Nations Bible

Esther 3

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Nzube ọjọọ Heman

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze bụ Ahasuerọs mere Heman nwa Hamedata onye Agag ka ọ bụrụ onye ukwu, o nyere ya ugwu site nʼinye ya oche dị elu karịa nke ndị ọzọ niile a na-asọpụrụ. 2Ndịisi ọchịchị eze niile na-egbu ikpere nʼala nye Heman nsọpụrụ mgbe ọbụla o si nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze na-agafe, nʼihi na ọ bụ otu a ka eze nyere nʼiwu. Ma Mọdekai ekweghị egbu ikpere nye ya, ọ kwekwaghị enye ya nsọpụrụ.

3Mgbe ahụ, ndị ozi eze ndị nọ nʼọnụ ụzọ ama eze jụrụ Mọdekai ajụjụ si ya, “Gịnị mere i ji na-enupu isi nʼiwu eze nyere?” 4Ha na-agwa ya okwu kwa ụbọchị kwa ụbọchị, ma o geghị ha ntị. Nʼihi nke a, ha gwara Heman ihe banyere ya, ịhụ ma ọ ga-anabata omume Mọdekai, ebe ọ gwara ha na ya bụ onye Juu.

5Ihe a were Heman iwe nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na Mọdekai jụrụ igbu ikpere nʼihu ya, maọbụ ịsọpụrụ ya. 6Mgbe ọ matara ndị Mọdekai ha bụ, ọ dị ya ka ihe ileda anya ma o gbuo naanị Mọdekai. Kama Heman chọrọ ụzọ ọ ga-esi laa ndị Mọdekai niile, bụ ndị Juu nọ nʼalaeze niile nke Sekses nʼiyi.

7Nʼọnwa mbụ, nke bụ ọnwa Nisan, nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị eze Ahasuerọs. Ha fere nza (nke bụ Pua) nʼihu Heman iji họpụta ụbọchị na ọnwa. Ma nza ahụ danyere nʼụbọchị nke iri na atọ nʼọnwa nke iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada.

8Mgbe ahụ Heman sịrị eze Sekses, “O nwere otu ndị gbasara ebe niile, nʼetiti ndị bi nʼobodo dị iche iche niile nke alaeze gị, ha kepụrụ onwe ha iche. Iwu ha dị iche site nʼiwu nke ndị mba ọzọ. Ha adịghị edebekwa iwu eze, ọ gaghị abara eze uru i hapụ ha ka ha nọdụrụ onwe ha. 9Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, ya nye iwu ka a laa ha nʼiyi, aga m akwụnye puku talenti ọlaọcha iri nʼaka ndị nlekọta nʼihi ụlọakụ eze.”

10Ya mere, eze gbapụtara ọlaaka ikike ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Agag, onye iro ndị Juu 11Eze gwara Heman, “Enyela m gị ọlaọcha ahụ, ya na ndị a. Mee ha dịka o si dị gị mma.”

12Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa mbụ, a kpọkọrọ ndị ode akwụkwọ eze niile. Ha depụtara nʼakwụkwọ isi obodo dị iche iche, nakwa nʼasụsụ ndị ọbụla, ihe niile Heman nyere nʼiwu nye ndị nnọchị anya eze niile, ndị ọchịchị nke ala niile ha na-achị, na ndịisi nke ndị ọbụla nọ nʼime alaeze a. E ji aha Ahasuerọs dee akwụkwọ ndị ahụ, werekwa mgbaaka eze nʼonwe ya kaa ya akara. 13E zipụrụ ndị ọgba ọsọ ozi eze ka ha gaa nʼisi obodo ọbụla nʼalaeze ahụ, na-enye iwu a edere nʼakwụkwọ ka a laa nʼiyi, gbuo, ma kpochapụkwa ndị Juu niile, ma nwantakịrị ma okenye, ma nwanyị, ma ụmụntakịrị, nʼotu ụbọchị, nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada, nakwa ịpụnara ha akụnụba ha nʼike. 14Ihe ndepụta nke otu akwụkwọ ahụ bụ nke a ga-enye dịka iwu nʼobodo niile ọbụla site na nkwupụta, mee ka ndị mba niile mara maka ya, nọọkwa na njikere nʼihi ụbọchị ahụ.

15Ọ bụ ndị ozi eze na-agba ọsọ nke ọma ka e nyere ozi ahụ, ka ha jiri ya jee nʼobodo niile. E mekwara ka iwu ahụ baa mmadụ niile bi na Susa ntị. Emesịa, eze na Heman nọdụrụ ala ịṅụ ihe ọṅụṅụ nʼoge ndị niile bi na Susa nọ nʼegwu nʼihi okwu ibibi ndị Juu ahụ.

Did you know?

Haman's Plot Against the Jews

  • Haman is designated as an Agagite, a description associated with the royal title of the Amalekites, traditional enemies of the Jewish people. As King Ahasuerus's newly elevated prime minister, he demanded homage that Mordecai refused to give.Sources: Haman · the Bible text itself
  • In the first month, Nisan, Haman cast the Pur (the lot) to determine the most auspicious date to carry out his plan of destruction. The lot fell on the thirteenth day of the twelfth month, Adar, placing the execution of the edict nearly a year in the future.Sources: the Bible text itself
  • The Persian imperial administration enabled royal decrees issued in the citadel of Susa to be translated into the distinct script and language of each province and rapidly distributed across the realm by couriers.Sources: the Bible text itself · Susa

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Susa · Today: Shush · 32.189, 48.258 · verse 15

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.