Nations Bible

Ezekiel 47

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Iyi si nʼime ụlọnsọ ukwu

1Mgbe ahụ, nwoke ahụ mere ka m lọghachikwa nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ. Ahụrụ m iyi nke na-asọ na-aga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ (nʼihi na ihu ụlọnsọ ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ). Mmiri ahụ si nʼokpuru ụlọnsọ ukwu ahụ nʼakụkụ aka nri nke ebe ịchụ aja, nʼakụkụ ndịda ya na-asọpụta, 2O mere ka m si nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu pụta, ma gaa nʼọnụ ụzọ nke ọwụwa anyanwụ, ebe m hụrụ mmiri ahụ ka o si na ndịda na-asọpụta.

3Mgbe anyị na-aga, o ji ihe ọtụtụ dị ya nʼaka tụpụta ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ. O duuru m na-agafe mmiri ahụ. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela na nkwonkwo ụkwụ. 4O jikwa ihe ọtụtụ ya tụpụtakwa ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, durukwa m na-aga. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela m nʼikpere. Mgbe ọ tụpụtara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, o duuru m gafee mmiri ruru m nʼukwu. 5Ọ tụpụtakwara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, mmiri ahụ ghọrọ osimiri nke m na-apụghị ịgafe, nʼihi na mmiri ahụ toro eto bụrụ mmiri ogwugwu, osimiri nke mmadụ na-apụghị iji ije ụkwụ gafee. 6Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụrụ ihe ndị a?”

O duuru m laghachi nʼọnụ mmiri. 7Mgbe m rutere nʼọnụ mmiri, lee, ahụrụ m ọtụtụ osisi nke toro nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ. 8Ọ sịrị, “Iyi a na-asọ na-aga akụkụ ọwụwa anyanwụ, sọbanye nʼime Araba, tutu bịa sọbanye nʼosimiri nnu ahụ. Mgbe ọ sọbanyere nʼosimiri nnu ahụ, mmiri ya na-aghọ mmiri dị mma ọṅụṅụ 9Ọtụtụ ihe e kere eke dị ndụ ga-ebi nʼebe ọbụla mmiri a na-asọ aga. Azụ dị ukwuu ga-ejupụta nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri a na-asọbanye nʼebe ahụ, na-eme ka mmiri osimiri ghọọ mmiri dị mma ịṅụ aṅụ. Ya mere, ihe niile dị nʼebe ọbụla mmiri a sọjere ga-adị ndụ. 10Ndị ọkụ azụ ga-eguzo nʼọnụ mmiri, site nʼEn-Gedi ruo nʼEn-Eglaim a gaghị enweta ebe a na-agbasa ụgbụ e ji egbu azụ. Azụ dị iche iche ga-adịkwa, dịka azụ osimiri Mediterenịa. 11Ma ebe apịtị ya niile, nʼebe niile mmiri na-adọ, agaghị adị ọhụrụ, ọ bụ nnu ga-aga ka a ga-ahapụrụ ebe ndị ahụ. 12Mkpụrụ osisi dị iche iche ga-eto nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ. Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ, mkpụrụ ga-adị nʼelu ha mgbe niile. Mkpụrụ ọhụrụ ga-adị nʼọnwa ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmiri si nʼebe nsọ ahụ na-agba ha mmiri. Mkpụrụ ha ga-abụ nri, akwụkwọ ha ga-abụkwa maka ịgwọ ọrịa.”

Oke ala ahụ

13Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Nke a ga-abụ oke ala nke unu ga-eke nʼetiti ebo iri na abụọ nke Izrel dịka ihe nketa ha, Josef ga-enweta oke ala abụọ. 14Ebo ọbụla ga-eketa dịka ibe ya ketara, nʼihi na-eweliri m aka ṅụọ iyi na m ga-enye ndị nna nna unu ala ahụ, na ala a ga-aghọkwa ihe nketa unu.

15“Nke a ga-abụkwa oke ala nke ala unu ahụ.

“Nʼakụkụ ugwu, ọ ga-esite nʼosimiri Mediterenịa nʼakụkụ ụzọ Hetlon, gafee Lebo gawa Zedad, 16site ya ruo Berota na Sibraim (nke dị nʼoke ala dị nʼagbata Damaskọs na Hamat), rukwaa na Haza Hatikon, nke dị nʼoke ala Hauran. 17Oke ala ahụ ga-esite nʼoke osimiri gbasoro oke ala nke ugwu Damaskọs ruo Haza Enan. Oke ala ndị Hamat ga-adịkwa nʼakụkụ ugwu. Nke a ga-abụ oke ala nke akụkụ ugwu unu.

18Oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-esite nʼagbata Hauran na Damaskọs soro akụkụ osimiri Jọdan, nʼagbata ndị Gilead na ala ndị Izrel ruo nʼosimiri dị nʼọwụwa anyanwụ, ruokwa Tama. Nke a ga-abụkwa oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.

19Oke ala na ndịda, ọ ga-esite na Tama ruo ọbụladị mmiri Meriba Kadesh, soro ụzọ ọdọ mmiri iyi Ijipt ruo osimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala ahụ na ndịda.

20Nʼọdịda anyanwụ, osimiri Mediterenịa ga-abụ oke ala, ruo na ncherita ihu ụzọ e si abata Hamat. Nke a bụ oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.

21“Ala niile dị nʼime oke ala ndị a, ka unu ga-eke nʼetiti onwe unu dịka ebo Izrel si dị. 22Keenụ ha ka ha bụrụ ihe nketa nye onwe unu, ma nyekwa ndị ọbịa bi nʼetiti unu, bụ ndị ọbịa niile mụtara ụmụ. Unu ga-agụ ha dịka ndị amụrụ nʼala Izrel. Ha ga-esokwa unu keta oke nʼihe nketa a na-ekenye ndị ebo niile nke Izrel. 23A ga-ekenye ndị ọbịa ihe nketa nʼebo ọbụla ha bi nʼetiti ha.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Healing River and the Land's Borders

  • Ezekiel's vision depicts a stream trickling from beneath the temple threshold that rapidly grows into a deep river flowing east into the Arabah, making the salty waters fresh and sustaining lush fruit trees and thriving fisheries from En-gedi to En-eglaim.Sources: the Bible text itself · Engedi
  • In a significant legal and social development within the division of the land, resident foreigners who raise families among the tribes are allotted land inheritances on equal terms with native-born Israelites.Sources: the Bible text itself
  • The northern and eastern boundaries of the restored territory encompass ancient Syrian and Levantine landmarks, including Hamath, Damascus, and the fertile region of Hauran, while Joseph receives a double portion among the twelve tribes.Sources: the Bible text itself · Hauran · Hamath · Joseph (son of Jacob)

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Arabah · 30.417, 35.151 · verse 8
  • Salt Sea · Today: Dead Sea · 31.500, 35.500 · verses 8, 9, 10, 18
  • Engedi · Today: Ein Gedi · 31.450, 35.383 · verse 10
  • Great Sea · Today: Mediterranean Sea · 31.805, 34.170 · verses 10, 15, 17, 19, 20
  • Damascus · 33.511, 36.306 · verses 16, 17, 18
  • Hamath · Today: Hama · 35.136, 36.750 · verses 16, 17
  • Hauran · 32.730, 36.368 · verses 16, 18
  • Sibraim · Today: in the region between Damascus and Hamath · 34.401, 36.636 · verse 16
  • Gilead · Today: Gilead 1 · 32.187, 35.692 · verse 18
  • Jordan · Today: Jordan River · 31.761, 35.558 · verse 18
  • Meribah · Today: Ain el Qudeirat · 30.648, 34.422 · verse 19
  • Negeb · 31.245, 34.841 · verse 19

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.