Nations Bible

2 Kings 16

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

Ehaz eze Juda

1Ehaz nwa Jotam, malitere ịbụ eze Juda nʼafọ nke iri na asaa nke ọchịchị eze Peka nwa Remalaya eze Izrel. 2Ehaz gbara iri afọ abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Afọ iri na isii ka ọ chịkwara nʼime Jerusalem, ma o meghị ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke ya, dịka nna ya Devid mere. 3Ọ gbasoro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, ọbụladị i ji nwa ya nwoke chụọ aja nʼọkụ. Ọ gbasoro omenaala niile rụrụ arụ nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼihu ndị Izrel. 4Ọ chụrụ aja surekwaa ihe nsure ọkụ aja na-esi isi ụtọ nʼebe niile dị elu, nʼelu ugwu niile, na nʼokpuru osisi ndụ ọbụla.

5Mgbe ahụ, Rezin eze Aram na Peka nwa Remalaya, eze Izrel rigooro ịga buso Jerusalem agha, gbakwaa Ehaz gburugburu. Ma ha emerighị ya nʼagha. 6Nʼoge ahụ, Rezin eze Aram dọtaghachiri obodo Elat nye onwe ya, site na ị chụpụ ndị Juda bi nʼElat. Ndị Edọm bara nʼobodo Elat, ha bikwa nʼebe ahụ ruo taa.

7Ehaz zigara ndị ozi ka ha gaa zie Tiglat-Pilesa, eze ndị Asịrịa ozi, sị ya, “Abụ m ohu gị, onyenwe m ka ị bụ. Bịa napụta m site nʼaka eze ndị Aram na eze ndị Izrel, ndị na-ebuso m agha.” 8Ehaz weere ọlaedo na ọlaọcha ahụtara nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na nke dị nʼakụ niile dị nʼụlọeze zigara eze Asịrịa dịka onyinye. 9Eze ndị Asịrịa ṅara ya ntị site nʼibuso obodo Damaskọs agha na imeri ya. O gburu Rezin, bulaa mmadụ niile bi nʼime ya nʼike ka ha gaa biri nʼobodo Kia.

10Mgbe eze Ehaz gara Damaskọs izute Tiglat-Pilesa bụ eze Asịrịa. Ọ hụrụ otu ebe nchụaja nke dị na Damaskọs. O zigaara Ụraya onye nchụaja oyiyi ebe ịchụ aja ahụ. O dekwara ihe gbasara ya nʼakwụkwọ, nke ga-akọwa otu e si ewu ya. 11Ya mere, Ụraya onye nchụaja, wuru ebe ịchụ aja nke dị ka nke ahụ Ehaz hụrụ na Damaskọs. O wuchara ya tupu eze alọta. 12Mgbe eze si Damaskọs lọta na Juda, ọ hụrụ ebe ịchụ aja ahụ, bịaruo ya nso, doo onyinye ịchụ aja ya nʼelu ya. 13Ọ chụrụ aja nsure ọkụ, na aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na aja onyinye mkpụrụ ọka. Ọ wụkwasịrị onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, fesakwa ọbara aja udo ya niile nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. 14O wepụrụ ebe ịchụ aja bronz nke dị nʼihu Onyenwe anyị, o sitere nʼebe ọ dị nʼihu ụlọnsọ ahụ, nʼetiti ebe ịchụ aja ọhụrụ na ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bute ya nʼakụkụ ugwu nke ebe ịchụ aja ọhụrụ ya.

15Eze Ehaz nyere Ụraya, bụ onyeisi nchụaja iwu, sị, “Ọ bụ nʼelu ebe ịchụ aja ọhụrụ a ka ị ga na-esure aja nsure ọkụ ụtụtụ niile, na onyinye mkpụrụ ọka nke uhuruchi niile, na aja nsure ọkụ eze, na onyinye mkpụrụ ọka nke eze, na aja na onyinye nke ndị niile nʼala a, ya na onyinye mkpụrụ ọka ha niile na onyinye ihe ọṅụṅụ ha niile. Fekwasị ọbara niile e ji chụọ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. Ma ebe ịchụ aja ọla ahụ ga-adịrị m iji jụta ase.” 16Ụraya onye nchụaja mere ihe niile dịka eze Ehaz nyere ya nʼiwu.

17Eze bụ Ehaz wepụrụ ihe njikọ niile jikọrọ ihe ndọkwasị ahụ niile a na-ebugharị ebugharị. O wepụrụ efere ukwu ịdọba mmiri a dọkwasịrị nʼelu ehi ọla ahụ dị nʼokpuru ya, ma dọkwasị ya nʼelu nkume. 18Nʼihi imekwa ka obi tọọ eze Asịrịa ụtọ, o wepụrụ ụzọ a na-esite maka ụbọchị izuike nke e wuru nʼime ụlọnsọ, na ụzọ mbata eze si abanye nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

19Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ehaz, na ihe ndị o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 20Ehaz soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Hezekaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

The Reign of Ahaz and the Assyrian Alliance

  • Facing a military coalition led by King Rezin of Damascus and King Pekah of Israel, King Ahaz stripped silver and gold from the temple and palace treasuries to secure the intervention of Tiglath-pileser, king of Assyria. The Assyrians responded by capturing Damascus, executing Rezin, and deporting its population to Kir.Sources: the Bible text itself · Ahaz · Rezin · Kir
  • While visiting Tiglath-pileser in Damascus, Ahaz was impressed by an altar there and sent detailed architectural plans to Uriah the priest in Jerusalem. Uriah constructed the replica in the temple courtyard before the king returned, where it took over the central sacrificial duties from the original bronze altar.Sources: the Bible text itself · Urijah · Damascus

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Places in this chapter

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · verses 2, 5
  • Syria · Today: Aram · 33.511, 36.306 · verses 5, 6, 7
  • Edom · 30.746, 35.604 · verse 6
  • Assyria · 36.359, 43.153 · verses 7, 8, 9, 10, 18
  • Damascus · 33.511, 36.306 · verses 9, 10, 11, 12
  • City of David · 31.774, 35.236 · verse 20

Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.