2 Corinthians 2
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
1Ekpebiri m nʼime obi m na-agaghị m abịakwute unu ọzọ, iwetara unu ihe mwute. 2Nʼihi na ọ bụrụ na m eme ka obi jọọ unu njọ, onye kwanụ ga-akasị m obi ma ọ bụghị unu, unu onwe unu ndị m mere ka obi jọọ njọ? 3E deere unu akwụkwọ a dịka m kwesiri ime ka m ghara inwe mwute mgbe m bịara, site nʼaka ndị kwesiri ime ka obi dị m mma, nʼihi na o doro m anya na ọṅụ m ga-abụ ọṅụ nke unu niile. 4Eji m anya mmiri dị ukwuu na oke obi mgbu na obi mgbawa deere unu akwụkwọ, ọ bụghị ka m kpasuo unu iwe kama ka unu nwee ike ịmata oke ịhụnanya m nwere nʼebe unu nọ.
Mgbaghara dịrị onye mmehie
5Ọ bụrụ na onye ọbụla mere ihe butere obi mgbu, ka a hapụ ikwu ya karịa ka o kwesiri, ọ bụghị naanị m ka o wetaara obi mgbu, o wetakwaara unu niile obi mgbu. 6Nʼihi na ntaramahụhụ unu niile kpebiri nye ya ezuola. 7Ugbu a, bikonu ụmụnna m, o kwesiri ka unu gbaghara ya, ma kasịe ya obi, ka ọ hapụ inwe obi ilu maọbụ daa mba na mmụọ ya, rubiga ụjụ oke. 8Ya mere ana m arịọ unu, bikonu, gosinụ ya na unu hụrụ ya nnọọ nʼanya. 9Ihe mere m ji dee ihe m dere nʼakwụkwọ nke mbụ bụ ka m chọpụta ma unu jikekwara mgbe niile irube isi nʼihe niile. 10Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ahụ mụ onwe m kwa agbagharala ya. Mgbaghara m, a sịkwa na o nwere ihe m na-agbaghara, ana m eme ya nʼihi unu nʼihu Kraịst. 11Anyị na-eme nke a ka Ekwensu ghara ịghọgbu anyị. Anyị maara ihe niile ọ na-ezube.
Ndị ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ
12Mgbe m bịarutere Troas ikwusa oziọma Kraịst, e megheere m ụzọ nʼime Onyenwe anyị. 13Ma enweghị m izuike nʼime obi m, nʼihi na ahụghị m Taịtọs ezi nwanna m nʼebe ahụ. Nke a mere m jiri kelee ha hapụ ha gawa Masidonia.
Mmeri na-adị site na Kraịst
14Ma ekele dịrị Chineke, onye na-edugharị anyị na-enye anyị mmeri, nʼihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst, onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọbụla nụrụ isisi ụtọ nke oziọma ya. 15Nʼihi na anyị bụ mmanụ isi ụtọ nke Kraịst nye Chineke, nʼetiti ndị ọ na-azọpụta na nʼetiti ndị na-ala nʼiyi. 16Nʼetiti ndị ahụ na-ala nʼiyi, isisi ụtọ a bụ ihe na-ewetara ha ọnwụ, ma nʼetiti ndị ahụ a na-azọpụta, ọ bụ isisi ụtọ a na-ewetara ha ndụ. Onye zuru ime ihe ndị a? 17Nʼihi na anyị adịghị ka ọtụtụ mmadụ ndị na-eji okwu Chineke azụ ahịa. Kama, nʼime Kraịst anyị na-ekwu okwu anyị site nʼobi dị ọcha, dịka ndị ahụ Chineke zipụrụ ịrụ ọrụ a.

Did you know?
Tears, Forgiveness, and the Journey through Troas
- Paul writes that he went to Troas to preach the gospel of Christ and that a door stood open for him in the Lord, yet he had no peace in his spirit because he did not find Titus there, so he said goodbye and went on to Macedonia. Troas was a city on the coast of Mysia, in the northwest of Asia Minor, named after ancient Troy, which lay about four miles to the north. In New Testament times Macedonia was a Roman province lying north of Greece.Sources: the Bible text itself · Troas · Macedonia
- Titus, whom Paul calls his brother, is the companion he did not find at Troas. He appears to have been a Gentile and was chiefly engaged in ministering to Gentiles. Paul sent him from Ephesus, where he was with Paul and Timothy, to Corinth to forward the church's contribution for the poor in Jerusalem.Sources: the Bible text itself · Titus
- Paul urges them to forgive and comfort the person who caused grief, so that he will not be overwhelmed by excessive sorrow, and so that Satan will not outwit them, since they are not unaware of his schemes. Satan means adversary or accuser. In the New Testament the name is used interchangeably with the devil, and it is so used more than thirty times.Sources: the Bible text itself · Satan
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Places in this chapter
Only places identified with high confidence are shown (90% or more according to the scholarly sources compiled by OpenBible). Period map: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; modern map: © OpenStreetMap contributors; places: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org