Nations Bible

2 Corinthians 6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.

1Dịka ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ nʼotu, anyị na-arịọ arịrịọ sị unu ahapụla ịnara amara a Chineke na-enye unu nʼefu. 2Nʼihi na ọ na-ekwu,

“Nʼoge m na-anara mmadụ nke ọma anụrụ m olu unu.

Ọ bụkwa ụbọchị nzọpụta ka m nyeere unu aka.”

Lee, ugbu a bụ oge a na-anabata mmadụ nke ọma, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.

Ahụhụ Pọl hụrụ

3Anyị etinyeghị ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ onye ọbụla ka ọ ghara iwetara ọrụ anyị ihe ịta ụta. 4Kama nʼime ihe niile, anyị na-agbalịsị ike ime ka ndị mmadụ mara na anyị bụ ndị na-ejere Chineke ozi. Anyị ji ndidi na ntachiobi na-edi nsogbu niile na mkpagbu niile na ahụhụ niile na-adakwasị anyị. 5A na-eti anyị ihe otiti ọtụtụ mgbe. E tinyekwala anyị nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe ka igwe mmadụ tikwara anyị ihe otiti. Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ. Ọtụtụ abalị anyị nọkwara nʼime ịmụ anya na-erighị nri, 6nʼime ịdị ọcha na ezi nghọta na ntachiobi nke anyị nwere, nʼinwe obiọma na ezi ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị na ya nʼime Mmụọ Nsọ, 7sitekwa nʼikwu eziokwu na site nʼike Chineke. Anyị buru ezi omume dịka ngwa agha nʼaka nri na nʼaka ekpe. 8Ụfọdụ na-asọpụrụ anyị ma ndị ọzọ na-eme anyị ihe ihere. Ụfọdụ na-ata anyị ụta, ma ụfọdụ na-eto anyị. Ụfọdụ mmadụ na-agụ anyị dị ka ndị ụgha, ma anyị nọgidesịrị ike na-ekwu eziokwu. 9Ụwa amaghị anyị, ma a maara anyị. Ọ bụ ezie na anyị na ọnwụ na-anọ nso mgbe niile, ma lee anyị ka dịkwa ndụ. A na-ata anyị ahụhụ, ma lee anyị anwụghị. 10Anyị na-anọ nʼihe mwute mgbe niile, ma lee ọṅụ juru anyị obi. Anyị bụ ndị ogbenye, ma anyị na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ọgaranya. Anyị enweghị ihe ọbụla, ma lee anyị nwere ihe niile.

11Ndị enyi anyị nọ na Kọrint, anyị agwala unu ihe niile dị anyị nʼobi, anyị emeghepụla obi anyị nye unu. 12Anyị ji obi anyị niile hụ unu nʼanya, ma unu mechiri obi unu nʼebe anyị nọ. 13Ugbu a, ana m ekwu dịka ana m agwa ụmụntakịrị. Na-emesonu anyị dịka anyị si emeso unu, meenụ ka obi unu saa mbara nʼebe anyị nọ.

Ndị Kraịst na ndị na-ekweghị ekwe

14Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọbụla. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na ajọ omume nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ? 15Ọ bụ nwekọ dị aṅaa dị na-agbata Kraịst na ekwensu? Gịnịkwa ka onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwekọrọ? 16Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọnsọ Chineke na arụsị? Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ụlọnsọ Chineke dị ndụ. Dịka Chineke kwuru,

“M ga-ebi nʼime ha.

Jegharịakwa nʼime ha.

M ga-abụkwa Chineke ha,

ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.”

17Ya mere,

“Sinụ nʼetiti ha pụta.

Nọpụkwanụ iche nʼebe ha nọ.

Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka.

Mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.”

18Ma,

“Aga m abụrụ unu Nna,

unu onwe unu ga-abụkwara m ụmụ m ndị ikom na ndị inyom.

Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.”

Artistic illustration — an interpretation, not a historical record.

Did you know?

Open Hearts in the Day of Salvation

  • The chapter urges its hearers not to receive God’s grace in vain. It quotes God as saying that he heard them in a time of favor and helped them in a day of salvation, then applies those words at once: now is the time of favor, and now is the day of salvation.Sources: the Bible text itself
  • The speakers commend themselves as servants of God through great endurance in troubles, hardships, and calamities, in beatings, imprisonments, and riots, and in labor, sleepless nights, and hunger, as well as in purity, knowledge, patience, kindness, the Holy Spirit, and sincere love. They also speak of weapons of righteousness in the right hand and in the left, and of sharp contrasts: dying, yet living on; punished, yet not killed; poor, yet making many rich; having nothing, yet possessing everything.Sources: the Bible text itself
  • They speak freely to the Corinthians, saying that their own hearts are open wide while the Corinthians’ affection is restrained, and, as a fair exchange, they ask them, as children, to open their hearts also. They warn them not to be unequally yoked with unbelievers, contrasting righteousness with wickedness, light with darkness, Christ with Belial, a believer with an unbeliever, and the temple of God with idols. The chapter says that we are the temple of the living God, and it includes the Lord’s call to come out from among them, be separate, and touch no unclean thing.Sources: the Bible text itself

Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.

Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Talk to us

Tell us where you read from, how the Bible has helped you, or what we could improve. We read every message.