Acts 26
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Pọl agọrọ onwe ya nʼihu Agripa
1Agripa gwara Pọl, “Ị nwere ike i kwuru ọnụ gị.”
Mgbe ahụ, Pọl gbasara aka ya abụọ bido ikwu okwu ịgọrọ onwe ya, 2“Ana m agụ onwe m dịka onye nwere ihuọma, eze Agripa, inwe ohere ọma dị otu a, ịzara ọnụ m nʼihu gị nʼihe niile metụtara ebubo ndị Juu na-ebo m. 3Nke ka nke, amatara m na omenaala ndị Juu na ịrụ ụka metụtara iwu ha doro gị anya. Biko ana m arịọ gị ka i jiri ndidi gee m ntị.
4“Ndị Juu niile maara ibi ndụ m site na nwata m. Ha makwa site na mbụ, otu m si bie ndụ m niile nʼobodo nke m, nakwa nʼime Jerusalem. 5Ha matara kemgbe ogologo oge, ha ga-agbakwa ama, ma ọ bụrụ na ha chọrọ ikwu eziokwu, na site na mbụ e biri m ndụ dịka otu onye so nʼime otu ahụ nke iwu ya dị ike karịchasịa nʼime okpukpe ndị Juu, nke bụ otu ndị Farisii. 6Ma ugbu a, a na-ekpe m ikpe nʼihi na enwere m olileanya na nkwa ahụ Chineke kwere nna nna anyị ochie ha. 7Nkwa nke ebo iri na abụọ niile na-ele anya ịnata mgbe ha na-efe ofufe ehihie na abalị. Eze Agripa, ọ bụ nʼihi olileanya a, gị onye a na-asọpụrụ, ka ndị Juu ji na-ebo m ebubo. 8Gịnị mere unu jiri na-eche na ọ rara Chineke ahụ ime ka ndị nwụrụ anwụ site nʼọnwụ bilie?
9“Na mbụ, anara m eche na apụrụ m imeso aha Jisọs onye Nazaret mmeso ọjọọ niile. 10Otu a ka m mere na Jerusalem. Ọ bụghị naanị na m natara ikike nʼaka ndịisi nchụaja jiri ya kpọchie ọtụtụ ndị nsọ nʼụlọ mkpọrọ, ewelikwara m aka elu nʼoge a na-ama ha ikpe ọnwụ. 11Ọtụtụ mgbe ka m hụrụ na a tara ha ahụhụ nʼụlọ nzukọ niile. Agbalịrị m ịkwagide ha ka ha kwuo arụ ma kwutọkwa okwukwe ha. Nʼihi na iwe m dị ọkụ megide ha, esogburu m ha nʼobodo dị iche iche nke na-abụghị obodo ndị Juu.
Pọl ekwuo maka nchegharị ya
12“Nʼihi nke a, a gara m Damaskọs site nʼikike na nkwenye nke ndịisi nchụaja. Anatakwara m ike nʼaka ndịisi nchụaja. 13Nʼoge ehihie, eze Agripa, mgbe mụ na ndị otu m na-aga nʼụzọ, gị onye a na-asọpụrụ, ka m hụrụ ìhè nke na-acha karịa anyanwụ ka o si nʼeluigwe chaa m na ndị mụ na ha so gburugburu. 14Anyị niile dara nʼala. Ma anụrụ m olu gwara m okwu nʼasụsụ Hibru, ‘Sọl! Sọl! Gịnị mere i ji na-akpagbu m? Ị na-emerụ onwe gị ahụ site nʼịkpọ ụkwụ na ndụdụ e ji achị ehi.’
15“Asịrị m, ‘Ị bụ onye, Onyenwe anyị?’
“Onyenwe anyị kwuru, ‘Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu. 16Ugbu a, bilie, kwụrụ ọtọ! Nʼihi na-emere m ka ị hụ m anya, ka m họpụta gị ka ị bụrụ onyeozi m na onye akaebe m. Ị ga-emekwa ka ụwa niile mara ihe banyere nzute a i zutere m taa, na ọtụtụ mgbe ọzọ m ga-ezute gị. 17Aga m azọpụta gị site nʼaka ndị nke gị na sitekwa nʼaka ndị mba ọzọ, ndị m na-eziga gị ka i jekwuru. 18Imeghe anya ha mee ka ha si nʼọchịchịrị lọghachi banye nʼìhè, sikwa nʼike nke ekwensu lọghachikwute Chineke. Ka ha site nʼokwukwe ha nwere nʼebe m nọ nata mgbaghara mmehie ha, ketakwa oke ahụ dị ngọzị nʼetiti ndị e doro nsọ.’
19“Ya mere, eze Agripa, enupughị m isi nʼọhụ nke eluigwe ahụ. 20Ebidoro m izisa oziọma a na Damaskọs. Emekwara m otu a na Jerusalem na nʼime Judịa niile na nʼetiti ndị mba ọzọ. Ana m ekwusa mkpa ọ dị ka mmadụ niile nwee nchegharị lọghachikwute Chineke. Ka ha gosikwa nchegharị ha site nʼezi ọrụ nke ha na-arụ. 21Ọ bụ nʼihi nke a ka ndị Juu jiri nwụchie m nʼụlọnsọ ukwu ahụ ma chọsiekwa ụzọ ike ịnapụ m ndụ m. 22Ma Chineke chebere m mee ka m bụrụ onye dị ndụ taa, ịkọrọ mmadụ niile akụkọ a, ndị ukwu na ndị nta. Ihe m na-ekwu bụkwa ihe ndị amụma na Mosis kwuru na ọ ga-emezu, 23na Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ, bụrụkwa onye mbụ ga-esi nʼọnwụ bilie, iwetara ndị Juu na ndị mba ọzọ ìhè.”
24Mgbe ọ na-agọpụ onwe ya, Festọs tiri mkpu, “Pọl, ị bụ onye isi mebiri! Oke mmụta gị emebiela gị isi.”
25Ma Pọl sịrị, “Isi emebighị m, ezigbo nna anyị Festọs. Ihe m na-ekwu nʼanya udo bụ naanị eziokwu. 26Eze nʼonwe ya makwaara ihe ndị a niile, nʼihi ya ejighị m egwu ọbụla agwa ya okwu a. Ekwenyere m na ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe ndị a merenụ nke ezonarịrị ya, nʼihi na o nweghị nke mere na nzuzo. 27Gị eze Agripa, i kwenyeghị na ndị amụma? Amaara m na i kweere.”
28Mgbe ahụ Agripa sịrị, “Pọl, ị na-achọ nʼime ntakịrị oge a ịkwagide m ka m bụrụ onye kwere na Kraịst?”
29Ma Pọl sịrị, “Ọ gaara atọ m ụtọ ma ọ bụrụ na Chineke ga-ekwe, mee ka gị na ndị niile nọ nʼebe a bụrụ ihe mụ onwe m bụ nʼime Kraịst ma ewezuga agbụ ndị a.”
30Mgbe ahụ eze biliri ọtọ, ya na Festọs na Benaisi nwunye ya na ndị ọzọ niile ya na ha nọ nʼoche. 31Mgbe ha na-apụ, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Nwoke a emeghị ihe ọbụla kwesiri ọnwụ maọbụ ịga mkpọrọ.”
32Agripa gwara Festọs, “A gaara a hapụ nwoke a ma ọ bụrụ na o nyefeghị Siza ikpe ya.”

Did you know?
Paul's Defense before King Agrippa
- Easton's Bible Dictionary (1897) identifies the Agrippa of this hearing as Agrippa II, born in Rome in A.D. 27 and brother of Bernice and Drusilla. It records that the emperor Claudius made him superintendent of the Temple in Jerusalem in A.D. 48 and governor of Chalcis in A.D. 50, and later king over the tetrarchy of Philip and Lysanias. That background illuminates Paul's appeal to the king's familiarity with Jewish customs and controversies, and Bernice, Agrippa's sister, was present and rose with the king and the governor when the hearing ended.Sources: Agrippa · Bernice · the Bible text itself
- Festus, who had succeeded Felix as procurator of Judea, heard Paul at Caesarea in the presence of Herod Agrippa II and Bernice. He found nothing deserving death or imprisonment and would have released Paul, but Paul had appealed to Caesar, so Festus sent him to Rome.Sources: Portius Festus · the Bible text itself
- Paul tells Agrippa that about noon, on the road to Damascus, he saw a light from heaven, brighter than the sun, shining around him and his companions, and heard a voice in Hebrew calling him Saul. Damascus lies about 133 miles north of Jerusalem. Easton's Bible Dictionary (1897) says Saul was his Hebrew name and that the name Paul was probably also given to him in infancy for use in the Gentile world; he was a native of Tarsus, the capital of Cilicia, a Roman province in southeastern Asia Minor.Sources: Paul · Damascus · the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 4, 10, 20
- Nazareth · 32.702, 35.298 · verse 9
- Damascus · 33.511, 36.306 · verses 12, 20
- Judea · Today: Judea 1 · 31.777, 35.234 · verse 20
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org