Nations Bible

Ezekiel 30

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Abụ akwa nʼihi Ijipt

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,

“ ‘Kwasienụ akwa ike ma sị,

“Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!”

3Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso,

Ụbọchị nke Onyenwe anyị abịala nso,

ụbọchị igwe ojii,

ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi.

4Mma agha ga-abịakwasị Ijipt,

ihe mgbu ga-adakwasị Kush.

Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala,

a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya,

mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi.

5Kush na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha.

6“ ‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:

“ ‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada,

nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa.

Site na Migdol ruo nʼAswan,

ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya.

Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

7Ha ga-atọgbọrọ nʼefu,

nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu.

Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe,

nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi.

8Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,

mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt,

mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka.

9“ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu.

10“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

“ ‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọn

bibie igwe ndị agha Ijipt niile.

11Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere,

ka a ga-akpọbata ka ha bịa bibie ala ahụ.

Ha ga-amịpụta mma agha ha megide Ijipt,

werekwa ozu ndị e gburu egbu tụsasịa nʼala ahụ.

12Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ.

Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ.

Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.

Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya.

Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.

13“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

“ ‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi,

mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị.

Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt,

aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile.

14Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu.

Aga m etinye ọkụ na Zoan,

ma taa Tibs ahụhụ.

15M ga-awụkwasị Pelusium ọnụma m,

bụ ebe siri ike nke Ijipt,

m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile.

16Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt,

Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu.

A ga-eji ike tipịa Tibs.

Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile.

17Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti

ga-anwụ site na mma agha.

Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha.

18Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhis

mgbe m ga-agbaji yoku Ijipt,

nʼebe ahụ ka mpako nke ike ya ga-agwụsị.

Igwe ojii ga-ekpuchi ya,

a ga-adọtakwa obodo nta ya niile nʼagha.

19Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu,

ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”

Aka Fero agbajiela

20O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 21“Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha. 22Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ. 23Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile, 24meekwa ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike. Aga m etinye mma agha m nʼaka ya, ma ogwe aka abụọ nke Fero ka m ga-agbajisi. Mgbe ahụ, Fero ga-asụ ude nʼihu eze Babilọn dịka onye e merụrụ ahụ. 25Aga m eme ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike; ma ogwe aka Fero ga-akpọnwụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyere mma agha nʼaka eze Babilọn, na mgbe o setịpụrụ ya imegide Ijipt. 26Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Judgment on Egypt and Her Allies

  • Ezekiel names Nebuchadnezzar, the king of Babylon, as the instrument chosen to bring ruin upon Egypt and defeat its multitudes.Sources: Nebuchadnezzar · the Bible text itself
  • The oracle lists major religious and administrative centers across Egypt, including Memphis (Noph), Thebes (No), and the key fortified border city of Pelusium (Sin).Sources: Memphis · Pelusium · Thebes · the Bible text itself
  • The prophecy also warns Egypt's regional allies and neighbors, such as Cush to the south, that they will share in the panic and collapse when Egypt falls.Sources: Cush · the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Cush · Today: Cush 1 · 16.935, 33.751 · verses 4, 5, 9
  • Egypt · 30.129, 31.308 · verses 4, 5, 6, 7, 8, 9, 10, 11, 12, 13, 15, 16, 18, 19, 21, 22, 23, 24, 25, 26
  • Arabia · Today: Arabian Peninsula · 23.000, 46.000 · verse 5
  • Libya · 32.821, 21.851 · verse 5
  • Syene · Today: Aswan · 24.089, 32.900 · verse 6
  • Babylon · 32.543, 44.422 · verses 10, 24, 25
  • Nile · Today: Nile River · 31.465, 30.367 · verse 12
  • Memphis · 29.849, 31.253 · verses 13, 16
  • Pathros · Today: Upper Egypt · 24.100, 32.700 · verse 14
  • Thebes · 25.721, 32.610 · verses 14, 15, 16
  • Zoan · Today: Tanis · 30.977, 31.880 · verse 14
  • Pelusium · Today: Tell el Farama · 31.043, 32.546 · verses 15, 16
  • Heliopolis · Today: Ain Shams · 30.129, 31.308 · verse 17
  • Pi-beseth · Today: Tell Basteh · 30.573, 31.510 · verse 17
  • Tahpanhes · Today: Tell Defenneh · 30.861, 32.171 · verse 18

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.