Deuteronomy 26
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Onyinye mkpụrụ mbụ na otu ụzọ nʼụzọ iri
1Mgbe ị ga-aba nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa, mgbe ị nwetara ya, birikwa nʼime ya, 2ị ga-ewere ụfọdụ nʼime mkpụrụ niile si nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, tinye ya nʼime nkata, were ya gaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, dịka ebe a kpọkwasịrị aha ya. 3Ị ga-agwakwa onye nchụaja nọ nʼọrụ nʼoge ahụ okwu sị: “Ana m ekwupụta taa nye Onyenwe anyị Chineke gị na abịala m nʼala ahụ Onyenwe anyị ṅụụrụ nna nna anyị ha nʼiyi inye anyị.” 4Onye nchụaja ahụ ga-anara nkata ahụ, dọba ya nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị. 5Mgbe ahụ, ị ga-ekwupụta nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị sị, “Nna nna m bụ onye Aram na-awagharị awagharị, onye jere Ijipt izere ndụ. Ha dị ole na ole mgbe ha gara Ijipt, ma nʼIjipt ha ghọrọ mba dị ukwuu, ndị dị ike, na ndị bara ụba nʼọnụọgụgụ. 6Ma ndị Ijipt mejọrọ anyị, mee ka anyị taa ahụhụ nʼihi ọrụ dị ike nke ha bokwasịrị anyị. 7Mgbe ahụ, anyị tikuru Onyenwe anyị Chineke nna nna anyị. Onyenwe anyị nụrụ olu anyị, hụkwa mmegbu a na-emegbu anyị, na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ, na ọnọdụ ọjọọ anyị. 8Onyenwe anyị ji aka dị ike na ogwe aka o setịrị eseti, nʼọtụtụ ihe oke egwu na ọrụ ịrịbama, na ihe ebube, si nʼIjipt kpọpụta anyị. 9Ọ kpọbatara anyị nʼebe a, nye anyị ala a, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. 10Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị, lee, ewebatala m mkpụrụ mbụ sitere nʼala i nyere m.” Dọba nkata ahụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, kpọọkwa isiala nye ya nʼebe ahụ. 11Mgbe ahụ, gị na ndị Livayị, na ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, ga-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọma niile Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị na ezinaụlọ gị.
12Nʼafọ nke atọ ọbụla, ị ga-enye onyinye pụrụ iche, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri, nke ihe ubi gị. Nʼafọ ahụ, ị ga-enye ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri gị, ka ha rie ya nʼobodo gị dị iche iche, ka afọ jukwa ha. 13Ị ga-ekwupụta nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị sị, “Esitela m nʼụlọ wepụ oke ahụ dị nsọ, nye ha ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, dịka i nyere m nʼiwu, enupughị m isi maọbụ chefuo iwu gị ọbụla. 14Erighị m ihe ọbụla si nʼime ya mgbe m na-eru ụjụ maọbụ wepụ ihe ọbụla nʼime ya nʼọnọdụ adịghị ọcha m, ọ dịkwaghị nke m ji chụọrọ ndị nwụrụ anwụ aja. Egeela m ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke m, meekwa ihe niile i nyere m nʼiwu. 15Site nʼebe obibi nsọ gị dị nʼeluigwe ledata anya gị, gọzie ndị gị Izrel na ala a i nyere anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, dịka i kwere nna nna anyị ha na nkwa.”
Ịgbaso iwu Onyenwe anyị
16Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị iwu taa si gị gbaso ụkpụrụ ndị a na iwu ndị a. Lezie anya hụ na i ji obi gị niile na mkpụrụobi gị niile debe ha. 17I kwupụtala taa na Onyenwe anyị bụ Chineke gị, i kweekwala nkwa na ị ga-ege ya ntị, debe iwu ya niile, na ụkpụrụ ya niile, na ị ga-emekwa ihe niile ọ sị gị mee. 18Taa kwa, Onyenwe anyị ekwupụtala na unu bụ ndị nke aka ya, dịka o kwere na nkwa, na ị ga-edebekwa ihe niile o nyere nʼiwu. 19O kwuru na ọ ga-emekwa ka i karịa mba niile o kere elu, nʼotuto, nʼaha, nsọpụrụ na ịja mma. Na unu ga-abụkwa mba dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke unu, dịka o kwere na nkwa.
Did you know?
Firstfruits, Tithes, and Covenant Dedication
- When presenting the firstfruits of their harvest at the designated sanctuary, Israelites were instructed to recite a historical creed. This confession recalled their ancestor as a wandering Aramean, their growth and enslavement in Egypt, and their deliverance by God into a fertile land.Sources: the Bible text itself
- The third year was designated as a special year of tithing, in which the produce was set aside specifically to support vulnerable members of the community, including Levites, resident foreigners, orphans, and widows.Sources: the Bible text itself
- The chapter concludes with a mutual covenant declaration: the people publicly committed to obey God's statutes, while God affirmed them as His treasured possession and a holy people set apart above the nations.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org