2 Corinthians 13
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Tap a verse to see its cross-references.
Ịdọ aka na ntị ikpeazụ
1Nke a ga-eme ya ugboro atọ m na-abịa ileta unu. Ọ bụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara ka a ga-eme ka okwu niile guzoro. 2Mgbe m bịara leta unu nke ugboro abụọ, abaara m ndị niile dara iwu nʼoge gara aga na mmadụ ndị ọzọ mba, dọọkwa ha aka na ntị, ihu na ihu. Ugbu a m na-anọghị ya, ana m adọkwa ha aka na ntị ọzọ, ọ bụrụ na m bịa ọzọ hụ na ndị mehiere na mbụ echegharịghị, aga m emesi ha ike. 3Ebe unu chọrọ ka e gosi na Kraịst na-ekwu okwu nʼime m, ọ dịghị egosi adịghị ike mgbe ọ na-emeso unu omume, kama ọ na-eme ka ike ya pụta ìhè nʼebe unu nọ. 4Ọ bụ ezie na a kpọgidere ya na-adịghị ike, ma ugbu a, ọ na-adị ndụ site nʼike dị ukwuu nke Chineke. Anyị bụkwa ndị na-adịghị ike nʼime ya, ma ozi anyị na-ejere unu na mmekọrịta anyị na unu, anyị ga-eso ya dị ndụ site nʼike nke Chineke.
5Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu nyochaa onwe ya, tulekwa omume ya, mara ma ọ ka kwudosiri ike nʼokwukwe ya. Ọ bụ na unu aghọtaghị na Jisọs Kraịst nọ nʼime unu? Ma ọ bụghị na unu enyochaala onwe unu hụ na unu emeghị nke ọma. 6Enwere m olileanya na unu niile ga-achọpụta na anyị adaghị ule ahụ. 7Ma anyị na-arịọ Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọọ ọbụla. Anyị anaghị eme nke a iji gosi na anyị kwesiri ekwesi, kama ka unu nwee ike mee ihe dị mma, nʼagbanyeghị na ọ ga-adị ka a ga-asị na anyị emeghị nke ọma nʼọrụ anyị. 8Nʼihi na anyị apụghị ime ihe ọbụla megide eziokwu, kama anyị na-eme ihe niile nʼihi eziokwu. 9Anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe anyị na-adịghị ike ma hụ na unu dị ike. Ihe anyị na-arịọ Chineke bụ ka unu tozuo oke. 10Ana m edere unu akwụkwọ a ugbu a, nʼihi na-achọghị m ịbara unu mba na inye unu ntaramahụhụ mgbe m bịara. Achọkwaghị m iji ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nye unu ntaramahụhụ, kama achọrọ m iji ya wulie unu elu dịka ụlọ.
Ekele mmechi
11Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu.
12Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu.
13Ndị nsọ niile na-ekelekwa unu.
14Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya Chineke, na mmekọ nke Mmụọ Nsọ dịnyere unu niile.

Did you know?
A Third Coming and a Final Appeal
- The writer says this is the third time he is coming to the readers, and that he already warned them the second time he was with them. He quotes the saying that every matter must be established by the testimony of two or three witnesses, and he warns both those who sinned earlier and everyone else that, if he returns, he will not spare anyone.Sources: the Bible text itself
- The readers are demanding proof that Christ is speaking through the writer. He contrasts weakness and power: Christ was crucified in weakness, yet lives by God’s power; though the writer and those with him are weak in Christ, he says that by God’s power they will live with him to serve the readers. He tells the readers to examine and test themselves to see whether they are in the faith, and he hopes they will realize that he and those with him have not failed the test.Sources: the Bible text itself
- He writes these things while absent so that, when he is present, he will not need to be severe in using the authority the Lord gave him—authority for building the readers up, not for tearing them down. He closes by urging them to rejoice, aim for perfect harmony, encourage one another, be of one mind, and live in peace, and he adds that the God of love and peace will be with them. He also asks them to greet one another with a holy kiss, passes on greetings from all the saints, and ends with a blessing that names the grace of the Lord Jesus Christ, the love of God, and the fellowship of the Holy Spirit.Sources: the Bible text itself
Notes written with AI assistance from open sources (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, public domain) and reviewed before publishing.
Credits and license for this translation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Source: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org