Nations Bible

Ecclesiastes 9

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Ihe na-eche mmadụ niile

1Ihe ndị a niile ka m tulere nke ọma nʼobi m, kpebie na ihe ndị ezi omume na ndị maara ihe na-eme dị nʼaka Chineke, ma ọ dịghị onye maara ihe na-echere ha maọbụ ịhụnanya maọbụ ịkpọ asị. 2Ihe niile na-adakwasị mmadụ niile nʼotu ụzọ ahụ, ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, ezi mmadụ na onye na-abụghị ezi mmadụ, onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha, onye na-achụ aja na onye na-adịghị achụ aja.

Dịka ọ dịrị ezi mmadụ,

otu a ka ọ dịrị onye mmehie;

dịka ọ dịrị ndị na-aṅụ iyi,

otu a kwa ka ọ dị nye ndị na-adịghị aṅụ.

3Nke a bụkwa ihe ọjọọ na-eme nʼokpuru anyanwụ. Otu ihe ndakwasị dịrị mmadụ niile. Ọzọkwa, obi ụmụ mmadụ jupụtara nʼihe ọjọọ na ịyị ara mgbe ha nọ na ndụ, emesịa ha alakwuru ndị nwụrụ anwụ. 4Naanị ndị dị ndụ nwere olileanya. Ọ ka mma ịbụ nkịta dị ndụ karịa ịbụ ọdụm nwụrụ anwụ.

5Nʼihi na ndị dị ndụ maara nke ọma na ha ga-anwụ,

ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọbụla;

ha enwekwaghị ụgwọ ọrụ ọzọ,

nʼihi na ha bụ ndị echefurula echefu.

6Ịhụnanya ha, na ịkpọ asị ha,

na ekworo ha gabigara mgbe ha nwụrụ.

Ha agaghị enwekwa oke

nʼihe ọbụla na-eme nʼokpuru anyanwụ.

7Ya mere, gaa nʼihu, jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa ọṅụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ nʼihi na ọ bụ ugbu a ka Chineke nabatara ọrụ gị. 8Yiri akwa dị ọcha mgbe niile, tee mmanụ na-esi isi ụtọ nʼisi gị. 9Bie ndụ obi ụtọ, gị na nwunye gị ị hụrụ nʼanya, ụbọchị niile nke ndụ ihe efu gị nke Chineke nyere gị nʼokpuru anyanwụ, nʼihi na nke a bụ oke dịịrị gị na ndụ ndọgbu onwe gị nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ. 10Ihe ọbụla ị na-eme, were ike gị niile mee ya, nʼihi na ịrụ ọrụ maọbụ iche echiche, maọbụ ihe ọmụma, maọbụ amamihe adịghị nʼala ndị nwụrụ anwụ. Ebe ahụ kwa ka ị na-aga.

11Ahụrụ ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ,

ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-agbata ihe,

ọ bụkwaghị onye sikarịrị ike na-emeri nʼagha;

ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịrị,

ọ bụghị ndị nwere nghọta ka akụnụba dịrị,

ọzọkwa, ọ bụghị ndị nka ka amara na-adịrị;

kama ọ bụ mgbe na ihe ndaba na-eme ka ihe ndị a dịrị.

12Nke ka nke, ọ dịghị mmadụ ọbụla maara mgbe oge ya ga-eru:

Ọ dị ka nnụnụ nke mara nʼọnya,

maọbụ azụ e jidere nʼụgbụ.

Dịka ha, ụmụ mmadụ na-adaba nʼọnya nke ihe ọjọọ

mgbe ha na-atụghị anya ya.

Amamihe dị mkpa karịa nzuzu

13Ahụkwara m ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, nke a bụ ụdị amamihe nke metụrụ m nʼobi nʼebe ọ dị ukwuu. 14Ọ dị obodo nke naanị mmadụ ole na ole bi nʼime ya, ma otu eze dị ike chịịrị ndị agha ya bịa ibuso obodo nta a agha. Ndị agha ya gbara obodo a gburugburu na-achọ ịkwatu mgbidi ya. 15Ma ọ dị otu onye ogbenye bi nʼobodo nta ahụ, onye maara ihe, ọ zọpụtara obodo ahụ site nʼamamihe ya. Ma o nweghị onye chetara ihe banyere ya. 16Nke a mere m ji sị, inwe amamihe bara uru karịa ịdị ike, ma ọ bụrụ na onye amamihe ahụ bụ onye ogbenye, a ga-eleda ya anya, a gaghị akpọkwa okwu ya ihe.

17Okwu nke onye maara ihe na-ekwu na nwayọọ ka a na-anụ,

karịa iti mkpu nke onye na-achị achị nʼetiti ndị nzuzu.

18Amamihe ka ihe agha niile mma,

ma otu onye mmehie na-ala ọtụtụ ezi ihe nʼiyi.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

A Common Destiny and the Value of Life

  • The author counsels celebrating everyday life through customary ancient expressions of joy and honor: eating bread, drinking wine, wearing white garments, and anointing the head with oil.Sources: the Bible text itself
  • The passage refers to Sheol as the realm of the dead, describing it as a state where work, planning, knowledge, and wisdom cease, which underscores the urgency to live actively while alive.Sources: the Bible text itself
  • Ancient siege warfare is illustrated through the account of a mighty king building large siege ramps against a small city, only for a poor wise man to deliver it through wisdom rather than military force.Sources: the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.