbụla, ka unu dị ike, rie ezi ihe nke ala ahụ, hapụkwara ya ụmụ unu dịka ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’

13“Ma ihe niile dakwasịrị anyị bụ maka ajọ omume anyị, nʼihi ikpe ọmụma dị ukwuu anyị. Ma lee, Chineke anyị ataghị anyị ahụhụ dịka ịdị ukwuu nke mmehie anyị si dị, kama, o mekwara ka ole na ole nʼime anyị fọdụ. 14Ma anyị ọ ga-emebi iwu gị ọzọ, site nʼịlụ ndị a rụrụ arụ nʼomume ha? Ị gaghị eweso anyị iwe ruo na ị ga-ebibi anyị kpamkpam, na-afọdụghị otu onye? 15Ma gị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel, ị bụ onye ezi omume. Lee anyị ka anyị guzo nʼihu gị nʼọnọdụ ikpe ọmụma anyị, ọ bụ ezie na o nweghị onye ọbụla nʼime anyị kwesiri iguzo nʼihu gị nʼihi nke a.”

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Ezra's Prayer of Confession

  • When Ezra learned that the returned exiles and their leaders had intermarried with surrounding peoples, he expressed extreme grief by tearing his tunic and cloak, pulling hair from his head and beard, and sitting in shock until the evening offering.Sources: the Bible text itself
  • In his prayer of confession, Ezra recognized that God had extended mercy to the remnant through the kings of the Persian Empire, who allowed the Judeans to rebuild the temple in Jerusalem even while remaining foreign subjects.Sources: the Bible text itself · Persia · Jerusalem

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verse 9
  • Judea · Today: Judea 2 · 31.777, 35.234 · verse 9
  • Persia · 34.806, 48.516 · verse 9

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.