Ezra 6
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Iwu Daraiọs
1Ya mere, Daraiọs nyere iwu ka a chọpụta nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị Babilọn ma ọ dị akwụkwọ ọbụla dị otu ahụ. 2Emesịa, a chọpụtara otu akwụkwọ nʼụlọeze dị na Ekbatana nʼala Midia. Nke a bụ ihe e dere nʼime akwụkwọ ahụ:
Akwụkwọ ozi eze;
3Nʼafọ mbụ nke Sairọs bụ eze, o nyere iwu banyere ụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem ebe ndị Juu na-efe Chineke.
A ga-ewughachi ụlọnsọ ukwu ahụ ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja, ka a tọsiekwa ntọala ya ike. Ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-abụkwa otu ihe ahụ. 4Ahịrị atọ nke oke nkume ka a ga-eji tọọ ntọala ya, tinyere otu ahịrị osisi. A ga-esi nʼụlọakụ eze Sairọs kwụọ ụgwọ ihe ndị a niile. 5Ọzọkwa, a ga-ebughachikwa ngwongwo ọlaedo na ọlaọcha niile nke ụlọ Chineke, ndị Nebukadneza sitere nʼụlọnsọ ahụ dị nʼJerusalem buru gaa Babilọn, doghachikwa ha nʼụlọ Chineke.
6Mgbe a gụsịrị ya, Daraiọs zighachiri Tatenai onye na-achị Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ nọ nʼọdịda anyanwụ Yufretis ozi sị ha, Unu hapụ ha ka ha rụọ ọrụ ha. 7Unu egbochila owuwu ụlọ Chineke ahụ. Kwerenụ ka onyeisi ndị Juu na ndị okenye Juu wughachi ụlọ Chineke a nʼebe e wuru ya na mbụ.
8Ọzọ, ana m enye iwu na nke a bụ ihe unu na-aghaghị imere ndị okenye, na ndị Juu niile na-ewugharị ụlọnsọ Chineke ahụ.
Ka unu site nʼụtụ isi a na-atụrụ m kwụọ ụgwọ e ji ewu ụlọ ahụ na-atụfughị oge ọbụla. 9Unu nye ha ihe ọbụla dịkwa ha mkpa, ụmụ oke ehi na ebule, ụmụ atụrụ, ha ga-eji chụọrọ Chineke nke eluigwe aja. Nyekwanụ ha ọka wiiti, na mmanya, na nnu, na mmanụ oliv, dịka ndị nchụaja rịọrọ, bụ ndị nọ na Jerusalem, aghaghị inye ha ihe ndị a kwa ụbọchị niile na-esepụghị aka. 10Ka ha nwee ike ịchụ ezi aja nye Chineke nke eluigwe, kpeekwaara mụ na ụmụ m ekpere.
11Ana m enye iwu na onye ọbụla ga-agbanwe okwu a, ka ehopụta osisi nʼụlọ ya jiri kwụgbuo ya. A ga-emekwa ụlọ ya ka ọ bụrụ ebe ikpofu ahịhịa. 12Chineke ahụ, onye mere Jerusalem ebe obibi ya, ga-ebibi eze ọbụla maọbụ mba ọbụla gbanwere iwu a, maọbụ bibie ụlọnsọ ahụ ọzọ.
Ọ bụ Daraiọs na-enye iwu a. Ka onye ọbụla were ike ya niile debe ya.
Ido ụlọnsọ ahụ nsọ
13Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze Daraiọs zitere, Tatenai, onyeisi ọchịchị nʼala ofe mmiri, na Sheta Bozenai, na ndị otu ha, mere ihe niile dịka ozi ahụ si dị na-atụfughị oge ọbụla. 14Nʼihi ya, ndịisi Juu gara nʼihu nʼọrụ, ihe na-agakwara ha nke ọma site na nkwusa onye amụma, bụ Hegai, na Zekaraya, nwa Ido. Ha wuchara ụlọnsọ ahụ dịka iwu Chineke Izrel nyere si dị, nakwa dịka Sairọs, na Daraiọs, na Ataksekses, ndị eze Peshịa, nyekwara nʼiwu. 15Ha wusiri ya nʼabalị nke atọ nʼọnwa isii (dị ka ọgụgụ afọ ndị Juu si dị) nʼafọ nke isii nke ọchịchị Daraiọs.
16Ụmụ Izrel, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị fọdụrụ nʼime ndị e mere ka ha ga biri nʼala ọzọ, ji ọṅụ mee mmemme nke ido ụlọ nke Chineke ahụ nsọ na gbaghee ya. 17Nʼihi ido ụlọ ahụ nsọ, ha ji oke ehi dị otu narị nʼọnụọgụgụ, na narị ebule abụọ, na narị atụrụ anọ chụọ aja, werekwa mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile, dịka ebo niile nke Izrel si dị. 18Ha guzobere ndị nchụaja na nkewa ha, ndị Livayị nʼotu ha maka ije ozi nke Chineke na Jerusalem, dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis.
Mmemme Ngabiga
19Ndị ahụ emere ka ha gaa biri nʼala ọzọ, mere Mmemme Ngabiga nʼabalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. 20Ndị nchụaja na ndị Livayị edoola onwe ha ọcha, ha niile dịkwa ọcha. Ndị Livayị nʼonwe ha gburu ọtụtụ atụrụ Mmemme Ngabiga maka ndị nchụaja, na ndị Livayị ndị ọzọ, na ndị ahụ niile lọtara alọta site na mba ọzọ. 21Ya mere, ndị Izrel niile bụ ndị ahụ lọtara site nʼebe e mere ka ha gaa biri riri ihe ahụ, ha na ndị ahụ niile kewapụrụ onwe ha juu ibi ajọọ ndụ nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na-ebi, nʼihi ịchọ Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel. 22Ha sokwa mee mmemme achịcha na-ekoghị eko, nke ha mere ụbọchị asaa. Oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile nʼihi na Onyenwe anyị mere ka eze Asịrịa nwee obiọma nʼebe Izrel nọ, nyere ha aka iwugharị ụlọnsọ ukwu Chineke, onye bụ Chineke Izrel.

Did you know?
Completion and Dedication of the Temple
- Although King Darius ordered a search of the treasury archives in Babylon, the original decree of Cyrus authorizing the rebuilding of the temple was discovered in the fortress of Ecbatana in the province of Media, where Cyrus maintained a royal residence.Sources: the Bible text itself · Ecbatana
- Tattenai, the Persian governor of the region west of the Euphrates who had investigated the building project, was commanded by Darius to fully fund the construction and provide sacrificial animals daily from the imperial taxes collected in his province.Sources: the Bible text itself · Tatnai
- The temple was completed in the sixth year of Darius through the prophetic ministry of Haggai and Zechariah, and its dedication was celebrated with joyful sacrifices, including twelve male goats representing all the tribes of Israel.Sources: the Bible text itself · Haggai · Zechariah
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Babylonia · 32.543, 44.422 · verse 1
- Ecbatana · Today: Tell Hagmatana · 34.806, 48.516 · verse 2
- Media · 34.806, 48.516 · verse 2
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 3, 5, 9, 12, 18
- Babylon · 32.543, 44.422 · verse 5
- Beyond the River · 31.777, 35.234 · verses 6, 8, 13
- Euphrates · Today: Euphrates River · 31.004, 47.442 · verse 6
- Persia · 34.806, 48.516 · verse 14
- Assyria · 36.359, 43.153 · verse 22
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org