Nations Bible

Ezekiel 3

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

1Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, rie ihe a m gaje inye gị. Taa akwụkwọ a a fụkọrọ afụkọ; pụọ gaa gwa ụmụ Izrel okwu.” 2Ya mere, a saghere m ọnụ m, o nyere m akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ ka m rie.

3Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, taa akwụkwọ a niile m nyere gị, tajuo ya afọ gị.” Atara m ya. Ma mgbe m na-ata ya, ọ tọrọ m ụtọ nʼọnụ dịka a ga-asị na ọ bụ mmanụ aṅụ.

4Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, bilie jekwuru ụmụ Izrel gwa ha okwu m niile. 5Nʼihi na-ezighị m gị ka i jekwuru mba ndị okwu ha edoghị anya na ndị a naghị aghọta asụsụ ha, kama ọ bụ ijekwuru ụlọ Izrel. 6Ezikwaghị m gị ka i jekwuru mba nwere asụsụ na-edoghị anya, nke ị na-adịghị aghọta okwu ha. Nʼihi na a sị na ọ bụ ndị dị otu a ka m zigara gị ka i jekwuru, ha gaara ege gị ntị. 7Ma ụlọ Izrel agaghị ekwe gee gị ntị, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị. Nʼihi na ụlọ Izrel bụ ndị obi ha siri ike, na ndị isiike. 8Lee, emeela m ka ihu gị sie ike karịa nke ha, ka egedege ihu gị siekwa ike karịa nke ha. 9Aga m emekwa ka egedege ihu gị dị ka nkume siri ike, sie ike karịa nkume. Nʼihi ya, atụla ha egwu; ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-enupu isi, ma atụla ihu ha egwu.”

10Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, gee ntị nke ọma nʼokwu ndị a niile m na-agwa gị, tinyekwa ha nʼuche gị. 11Jekwuru ndị gị a dọtara nʼagha nọ na mba ọzọ, sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,’ Gwa ha ya, ma ha gere gị ntị ma ha egeghị gị ntị.”

12Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ buliri m elu. Anụrụ m olu mere oke ụzụ nʼazụ m, mgbe ebube nke Onyenwe anyị sị nʼọnọdụ ya bilie. 13Ọ bụ ụzụ nke nku ihe ndị ahụ dị ndụ na-eme mgbe ha na-emetụrịta nku ibe ha; ọ bụkwa ụzụ ụkwụ wịịlu ha nke dị nʼakụkụ ha. 14Mmụọ ahụ buliri m, bupụ m. Ejegharịrị m nʼobi ilu na iwe nke mmụọ m, ebe aka Onyenwe anyị dịkwa ike nʼahụ m. 15A bịakwutere m ndị ahụ a dọọrọ nʼagha, ha aga biri na Tel Abib nʼakụkụ osimiri Keba. Nʼebe ahụ, bụ ebe ha na-ebi, anọdụrụ m nʼetiti ha abalị asaa, nʼọnọdụ obi ilu na ọnụma.

Ọrụ Izikiel dịka onye nche

16Mgbe abalị asaa gasịrị, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m, 17“Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị. 18Mgbe m na-asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma ọ bụrụ na ị dọghị ya aka na ntị, maọbụ ị kwughị okwu ime ka ha chigharịa site nʼụzọ ọjọọ ha niile pụta nʼihi ịzọpụta ndụ ha, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha. 19Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị, ma ha esighị nʼajọ omume maọbụ nʼụzọ ọjọọ ha niile chigharịa, ha ga-anwụ nʼihi mmehie, ma ndụ gị ka ị zọpụtara.

20“Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼụzọ ezi omume ya wezuga onwe ya bido ime ihe ọjọọ, m siere ha ọnya, ha ga-anwụ nʼihi na ị dọghị ha aka na ntị, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha. Agaghịkwa echeta ihe ọma niile ndị ha mere, ma ị ga-aza ajụjụ maka ọnwụ ha. 21Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ezi omume aka na ntị ka ọ ghara ime mmehie, ha gharakwa ime mmehie, ha ga-adị ndụ nʼihi na ha nabatara ịdọ aka na ntị ahụ. Gị onwe gị azọpụtakwala ndụ gị, nʼụzọ dị otu a.”

22Aka Onyenwe anyị dịgidesịrị ike nʼahụ m nʼebe ahụ. Ma ọ sịrị m, “Bilie gaa nʼebe ahụ obosara ala dị ka m gwa gị okwu nʼebe ahụ,” 23Ebiliri m gaa nʼebe ahụ ala dị larịị. Ebube Onyenwe anyị guzo nʼebe ahụ dịka ebube nke m hụrụ nʼakụkụ iyi Keba. Adara m kpuo ihu m nʼala.

24Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ banyere nʼime m mee ka m guzo ọtọ nʼụkwụ m abụọ. Ọ gwara m okwu sị m, “Gaa, baa nʼụlọ, mechibido onwe gị ụzọ. 25Ma gị, nwa nke mmadụ, a ga-eji ụdọ kee gị ka ị ghara inwe ike ịpụ gaa nʼetiti ndị mmadụ. 26Aga m eme ka ire gị rapara nʼakpo ọnụ gị, ka ị ghọọ onye ogbi, gharakwa ịbụ onye na-adọ ha aka na ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi. 27Ma mgbe ọbụla m ziri gị ozi, aga m atọghepụ ire gị. Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru.’ Ka onye nwere ntị nụrụ, ka onye nke na-achọghị ịnụ ghara ịnụ, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Ezekiel's Commission and the Exiles at Tel-abib

  • Tel-abib, where Ezekiel lived among the Jewish captives, was a settlement located along the River Chebar in Babylonia. Many scholars identify the Chebar not as a natural river, but as a major Babylonian canal network, such as the royal canal connecting Mesopotamian waterways.Sources: Chebar · Tel-abib · the Bible text itself
  • In ancient cities, a watchman was stationed on defensive walls to scan the horizon and warn inhabitants of incoming danger. God adapted this role as a metaphor for Ezekiel's prophetic duty, holding him personally accountable if he failed to deliver the warning to the wicked.Sources: the Bible text itself
  • Before speaking to his fellow exiles, Ezekiel ate a scroll containing divine words, which tasted as sweet as honey, and sat overwhelmed among the captives for seven full days.Sources: the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.