Nations Bible

Ezekiel 28

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Amụma megide eze Taịa

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị:

“ ‘Nʼihi nganga nke juru gị obi,

ị na-ekwu sị, “Mụ onwe m bụ chi,

mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi,

nke dị nʼetiti oke osimiri niile.”

Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi,

ọ bụ ezie na ị na-eche na ị mara ihe dịka chi.

3Ị maara ihe karịa Daniel?

Ọ bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe ị nọ?

4I werela amamihe gị na nghọta gị

nwetara onwe gị akụ,

tụkọba ọlaedo na ọlaọcha,

nʼime ụlọakụ gị dị iche iche.

5E, mmụta nʼịzụ ahịa gị

emeela ka ị ghọọ ọgaranya,

nʼihi akụnụba inwere

ị bụrụla onye na-akpa nganga.

6“ ‘Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu;

“ ‘ebe ọ bụ na ị gụrụ onwe gị dịka onye maara ihe

onye maara ihe dịka chi,

7ana m aga ịkpọbata ndị mba ọzọ megide gị,

bụ mba kachasị mba niile dị iche iche njọ na-enweghị obi ebere.

Ha ga-amịpụta mma agha ha megide ịma mma gị na amamihe gị,

ha ga-adụwakwa ebube nke mma gị.

8Ha ga-eme ka ị rịdaruo nʼolulu nke ala mmụọ.

Ị ga-anwụ ọnwụ ike

nʼetiti oke osimiri niile.

9Mgbe nke a mere, ị ga-asị, “Mụ onwe m bụ chi,”

nʼihu ndị ahụ na-egbu gị?

Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi,

nʼaka ndị ahụ na-egbu gị.

10Ị ga-anwụ ọnwụ dịka ndị a na-ebighị ugwu,

site nʼaka ndị ọbịa.

Mụ onwe m ekwuola, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”

11Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị, 12“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

“ ‘Gị onwe gị bụ akara izuoke,

ị jupụtara na amamihe na ịma mma.

13Ị nọ nʼIden,

nʼubi Chineke a gbara ogige.

Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma,

rubi, na topaazi, na emeralụdụ,

na krisolaịt, na ọniks, na jaspa,

na safaia, na tọkwọisi, na beril.

A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo.

Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha.

14Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub,

ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ.

Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ,

na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ.

15Ị bụ onye na-enweghị ịta ụta

nʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị,

tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị.

16Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị

ị ghọrọ onye na-eme ihe ike,

si otu a mehiekwa.

Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị.

Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị,

gị cherub na-ekpuchi ekpuchi.

17Obi gị jupụtara na nganga

nʼihi ịma mma gị,

i mere ka amamihe gị

bụrụ ihe rụrụ arụ nʼihi ebube nke ịma mma gị.

Nʼihi ya, achụdara m gị, tụọ gị nʼala,

mee ka ị bụrụ ihe nlere anya nye ndị eze niile.

18Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị,

i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ.

Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta,

repịa gị.

Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala,

nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya.

19Ndị niile maara gị

ka ihe ndị a juru anya,

nʼihi na ị ghọọla ihe oke egwu.

Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ”

Amụma megide Saịdọn

20Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 21“Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya, 22ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

“ ‘Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn,

nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m.

Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị

mgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu,

nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ.

23Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya,

meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile.

Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya,

site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile.

Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

24“ ‘Ụlọ Izrel agaghị enwekwa mba kpọrọ ha asị gbara ha gburugburu ndị dịka uke, nke na-adụ adụ, na ogwu nke na-egbu mgbu. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.

25“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị Izrel ga-alọghachi biri nʼala nke aka ha ọzọ, ala nke m nyere nna ha Jekọb ohu m. Nʼihi na aga m esite na mba niile ha gbasasịrị chịkọtaa ha, si otu a gosi mba niile nke ụwa ịdị nsọ m. 26Ha ga-ebi nʼala a na ntụkwasị obi. Ha ga-ewu ụlọ, kụọ ubi vaịnị, birikwa na-atụghị egwu ọbụla. Mgbe m pịachara mba niile dị ha gburugburu ụtarị, bụ mba ndị ahụ mekpara ha ahụ, mgbe ahụ, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.’ ”

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Prophecies Against Tyre and Sidon

  • Ezekiel rebukes the ruler of Tyre for his arrogance fueled by immense commercial prosperity. Tyre was an ancient Phoenician city renowned for navigating the Mediterranean and gathering the commerce of the known world into its warehouses.Sources: the Bible text itself · Tyre
  • The prophecy ironically asks if the ruler of Tyre considers himself wiser than Daniel, from whom no secret was hidden. While Daniel was known for his wisdom, Tyre's leader used his skill solely to amass gold, silver, and commercial wealth.Sources: the Bible text itself · Daniel
  • Following the judgment against Tyre, Ezekiel prophesies against Sidon, located about twenty-five miles to the north. Sidon was the oldest Phoenician city and the mother city of Tyre, having a long history of oppressing Israel.Sources: the Bible text itself · Sidon · Tyre

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Tyre · 33.271, 35.196 · verses 2, 12
  • Sidon · Today: Sandikli archaeological site in Sidon · 33.561, 35.372 · verses 21, 22

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.