Nations Bible

2 Kings 25

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

1Nʼafọ nke itoolu nke ọchịchị ya, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, Nebukadneza, eze Babilọn duuru ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha. Ọ mara ụlọ ikwu nʼazụ obodo ahụ, wukwaa mgbidi nnọchibido gburugburu obodo ahụ. 2Anọchibidoro obodo a nʼagha ruo nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị eze Zedekaya.

3Nʼụbọchị nke itoolu nke ọnwa anọ nʼafọ ahụ, oke ụnwụ siri ike dị nʼobodo ahụ ruo na ọ dịkwaghị nri dị nke ndị mmadụ ga-eri. 4Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Kaldịa nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba. 5Ma ndị agha Kaldịa chụsoro eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya, 6e jide ya.

Ha kpụgara ya eze Babilọn, nʼobodo Ribla, ebe a nọ maa ya ikpe. 7Ha gburu ụmụ ndị ikom Zedekaya nʼihu ya. Ha ghụpụrụ anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya gaa Babilọn.

8Nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke ise nke afọ iri na itoolu nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche, onyeisi nʼọrụ eze Babilọn, bịarutere Jerusalem. 9O sunyere ụlọnsọ Onyenwe anyị ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ 10Ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze kwaturu mgbidi niile gbara Jerusalem gburugburu. 11Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, buuru ụfọdụ mmadụ ndị fọdụrụ nʼobodo, na ndị niile fọdụkwara, ha na ndị ọzọ ahụ ji aka ha gbakwuru eze bulaa ha Babilọn, ka ha ga biri nʼala ọzọ. 12Ma ọchịagha ahụ, hapụrụ ụfọdụ na ndị ahụ bụ nnọọ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ka ha na-elekọta ubi vaịnị niile a gbara ogige na ala ubi niile.

13Ma ndị Babilọn tipịara ogidi bronz niile, ha na ihe ndọkwasị niile na oke osimiri bronz ndị ahụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, buru bronz ndị ahụ bulaa Babilọn. 14Ha chịkọọrọ ite niile, na shọvel niile, na ihe ịkpakepụ ọkụ, na ngaji ukwu niile na ngwa bronz niile nke e ji eje ozi nʼime ụlọnsọ ahụ. 15Ọchịagha ndị nche eze, chịrị ihe ịgụnye ọkụ niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ya bụ ihe ndị ahụ niile e ji ọlaedo a nụchara anụcha maọbụ ọlaọcha kpụọ.

16O bukwara bronz sitere nʼogidi abụọ ahụ, oke Osimiri ahụ na ihe ndọkwasị ya niile, nke eze bụ Solomọn mere nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha karịrị ihe a ga-eji ihe ọtụtụ tụọ. 17Ị dị elu nke otu nʼime ogidi abụọ ndị a bụ mita asatọ na ụma nʼọtụtụ. Isi bronz nke e kpukwasịrị nʼotu ogidi dị otu mita na ọkara nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya.

18Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata. 19O sitere nʼetiti ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo kpụụrụ otu onyeisi na-ahụ maka ndị agha, na ndị ikom ise na-enye eze ndụmọdụ. O kpukwaara ode akwụkwọ, onye isi ọrụ na-ahụ maka ịmanye ndị ga-aga agha, jidekwa iri ndị ikom isii ndị ọrụ mmanye, ndị a hụrụ nʼime obodo ahụ. 20Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla. 21Nʼebe ahụ, na Ribla dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile.

Ya mere, a dọọrọ Juda nʼagha, mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ.

22Emesịa, Nebukadneza eze Babilọn họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa nwa Shefan, ka ọ bụrụ onye na-elekọta ndị fọdụrụ na Juda, 23Mgbe ndịisi agha na ndị ikom ha nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya onye na-achị ala ahụ, ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ, Ishmel nwa Netanaya, Johanan nwa Kariya, Seraya nwa Tanhumet, onye Netofa, na Jaazanaya nwa onye Maaka, na ndị ikom ha. 24Gedaliya ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha, sị, “Unu atụla egwu nʼihi ndịisi ọrụ Babilọn. Birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma.”

25Ma nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye ya onwe ya si nʼagbụrụ eze, duuru mmadụ iri bịa Mizpa, tigbuo Gedaliya, na ndị ikom Juda na ndị Kaldịa niile, bụ ndị ya na ha nọ. 26Nke a mere ka ndị Juda niile, site nʼonye nta ruo nʼonye ukwu, ha na ndịisi agha ndị ahụ biliri gaa Ijipt, nʼihi na ha tụrụ ndị Kaldịa egwu.

Jehoiakin enwere onwe ya

27Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn, o mere ka Jehoiakin si nʼụlọ mkpọrọ pụta nwere onwe ya. Ọ bụ nʼụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa iri na abụọ ka o mere nke a. 28Ọ gwara ya okwu ọma, nye ya oche ọnọdụ ya dị elu karịa nke ndị eze ndị ọzọ ya na ha nọ na Babilọn. 29Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri. 30Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Fall of Jerusalem and the Exile

  • King Nebuchadnezzar directed the campaign against Jerusalem from his headquarters at Riblah, situated in the land of Hamath on the Orontes River. After being captured on the plains of Jericho, King Zedekiah was brought to Riblah, where his sons were slaughtered before him and he was blinded before being carried in bronze shackles to Babylon.Sources: Riblah · Zedekiah · the Bible text itself
  • When Nebuzaradan, captain of the guard, burned Jerusalem, the Babylonians broke up the monumental bronze pillars, the movable stands, and the large bronze Sea that King Solomon had made for the temple, carrying the metal off to Babylon.Sources: Nebuzar-adan · Solomon · the Bible text itself
  • Following the city's destruction, Nebuchadnezzar appointed Gedaliah son of Ahikam as governor over the remaining population at Mizpah. However, Ishmael son of Nethaniah, a member of the royal family, assassinated Gedaliah, causing the terrified remnant to flee to Egypt.Sources: Gedaliah · Ishmael · Mizpah · the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Babylon · 32.543, 44.422 · verses 1, 6, 7, 8, 11, 13, 20, 21, 22, 23, 24, 27, 28, 29
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 1, 2, 8, 9, 10
  • Arabah · 30.417, 35.151 · verses 4, 5
  • Chaldea · 30.962, 46.104 · verses 4, 5, 10, 13, 25, 26
  • Jericho · Today: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · verse 5
  • Riblah · Today: Rableh · 34.460, 36.573 · verses 6, 20, 21
  • Hamath · Today: Hama · 35.136, 36.750 · verse 21
  • Egypt · 30.129, 31.308 · verse 26

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.