Nations Bible

Esther 8

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Iwu banyere ndị Juu

1Nʼotu ụbọchị ahụ, Ahasuerọs bụ eze, nyefere Esta nwunye eze akụnụba niile Heman onye iro ndị Juu nwere. E mekwara ka Mọdekai bịa nʼihu eze, nʼihi na Esta agwala eze na ọ bụ nwanne nna ya. 2Mgbe ahụ, eze wepụtara ọlaaka ikike ya, nke a gbapụtara site nʼaka Heman nye ya Mọdekai. Esta mekwara Mọdekai onye nlekọta akụnụba Heman.

3Ọzọkwa, Esta bịara nʼihu eze daa nʼala nʼụkwụ eze rịọ ya arịrịọ nʼanya mmiri ka ọ kwụsị echiche ọjọọ ahụ Heman onye Agag, chere megide ndị Juu. 4Eze setịpụrụ mkpara ọlaedo ya nye Esta. Esta biliri, guzo nʼihu eze, 5ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na m hụtara amara nʼihu ya, bụrụkwa ihe ziri ezi nʼanya eze, ọ bụrụkwa na ihe m masịrị ya, ka ede iwu nʼakwụkwọ ịkagbu ozi Heman nwa Hamedata, onye Agag, nke o chepụtara dee ime ka a laa ndị Juu nʼiyi nʼala niile eze na-achị. 6Nʼihi na m ga-esi aṅaa nagide ya, ịhụ ka a na-egbu ndị m, na-alakwa ụmụnna m nʼiyi?”

7Mgbe ahụ, eze bụ Ahasuerọs gwara Esta nwunye eze na Mọdekai onye Juu okwu sị ha, “Enyela m Esta akụnụba Heman, ha akwụgbukwaala Heman nʼosisi, nʼihi na ọ chọrọ ịla ndị Juu nʼiyi. 8Ugbu a, deenụ akwụkwọ ozi banyere ndị Juu niile, dee ihe ọbụla dị mma nʼanya unu nʼaha eze. Werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, nʼihi na ọ dịghị akwụkwọ ọbụla e dere nʼaha eze, kaakwa ya akara mgbaaka eze nke a pụrụ imegharị.”

9Otu mgbe ahụ, akpọrọ ndị ode akwụkwọ eze. Ọ bụ nʼiri abalị na atọ nke ọnwa atọ nʼafọ nke bụ ọnwa Sivan ka ihe ndị a mere. Ha dere iwu niile Mọdekai nyere banyere ndị Juu, ndịisi ọchịchị niile na ndị ọchịchị niile na-elekọta mpaghara alaeze niile site nʼIndia ruo Kush. Ọnụọgụgụ ha niile dị otu narị na iri abụọ na asaa (127). E depụtasịrị iwu ahụ nʼodide akwụkwọ nke ala ọbụla a na-achị achị si dị, na dịka asụsụ ndị ọbụla si dị, ma nyekwa ndị Juu dịka odide akwụkwọ na asụsụ ha si dị. 10Mọdekai dere akwụkwọ ahụ nʼaha eze, bụ Ahasuerọs, werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, zipụ akwụkwọ ndị a site nʼaka ndị ọgba ọsọ ndị ịnyịnya na-ebu, bụ ndị na-agba ịnyịnya ụkwụ ọsọ nke e leziri anya nke ọma zụọ maka ije ozi dịrị eze.

11Akwụkwọ nke iwu eze a, nyere ndị Juu niile nọ nʼobodo ọbụla ike izukọta nʼotu maka ịzọ ndụ ha, nyekwa ha ikike ibibi, gbuo ma laa nʼiyi ndị agha nke mba ọbụla, maọbụ ala ndị ahụ a na-achị achị bụ ndị nwere ike ịla ha, ndị inyom ha na ụmụntakịrị ha nʼiyi, na ịpụnara ha akụnụba ha. 12Ụbọchị a akara aka maka ndị Juu ime ihe ndị a nʼobodo niile nʼalaeze eze Ahasuerọs bụ nʼabalị iri na atọ nke ọnwa Ada. 13E kwukwara nʼakwụkwọ iwu ahụ na a ghaghị ịnabata iwu eze ahụ nʼobodo ọbụla dị nʼalaeze ya. E kwukwara na a ga-agụpụtara ya mmadụ niile, kọwazie ya ime ka ndị Juu niile nọdụ na njikere imeri ndị iro ha.

14Ndị ahụ na-agba ọsọ, bụ ndị na-ebu akwụkwọ ozi, nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya eze mee ngwangwa pụọ, ebe iwu eze kwaliri ha. E nyekwara iwu a na Susa.

Mmeri ndị Juu meriri

15Mgbe Mọdekai si nʼihu eze pụọ, o yi uwe ndị eze nke na-acha ọcha, na nke na-achakwa anụnụ anụnụ, kpurukwa okpueze ọlaedo dị ukwuu, na uwe mwụda e ji ezi akwa nke na-acha odo odo dụọ nʼahụ ya. Obodo Susa tiri mkpu ṅụrịakwa ọṅụ. 16Nye ndị Juu nʼonwe ha, ọ bụ oge ịṅụrị ọnụ, obi ụtọ na nsọpụrụ. 17Na mpaghara alaeze ahụ niile, na nʼobodo ọbụla nke iwu eze ahụ bịaruru, e nwere ọṅụ na obi ụtọ nʼetiti ndị Juu niile, nweekwa oke oriri na ọṅụṅụ. Ọtụtụ mmadụ nʼime ndị si mba dị iche iche ghọrọ ndị Juu, nʼihi egwu ndị Juu dakwasịrị ha.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

A Royal Counter-Decree and Mordecai’s Elevation

  • Under Persian custom, an official decree written in the king's name and sealed with the royal signet ring could not be revoked. Because Haman's previous decree could not be cancelled, King Ahasuerus permitted Esther and Mordecai to write a new decree authorizing the Jews throughout the empire to assemble and defend themselves.Sources: the Bible text itself · Ahasuerus
  • The Persian Empire at this time encompassed 127 provinces, stretching from India—the region surrounding the Indus River—to Cush or Ethiopia, south of Egypt. Royal scribes translated Mordecai's decree into the distinct script and language of each province, which couriers then carried on swift royal horses.Sources: the Bible text itself · India · Ethiopia
  • Mordecai was granted the king's signet ring previously held by Haman and was placed in charge of Haman's estate. When the decree was published, he emerged from the king's presence in royal garments of blue and white, wearing a large gold crown and a purple robe, prompting rejoicing throughout Susa.Sources: the Bible text itself · Mordecai · Susa

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Ethiopia · 16.935, 33.751 · verse 9
  • India · 23.994, 67.431 · verse 9
  • Susa · Today: Shush · 32.189, 48.258 · verses 14, 15

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.