2 Kings 11
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Atalaya na Joash
1Mgbe Atalaya nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze. 2Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, ma bụrụkwa nwanne nwanyị Ahazaya, kuuru Joash nwa Ahazaya, zopu ya site nʼetiti ụmụ ndị ikom eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina, ka Atalaya hapụ ịhụ ya, nke a mere na-egbughị ya. 3Ya na nwanyị na-elekọta ya anya nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ.
4Nʼafọ nke asaa, Jehoiada, ziri ozi kpọọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị Karị na ndị nche oku, mee ka ha bịakwute ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ya na ha gbara ndụ, o mekwara ka ha ṅụọ iyi nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, o gosiri ha nwa eze. 5O nyere ha iwu, sị, “Nke a bụ ihe unu ga-eme, unu bụ ndị nọ nʼotu atọ ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike, nke otu ụzọ nʼime unu na-eche ụlọeze nche, 6otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Sua, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ ama, nʼazụ ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwu Chineke. 7Ma unu bụ otu abụọ ndị kwesiri ịga ezumike site nʼọrụ unu nʼụbọchị izuike, ga-eguzo na nche nʼụlọnsọ ukwu nʼihi eze. 8Doonụ onwe unu gburugburu eze, onye ọbụla nʼime unu jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla nke na-abịa nso ahịrị unu, ka e gbuo ya. Nọrọnụ eze nso ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.”
9Ndị ọchịagha ndị a na-achị narị ndị agha mere dịka Jehoiada, onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọrọ ndị ikom ya, ma ndị na-emechi ọrụ, ma ndị na-abata ịrụ ọrụ nʼụbọchị izuike, bịakwute Jehoiada, bụ onye nchụaja. 10O nyere ndị ọchịagha ahụ ùbe na ọta niile, ndị bụrịị nke eze Devid, ndị dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 11Onye ọbụla na ndị nche ahụ ji ngwa agha nʼaka ya, ha guzoro onwe ha, nọdụ eze gburugburu, na nso ebe ịchụ aja na ụlọnsọ ukwu, site nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ.
12Jehoiada kpọpụtara nwa eze, kpube ya okpueze nʼisi, o nyere ya otu akwụkwọ nke ihe ọgbụgba ndụ ahụ, chie ya eze. Ha tekwara ya mmanụ ịbụ eze. Ndị niile nọ nʼebe ahụ kụrụ aka, tie mkpu, sị, “Ka eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!”
13Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ nke ndị nche na ndị mmadụ na-eme, ọ gakwuru ndị ahụ nọ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 14O lepụrụ anya, ma lee eze, ka o guzo nʼakụkụ ogidi, dịka omenaala mmemme ịchị eze si dị. Ndịisi na ndị na-afụ opi nọ nʼakụkụ eze. Ndị niile nke ala ahụ nọkwa na-aṅụrị ọṅụ na-afụ opi. Atalaya dọwara uwe ya, sị, “Nnupu isi megide eze! Nke a bụ nnupu isi megide ọchịchị!”
15Jehoiada, bụ onye nchụaja nyere ndịisi ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, iwu sị ha, “Sitenụ nʼebe ahụ kpọpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Agaghị egbu ya nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.” 16Ya mere, ha jidere ya, mgbe o rutere nʼụzọ ebe ịnyịnya si abata nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha nọ gbuo ya.
17Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na eze, na ndị mmadụ, na ha ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị. O mekwara ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti eze na ndị ahụ. 18Ndị niile nke ala ahụ gara nʼụlọ nchụaja Baal kwatuo ya. Ha tidasịrị ebe nchụaja na arụsị niile dị nʼebe ahụ mee ka ọ darisịa, gbukwaa Matan onye nchụaja Baal nʼihu ebe ịchụ aja ahụ.
Mgbe ahụ, Jehoiada onye nchụaja, debekwara ndị nche ka ha lekọta ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 19Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ha na ndị Karị, na ndị nche, ha na ndị ala ahụ niile, ha niile dupụtara eze site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị site nʼọnụ ụzọ ndị nche banye nʼụlọeze. Eze were ọnọdụ ya nʼelu ocheeze. 20Ndị ala ahụ niile ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, obodo ahụ dakwara jụụ, nʼihi na e ji mma agha gbuo Atalaya nʼụlọeze.
21Joash gbara afọ asaa mgbe ọ malitere ịbụ eze.

Did you know?
The Overthrow of Athaliah and the Coronation of Joash
- Athaliah, the daughter of Ahab and Jezebel of Israel, seized the throne of Judah after the death of her son Ahaziah and attempted to wipe out the royal family. During her six-year rule, worship of the Phoenician deity Baal spread into Judah, maintaining its own temple, altars, and priest in Jerusalem.Sources: Athaliah · Baal · the Bible text itself
- The infant Joash survived the massacre because his aunt Jehosheba, daughter of King Jehoram and sister of Ahaziah, hid him and his nurse in the temple complex. Jehosheba is noted as the only princess of the royal house who was married to a high priest, Jehoiada.Sources: Jehoshabeath · Jehoiada · the Bible text itself
- To protect seven-year-old Joash during his public coronation, the priest Jehoiada armed the commanders of hundreds with spears and shields that had once belonged to King David and were kept inside the temple.Sources: Jehoiada · the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
- Sur · Today: in Jerusalem · 31.777, 35.234 · verse 6
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org