2 Samuel 8
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Mmeri nʼagha nke Devid meriri
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia. Mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Meteg-Amaa site nʼọchịchị ndị Filistia.
2Devid merikwara ndị Moab. O mere ka ha dinaa nʼala. O jikwa ụdọ ọtụtụ tụa ha. Ọtụtụ abụọ ọbụla nʼime ha ka egburu. Ọtụtụ nke atọ ka a hapụrụ ka ha dịrị ndụ. Ya mere, ndị Moab ghọrọ ndị ohu Devid, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla.
3Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis. 4Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya.
5Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha. 6O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs. Ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwa ụtụ ịnata ihuọma. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
7Devid chịkọtara ọta ọlaedo ndịisi agha Hadadeza ji lụọ agha webata ha na Jerusalem. 8Site na Teba nakwa Beirotai, bụ obodo Hadadeza na-achị. Eze Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu.
9Mgbe Tou, eze Hamat, nụrụ na Devid emeriela ndị agha Hadadeza niile, 10o zipụrụ Joram, nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee Devid, nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Joram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaọcha, nke ọlaedo na nke bronz bịa.
11Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o si mee ọlaọcha na ọlaedo si na mba niile ndị ọ lụgburu. 12Mba ndị a bụ: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek. O dokwara nsọ nye Onyenwe anyị ihe ọ kwatara nʼagha site nʼaka Hadadeza nwa Rehob, bụ eze Zoba.
13Devid meere onwe ya aha, mgbe o si nʼitigbu puku ndị ikom Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu lọghachite.
14O wuru ogige ndị agha nʼala Edọm niile, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
Ndị na-ejere Devid ozi
15Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. O mesokwaghị onye ọbụla mmeso ọjọọ. 16Onyeisi ndị agha ya bụ Joab nwa Zeruaya; ode akwụkwọ obodo bụ Jehoshafat, nwa Ahilud. 17Zadọk nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja; Seraya bụ ode akwụkwọ eze. 18Benaya, nwa Jehoiada, bụ onyeisi ndị Keret na Pelet. Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndị nchụaja.

Did you know?
David's Conquests and Administration
- The phrase Metheg-ammah in 2 Samuel 8:1 literally means "the bridle of the mother city," a figurative expression for conquering a regional capital, which the parallel passage in 1 Chronicles 18:1 identifies as Gath.Sources: Metheg-ammah · the Bible text itself
- Hadadezer of Zobah ruled an Aramean kingdom that reached toward the Euphrates River. David's victory over him secured northern territories around Damascus and prompted King Toi of Hamath, a rival of Hadadezer, to send his son Joram with gifts of gold, silver, and bronze.Sources: Zobah · Toi · Joram · the Bible text itself
- The chapter outlines David's organized central government, naming Joab as army commander, Jehoshaphat as recorder, Zadok and Ahimelech as priests, Seraiah as scribe, and Benaiah over the Cherethites and Pelethites.Sources: Joab · the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Moab · Today: Moab 1 · 31.181, 35.701 · verses 2, 12
- Euphrates · Today: Euphrates River · 31.004, 47.442 · verse 3
- Zobah · 33.935, 36.151 · verses 3, 5, 12
- Damascus · 33.511, 36.306 · verses 5, 6
- Syria · Today: Aram · 33.511, 36.306 · verse 5
- Aram · 33.511, 36.306 · verse 6
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · verse 7
- Hamath · Today: Hama · 35.136, 36.750 · verse 9
- Amalek · 30.648, 34.422 · verse 12
- Ammon · 31.955, 35.934 · verse 12
- Edom · 30.746, 35.604 · verses 12, 13, 14
- Philistia · 31.664, 34.546 · verse 12
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org